Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Obi Na-ajọ Nwa M Njọ Maka na Ọ Nọ Nkịtị n’Ụlọ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Obi Na-ajọ Nwa M Njọ Maka na Ọ Nọ Nkịtị n’Ụlọ?

 Were ya na obi na-ajọ nwa gị njọ na ọ nọ nkịtị n’ụlọ. Ya abịa sị gị, “Ike ịnọ nkịtị agwụla m.” Ihe mbụ nwere ike ịgbata gị n’obi bụ ịgwa ya ka ọ gaa lewe tiivi ma ọ bụ ka ọ gaa gwuwe egwuregwu vidio kacha amasị ya. Ma tupu i mee otú ahụ, o nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche.

Ihe ụfọdụ ndị nne na nna chọpụtarala gbasara ụmụaka obi na-ajọ njọ maka na ha nọ nkịtị n’ụlọ

  •   Ụdị egwuregwu nwa gị na-egwu na otú oge o ji egwu ya hà nwere ike ime ka ike gwụ ya. Otu nna sịrị: “Ọ na-adị ụfọdụ ụmụaka ka ime ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ọ na-aka agwụ ike karịa ile tiivi ma ọ bụ igwu egwuregwu vidio. Ọ na-adịkwa ha ka ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị anaghị atọcha ụtọ.”

     Nwunye ya aha ya bụ Barbara kwetara na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mmadụ ga-echerịrị echiche, gbaakwa mbọ tupu ya enwee ike ime ihe ndị a na-eme eme ná ndụ. Ọtụtụ mgbe kwa, ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka onye ahụ ga-eji rite uru ná mbọ ọ gbara. Ma, ụmụaka ndị na-eji oge buru ibu ele tiivi ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio weere ya ka ihe na-agwụ ike.”

  •   Mmadụ iji oge buru ibu na-ele ihe ndị mmadụ tinyere n’Ịntanet nwere ike ime ka obi na-ajọ ya njọ. Ọ bụrụ na onye na-eto eto ana-elekarị ọmarịcha foto ma ọ bụ vidio gbasara ihe ndị enyi ya na-eme, bụ́ ndị ha tinyere n’Ịntanet, o nwere ike ime ka ọ na-adị ya ka ọ̀ bụ na o nweghị ihe na-atọ ụtọ yanwa na-eme. Otu nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Beth kwuru, sị: “Ọ dị mfe mmadụ ịna-eche na ndị ọzọ niile na-ekpori ndụ, yanwa anọrọ n’ụlọ.”

     Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ awa mmadụ ji wagharịa n’Ịntanet nwere ike ime ka ọ dị ya ka ọ̀ bụ na o nweghị ihe bara uru o ji oge ahụ mee. Ọ bụ ya mere obi ka nwere ike iji na-ajọ ya njọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Chris kwuru, sị: “Ịwagharị n’Ịntanet nwere ike ime ka ị ghara ịnọ nkịtị, ma, e mechaa, ị ga-abịa chọpụta na oge ahụ i ji mee ya furu ọhịa.”

  •   Oge nwa gị nọ nkịtị nwere ike ịbụ oge ọ ga-eji mee ihe bara uru. Otu nne aha ya bụ Katherine sịrị na oge nwatakịrị nọ nkịtị bụ ohere ọ ga-eji mụta ihe ndị e ji ụbụrụ eme. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Nwa gị nwere ike ịna-edetu ihe ndị ọ chọrọ ịna-echeta ọ ga-etinye n’igbe. O nwekwara ike iji obere igbe rụọ ụgbọala, ụgbọ mmiri, ma ọ bụ ụgbọelu. O nwekwara ike jiri blanket rụọ ihe ga-adị ka ụlọikwuu.”

