Ọ̀ Bụ Echiche Mmadụ Ka E Dere na Baịbụl?
Ihe Baịbụl kwuru
Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ okwu amamihe ndị e dere na Baịbụl, Baịbụl kwuru na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kweta na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Legodị ụfọdụ n’ime ha:
O nwebeghị onye kwuru na ihe a kọrọ na Baịbụl emeghị eme, e mechaa ihe ahụ onye ahụ kwuru abụrụ eziokwu.
Ndị dere Baịbụl ezochighị ihe ha mere. Otú ha si kwuo ihe niile hoo haa gosiri na ha kwuru eziokwu.
Baịbụl n’ozuzu ya na-ekwu na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ nakwa na uche ya ga-emecha mee n’ụwa mgbe Alaeze ya ga-esi n’eluigwe chịwa ụwa.
Ọ bụ eziokwu na o ruola ọtụtụ puku afọ e dere Baịbụl, ma ị gụwa ya, ị gaghị agụta ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị sayensị kwuru n’oge gara aga.
Ihe ndị mgbe ochie dere gosiri na amụma ndị e buru na Baịbụl mechara mezuo.