Olee Otú Mụ na Onye Nkụzi Anyị Ga-esi Na-adị ná Mma?
ISI NKE 20
Olee Otú Mụ na Onye Nkụzi Anyị Ga-esi Na-adị ná Mma?
Dee aha onye nkụzi gị ihe ya kacha amasị gị. ․․․․․
Gịnị mere ihe ya ji amasị gị? ․․․․․
Dee aha onye nkụzi gị gị na ya na-adịghị ná mma. ․․․․․
I NWERE ike iji aka gị kpebie ndị ga-abụ ndị enyi gị. Ma mgbe ị bụ nwatakịrị, ọ bụghị gị ga-ekpebi ndị ga-abụ ndị nkụzi gị. O nwere ike ịbụ na gị na ndị nkụzi gị niile na-adị ná mma. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Devid kwuru, sị: “E nweghị onye nkụzi m mụ na ya na-adịghị ná mma. M na-akwanyere ha ùgwù, ha niile hụrụ m n’anya.”
Ma onye nkụzi unu nwere ike ịna-eme ka onye nkụzi otu nwata nwaanyị dị afọ iri na otu aha ya bụ Sera. O kwuru, sị: “Onye nkụzi anyị dị obi ọjọọ. Anaghị m aghọta ihe ọ na-akụzi. Mgbe ụfọdụ, ọ naghị akọwa ihe nke ọma ma ọ bụkwanụ ya
akọwaa ya gafee ókè.” Ihe ga-enyere gị aka ka gị na onye nkụzi unu na-adị ná mma bụ ibu ụzọ chọpụta ihe i chere bụ́ nsogbu gị. Ịchọpụta ihe bụ́ nsogbu ahụ ga-eme ka i merie ya. Kanye ✔ na nke dabara adaba n’okpuru ebe a, ma ọ bụ gị edee ihe i chere bụ́ nsogbu.□ Ọ na-esiri m ike ịghọta ihe onye nkụzi anyị na-akụzi
□ Echere m na onye nkụzi kwadara m n’ule
□ Ọ dị m ka ọ̀ na-emenyere ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ
□ Ọ na-ata m ahụhụ karịrị ihe m mere
□ Ọ dị m ka ọ̀ kpọrọ m asị
□ Ihe ọzọ ․․․․․
Gịnị ga-enyere gị aka imeri nsogbu ahụ? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ime ihe Pita onyeozi kwuru. O dere, sị: “Unu niile, nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.” (1 Pita 3:8) Gịnị nwere ike ime ka ihe banyere onye nkụzi i chere na ọ dị obi ọjọọ na-emetụ gị n’obi? Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma banyere ndị nkụzi, bụ́ ihe ndị nwere ike inyere gị aka.
Ndị nkụzi nwere ike imejọ ihe. Dị ka ndị ọzọ, ha nwere àgwà nke ha, nsogbu nke ha, nweekwa ike ịkpọ mmadụ asị. Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Brianna kwuru, sị: “Onye na-akụziri anyị mgbakọ na mwepụ na-ewe iwe ọkụ. Ọ na-agbọjakwa anyị ọtụtụ mgbe. N’ihi ya, o siiri anyị ike ịna-akwanyere ya ùgwù.” Gịnị kpatara ya? Brianna kwuru, sị: “Ụmụ klas anyị na-eme mkpọtụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-eme ihe na-adịghị mma ka onye nkụzi wekwuo iwe.”
Ọ bụrụ na onye nkụzi eleghara ihe i mejọrọ anya, o doro anya na obi na-adị gị ụtọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na e nwere ihe
na-enye gị nsogbu n’obi. Ì nwere ike imere onye nkụzi unu otú ahụ? Dee ihe mere n’ụlọ akwụkwọ unu n’oge na-adịbeghị anya na ihe i chere mere onye nkụzi unu ji mee ihe o mere.․․․․․
Ndị nkụzi nwere ihe ndị na-akacha amasị ha. Chegodị echiche banyere ihe nwere ike isiri ndị nkụzi unu ike: Ụmụ akwụkwọ ole chọrọ ịnọ na klas? Ole n’ime ndị chọrọ ịnọ na klas chọrọ ige ntị n’otu ihe a na-akụzi ruo nkeji iri atọ ma ọ bụ karịa, geekwa ntị nke ọma? Ụmụ akwụkwọ ole na-ewesa onye nkụzi iwe n’ihi ihe onye ọzọ mere ha ma ọ bụ iwe onye ọzọ kpasuru ha? Weregodị ya na ọrụ gị bụ ịkụziri ndị ọgbọ gị dị iri abụọ ma ọ bụ iri atọ ma ọ bụ karịa ihe, ya abụrụkwa na ọtụtụ n’ime ha achọghị ịmụ ihe ahụ ị chọrọ ịkụziri ha. Ọ́ gaghị eme ka ị chọọ ilebara ndị ahụ chọrọ ịmụta ihe anya karịchaa?
