Rọshịa
Ajụjụ Ọnụ A Gbara Nwanna Andrey Stupnikov
Nwanna Andrey Stupnikov kọrọ otú ndị uwe ojii si nwụchie ya ma kpọchie ya n’abalị atọ n’ọnwa Julaị afọ 2018. Ọ nọrọ narị ụbọchị abụọ na iri anọ na otu n’ebe a kpọchiri ya, e mechaakwa machie ya isi n’ụlọ ya pụọ ruo otu narị ụbọchị na iri abụọ na anọ. E bidoro ikpe ya ikpe ka onye omekome na Jun 11, 2020.
O Nweghị Ihe Kwesịrị Ime Ka Anyị Tụọ Egwu Mkpagbu
N’oge a na-enwe nnọkọ Watchtower na-enwe kwa afọ nke afọ 2019, Nwanna Mark Sanderson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị, kwuru okwu isiokwu ya bụ “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịtụ Egwu?” N’okwu ahụ, e gosiri vidio a, bụ́ ebe ụfọdụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị kwuru otú e si kpagbuo ha na Rọshịa.
Ajụjụ Ọnụ A Gbara Nwanna Dmitriy Mikhaylov
A nwụchiri Nwanna Mikhaylov na Mee 29, 2018. Ọ nọrọ ọtụtụ ọnwa n’ụlọ mkpọrọ. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, o kwuru otú Jehova si nyere ya aka ịtachi obi, nakwa otú nwunye ya si kwado ya. O kwukwara otú izi ndị mkpọrọ ibe ya ozi ọma si mee ka obi ruo ya ala, ya ana-enwekwa ọṅụ.
E Zigara Ụmụnna Si Obodo Dị Iche Iche Rọshịa Ka Ha Gaa Kwadoo Ụmụnna Ha n’Ikpe E kpegharịrị n’Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa
Òtù Na-achị Isi zigara ụmụnna anyị si mpaghara ụwa atọ Mọsko.
Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa Amaa Ndịàmà Jehova Ikpe
Ndịàmà Jehova ga-agba akwụkwọ ka e lebagarịa anya n’okwu ahụ.
Olee Mgbe Ikpe Arụrụala A Na-ekpe Ndịàmà Jehova n’Obodo Taganrọg Ga-akwụsị?
À ga-atụ Ndịàmà Jehova 16 a na-enweghị ihe ha mere mkpọrọ na Rọshịa n’ihi ihe ha kweere?
Ụlọikpe Kpebiri na “Anyị Anọghị n’Afọ 1937”
Otu ọkàikpe nọ n’ụlọikpe dị elu e nwere n’otu ógbè kagburu ihe otu obere ụlọikpe kpebiri.