     Ọ bụ ya mere otu ọkachamara n’akparamàgwà ụmụ mmadụ, onye aha ya bụ Sherry Turkle, ji kwuo na oge obi na-ajọ mmadụ njọ maka na ọ nọ nkịtị bụ “ohere onye ahụ ga-eji mụta ihe ndị e ji ụbụrụ eme.” a Ọ bụ ihe a mere na a gaghị ekwu na ọ bụ ihe ọjọọ mere onye ọ bụla obi na-ajọ njọ maka na ọ nọ nkịtị. Akwụkwọ aha ya bụ Disconnected kwudịrị, sị: “Otú ahụ ịna-ebu ihe na-anyị arọ na-eme ka uru ahụ́ mmadụ na-esikwu ike ka mmadụ ịna-eche echiche nke ọma mgbe ọ nọ nkịtị ga-eme ka ọ mụta ihe ndị e ji ụbụrụ eme.”

 Ihe i kwesịrị ime: Were oge obi na-ajọ ụmụ gị njọ maka na ha nọ nkịtị ka ohere ị ga-eji nyere ha aka ịmụta ihe ọhụrụ, ọ bụghị ka oge ha nọ ná nsogbu.

Ihe ị ga-eme gbasara ụmụ gị obi na-ajọ njọ maka ha nọ nkịtị n’ụlọ

  •   Ọ bụrụ na o kwere omume, hapụ ụmụ gị ka ha gaa gwuo egwu n’èzí. Nwaanyị ahụ aha ya bụ Barbara anyị kwuru okwu ya na mbụ sịrị: “Otú anwụ ịchasa mmadụ n’ahụ́ na ikuku ndụ ikusa ya si eme ka obi kwụsị ịjọ onye ahụ njọ dị ịtụnanya. Ụmụaka bidohaala igwu egwu n’èzí, ụbụrụ ha ga na-arụkwu ọrụ nke ọma.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịchị ọchị na oge ịwụli elu.”​—Ekliziastis 3:​1, 4.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Olee oge ndị m ga na-ahapụ ụmụ m ka ha gaa gwuo egwu n’èzí? Ọ bụrụ na ọ gaghị adị mma ịhapụ ha ka ha gaa gwuo egwu n’èzí, olee ihe ndị dị n’ụlọ ha nwere ike iji na-egwuri egwu?

  •   Nyere ụmụ gị aka ịna-eche gbasara ndị ọzọ. E nwere aro otu nne aha ya bụ Lillian tụrụ. Ọ sịrị: “Nyere onye agadi aka sụchasịara ya ụlọ ya, ma ọ bụ zaara ya ụlọ ya, ma ọ bụ hichaara ya ụlọ ya, ma ọ bụ siere ya nri, ma ọ bụkwanụ gaa leta ya. Imere ndị ọzọ ihe ọma na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.”​—Ilu 11:25.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú ị ga-esi enyere ụmụ gị aka ka ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma na-atọkwu ha ụtọ?

  •   Na-eme ihe ị na-akụziri ha. Otú i si edowe ọnụ ekwu gbasara ihe ndị ị na-eme n’ụbọchị nwere ike imetụta ụmụ gị. Otu nne aha ya bụ Sarah sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ụmụ anyị chee na o nweghị ihe na-eme anyị obi ụtọ ná ndụ, ha nwere ike ịmụta ịghara ịna-enwe obi ụtọ n’aka anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ekwu okwu otú gosiri na ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị na-atọ anyị ụtọ, ha nwere ike ịmụta isi otú ahụ na-ele ihe ndị hanwa na-eme anya.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.”​—Ilu 15:15.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú m na-esi edowe ọnụ akọrọ ụmụ m gbasara ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị? Gịnị ka ha na-ahụ m na-eme mgbe ike ịnọ nkịtị gwụrụ m?

 Ihe ị ga-eme: Nyere ụmụ gị aka idepụta ihe ndị ha nwere ike iji ọgụgụ isi ha eme. Otu nne aha ya bụ Allison sịrị: “Anyị nwere igbe ebe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị na-etinye ihe o dere o chere anyị ga-eme.”

a O si n’akwụkwọ bụ́ Reclaiming Conversation.