N’eziokwu, iwe nwere ike iwe gị ma i chee na onye nkụzi na-emenyere naanị ụfọdụ ndị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Natasha kwuru, sị: “Onye nkụzi anyị na-agwa anyị mgbe anyị ga-eweta ihe o nyere anyị dee, ma mgbe ọ ga-agwa ndị nọ n’òtù egwuregwu n’ụlọ akwụkwọ ka ha weta nke ha dị iche. O mechara bụrụ na ọ bụ ya bụ osote onye na-akụzi egwuregwu.” Ụdị ihe a mee gị, jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere ihe m kwesịrị ịmụta onye nkụzi na-anaghị akụziri m?’ Ọ bụrụ na e nweghị, ì kwesịrị iwere ya iwe ma ọ bụ inwere ụmụ akwụkwọ ibe gị anyaụfụ?
Dee ihe i nwere ike ime iji gosi onye nkụzi unu na ị chọrọ ịmụta ihe ọ na-akụzi.
․․․․․
Ndị nkụzi nwere ike ịghọtahie ụmụ akwụkwọ. Onye nkụzi nwere ike iwere gị iwe mgbe ụfọdụ n’ihi na ihe anaghị adabara gị na ya ma ọ bụ n’ihi nghọtahie gị na ya nwere. Ị jụọ onye nkụzi ajụjụ, o nwere ike iche na ị dị isi ike. I kwuo ihe na-atọ ọchị, o nwere ike iche na ị na-akparị ya ma ọ bụ na ị dị nzuzu.
Gịnị ka i nwere ike ime ma onye nkụzi ghọtahie gị? Baịbụl kwuru, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Ndị Rom 12:17, 18) N’ihi ya, gbalịa ka ị ghara ịkpasu onye nkụzi unu iwe. Gị na ya esela okwu. Emela ihe ga-eme ka onye nkụzi baara gị mba. Gbalịa ka gị na ya bụrụ enyi. Ma i nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee otú mụ na onye nkụzi ga-esi bụrụ enyi?’ Na-akwanyere ya ùgwù. Ị hụ ya, kelee ya. Ịkpa àgwà ọma mgbe niile, dị ka ịmụmụ ọnụ ọchị, nwere ike ime ka ọ gbanwee otú o si ele gị anya.—Ndị Rom 12:20, 21.
Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa aha ya bụ Ken kwuru na ndị nkụzi na-aghọtahie ya. O kwuru, sị: “Anaghị m agwa ndị nkụzi okwu n’ihi na m na-eme ihere.” Olee otú Ken si merie nsogbu ahụ? O kwuru, sị: “Emechara m chọpụta na ihe ndị nkụzi na-eme
bụ inyere m aka. N’ihi ya, m kpebiri ịmata ndị nkụzi anyị niile otu otu. Ozugbo m matara ha, amalitere m imekwu nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.”N’eziokwu, ọ bụghị mgbe niile ka àgwà ọma gị ma ọ bụ okwu ọma gị ga-eme ka gị na onye nkụzi dịwa ná mma. Ma, nwee ndidi. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Onye nwere ndidi ga-enweta ihe n’aka eze [ma ọ bụ onye nkụzi], okwu ọma na-eru n’ụmị ọkpụkpụ.” (Ilu 25:15, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) E mee gị ihe na-adịghị mma, wetuo obi, jirikwa nwayọọ kwuo ihe ị chọrọ ikwu. Onye nkụzi nwere ike ịgbanwe otú o si ele gị anya.—Ilu 15:1.
Onye nkụzi ghọtahie gị ma ọ bụ mee gị ihe na-adịghị mma, gịnị na-ebu ụzọ abata gị n’obi?
․․․․․
Gịnị ka ọ ga-aka mma ka i mee?
․․․․․
Idozi Esemokwu
Ọ bụghị ịghọta na e nwere ihe onye nkụzi na-emejọ bụ ebe okwu biri. Gịnị ka i nwere ike ime iji dozie ihe na-esere gị na ya? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ihe ndị e kwuru n’okpuru ebe a seere unu okwu?
Onye nkụzi kwadara m n’ule. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Katrina kwuru, sị: “M na-agbakarị onye mbụ n’ule. Ma e nwere otu afọ onye na-akụziri anyị sayensị kwadara m n’ule. Ekwesịghị m ịda ule ahụ. Ndị mụrụ m gara gwa ya onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị. Ma naanị ihe onye nkụzi ahụ mere bụ inyetụ m obere maakị ka ọ ghara ịbụ na m dara. O were m ezigbo iwe.” Ụdị ihe ahụ mee gị, agala bowe onye nkụzi ebubo. Kama, 2 Samuel 12: 1-7.
