À Gbanweela Baịbụl Ma Ọ Bụ Degharịa Ihe Dị Na Ya?
Mba. N’agbanyeghị na a na-edepụta Baịbụl kemgbe ọtụtụ puku afọ n’ihe ndị na-anaghị anọte aka, e leruo anya na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie, o doro anya na e nweghị ihe rijuru afọ gbanwere na Baịbụl.
Ọ̀ pụtara na e nweghị ebe ụfọdụ ndị na-edepụta Baịbụl dehiere ihe?
Taa, e nwere ọtụtụ puku Baịbụl e ji aka dee n’oge ochie ka dịnụ. Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe dị iche na ndị ọzọ, nke gosiri na e dehietụrụ ihe ụfọdụ mgbe a na-edepụta ha. Ma, ọtụtụ ihe ndị a e dehiere e nweghị ihe ha bụ, ha emeghịkwa ka ihe akụkụ Baịbụl ndị ahụ na-ekwu gbanwee. Ma e nwere ebe ole na ole a chọpụtara na e dehiere nnukwu ihe. Ọ ga-abụkwa na e nwere ndị ma ụma dehie ha iji gbanwee ihe Baịbụl na-ekwu. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha:
Na 1 Jọn 5:7, ụfọdụ Baịbụl ochie kwuru sị, “e nwere Nna ahụ, Okwụ ahụ na Mmụọ Nsọ n’eluigwe: ha atọ bụkwa otu.” Ma, Baịbụl e ji aka dee n’oge ochie ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi gosiri na okwu ndị a adịghị na Baịbụl mbụ. Ọ bụ ndị mmadụ mechara denye ha. a Ya mere Baịbụl ndị e leziri anya sụgharịa n’oge a wepụrụ ha.
E dere aha Chineke ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie. Ma, e wepụla ya n’ọtụtụ Baịbụl ma jirizie utu aha dị iche iche dị ka “Onyenwe Anyị” ma ọ bụ “Chineke” dochie ya.
Gịnị mere obị ga-eji sie anyị ike na e nweghị ọtụtụ ihe ndị ọzọ e dehiere na Baịbụl ndị nwere ike pụta ìhè n’ọdịnihu?
Ka ọ dị ugbu a, a hụla ọtụtụ Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie nke na ọ dịzi mfe ịchọpụta ihe ndị e dehiere. b A tụlee akwụkwọ ndị a, gịnị ka a na-chọpụta banyere ma a gbanweela Baịbụl?
Mgbe ọ na-ekwu banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, Agba Ochie onye ọkachamara bụ , William H. Green kwuru sị: “E nweziri ike ikwu na a tulee akwụkwọ niile ndị e dere n’oge ochie e nweghị akwụkwọ ọzọ dị taa nke zuru oke karịa Baịbụl.”
Onye okà mmụta n’ihe gbasara Baịbụl bụ́ F. F. Bruce dere banyere Akwụkwọ Grik nke Ndị Kraịst, ya bụ “Agba Ọhụrụ”, sị: “N’agbanyegị na ihe ndị e nwere taa ndị na-akwado ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ “Agba Ọhụrụ” karịrị nnọọ ihe ndị na-akwado akwụkwọ ndị ndị a ma ama n’oge ochie dere e nweghị onye na-arụ ụka ná-ekwu na agbanweela ihe ndị ha dere.”
Sir Frederic Kenyon, bụ́ onye ma nke a kọrọ n’ihe banyere Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie kwuru na onye ọ bụla “nwere ike ijide Baịbụl n’aka ma kwuo n’atụghị egwu ma ọ bụ maa jijiji na ihe ya ji n’aka bụ Okwu Chineke nke si n’aka ọgbọ dị iche iche kemgbe ọtụtụ narị afọ ruo anyi aka n’enweghi mgbanwe ọ bụla rijuru afọ.”
Olee ihe ndị ọzọ na-enye anyị obi ike na Baịbụl ruru anyị aka taa a dịghị iche na Baịbụl mbụ?
Ndị odeakwụkwọ ndị Juu na ndị nke Grik bụ́ ndi na-edepụta Baịbụl e wepụghị akụkọ banyere ezigbote mmehie ndị Chineke. c (Ọnụ Ọgụgụ 20:12; 2 Samuel 11:2-4; Ndị Galeshia 2:11-14) Ha e wepụghịkwa akụkọ banyere nnupụisi ndị Juu na ndị katọrọ nkụzi ụgha si n’aka ndị mmadụ. (Hosia 4:2; Malakaị 2:8, 9; Matiu 23:8, 9;1 Jọn 5:21) Ndị odeakwụkwọ a gosiri na ha kwesịrị ntụkwasị obi ma jirikwa Okwu Chineke dị nsọ kpọrọ ihe site n’igba mbọ ghara ị denye ihe ma ọ bụ wepụ ihe mgbe ha na-edepụta Baịbụl.
Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị na Chineke, bụ onye Baịbụl si n’aka ya, ga-echebe Baịbụl ka a ghara ịgbanwe ya? d (Aịzaya 40:8; 1 Pita 1:24, 25) O doro anya na ọ chọrọ ka Baịbụl baara ndị mmadụ uru ma n’oge ochie ma n’oge anyị a. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) N’eziokwu “e dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe na-echegbughị onwe ha ma agbanweela ihe e dere na ya.—Luk 4:16-21; Ọrụ Ndịozi 17:1-3.
a Okwu ndị a adịghị na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie dị ka Codex Sinaiticus, Codex Alexandrinus, Vatican Manuscript nke 1209, Latin Vulgate mbụ, Philoxenian-Harclean Syriac Version na Syriac Peshitta.
b Dị ka ihe atụ, a hụla Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma ọ bụ Agba Ọhụrụ e ji aka dee n’oge ochie karịrị puku ise.
c Baịbụl e kwughị na ndị na-anọchite anya Chineke emekataghị mehie ihe. O kwuru nke bụ eziokwu sị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie.”—1 Ndị Eze 8:46.
d Baịbụl kwuru na ọ bụghị okwu niile dị na ya ka Chineke ji ọnụ ya kwuo ma Chineke duziri echiche ndị dere ya.—2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:21.