mụta ihe n’ihe Netan a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl mere. Chineke nyere ya ọrụ siri ike, nke bụ́ ịga gwa Eze Devid oké ihe ọjọọ o mere. Netan ejighị iwe gaa n’obí eze kparịwa Eze Devid, kama o ji akọ gakwuru Devid.—I nwere ike ime otú ahụ, wetuo obi gakwuru onye nkụzi unu. I wee iwe ma ọ bụ kparịwa ya, ọ gaghị eme ka gị na ya dị ná mma. Mee ka dimkpa. Buru ụzọ jụọ onye nkụzi ihe i nwere ike ime iji mee nke ọma n’oge ọzọ. Sọlọmọn dere, sị: “Gee ntị tupu ị zaa, ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, ihe i mere bụ iberiibe na mkparị.” (Ilu 18:13, Today’s English Version) I gee ya ntị, i nwere ike ịchọpụta ihe ị ga-eme iji na-emekwu nke ọma. Ọ bụrụgodị na onye nkụzi enyekwughị gị maakị, otú i si kpaa àgwà ka dimkpa nwere ike ime ka o lewe gị anya ọma.
Ọ dị m ka onye nkụzi ọ̀ kpọrọ m asị. Chegodị banyere ihe mere Rechel. Ọ na-eme nke ọma n’ule n’ụlọ akwụkwọ, ma mgbe ọ gafere na klas ọzọ, ihe gbanwere. Rechel kwuru, sị: “Onye nkụzi mere ihe niile o nwere ike ime ka m daa n’ule.” Maka gịnị? Onye nkụzi ahụ gwara Rechel na mama ya hoo haa na ya kpọrọ okpukpe ha asị.
Gịnị meziri? Rechel kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla onye nkụzi kwadara m n’ule maka asị ahụ ọ kpọrọ okpukpe anyị, mama m na-eso m aga ụlọ akwụkwọ ịjụ ya ihe mere. O mechara kwụsị imesi m ike.” Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme gị, kata obi gwa ndị mụrụ gị ihe na-eme. O doro anya na ha ga-achọ ka ha na onye nkụzi ahụ ma ọ bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ unu kwuo banyere ya ka a mara otú a ga-esi kwụsị nsogbu ahụ.
Lepụ Anya n’Ihu
N’eziokwu, ọ bụghị nsogbu niile na-emecha laa. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe ị ga-eme bụ idi nsogbu i nwere. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tanya kwuru, sị: “Otu onye nkụzi anyị na-emesi ụmụ akwụkwọ ya niile ike. Ọ na-akparịkarị anyị, na-akpọkwa anyị ndị iberiibe. Ná mmalite, ihe ọ na-ekwu na-eme ka m bee ákwá. Ma m mechara mụta iwepụ obi m n’okwu ọjọọ ọ na-ekwu. Mkpa m bụ ime ihe m kwesịrị ime n’ụlọ akwụkwọ na ige ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. N’ihi ya, ihe ọ na-ekwu anaghịzị enye m nsogbu, esokwa m na mmadụ ole na ole mere nke ọma n’ule ya. Mgbe afọ abụọ gachara, a chụrụ onye nkụzi ahụ n’ọrụ.”
Ị mụta idi nsogbu onye nkụzi gị na-enye gị, ị ga-amụta ihe ga-abara gị uru n’ọdịnihu, ya bụ, ma onye ị na-arụrụ ọrụ bụrụ onye na-eme ka ihe siere gị ike. I mechaa nwee ezigbo ndị nkụzi, ị ga-ama otú ị ga-esi jiri ha kpọrọ ihe.
Ọ̀ dị gị ka oge anaghị ezuru gị n’ụbọchị? Mụta otú ị ga-esi na-ahazi oge gị ka ọ baara gị uru.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.
NDỤMỌDỤ
I chee na otú onye nkụzi si akụzi ihe na-atụ ụra, gee ntị n’ihe ọ na-akụzi, ọ bụghị n’otú o si akụzi ya. Na-ede ihe ọ na-akụzi. Wetuo obi gwa ya ka ọ kọwaara gị ihe na-edoghị gị anya, gosikwa na ị chọrọ ịmụta ihe. Ndị ọzọ ga-eṅomi gị.
Ị̀ MA NA . . . ?
O nwere ike ịbụ na onye nkụzi unu akụzierela ọtụtụ ụmụ akwụkwọ isiokwu ahụ ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, o nwere ike isiri ya ike iji ịnụ ọkụ n’obi kọwaa isiokwu ahụ otú ọ kọwara ya n’oge gara aga.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na otú onye nkụzi si akụzi ihe na-atụ ụra, ihe m ga-eme ga-enyere m aka bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na m chee na ihe onye nkụzi na-eme m adịghị mma, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i gee ntị n’ihe onye nkụzi na-akụzi, ọ bụghị n’otú o si akụzi ya?
● Olee otú onye nkụzi nwere ike isi na-ele gị anya ma ọ bụrụ na ị na-ele ihe ọ na-akụzi anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 146]
“M gbalịsiri ike ka mụ na ndị nkụzi anyị niile bụrụ enyi. Ama m aha ha niile. M hụ ha n’ụzọ, mụ na ha na-akparịta ụka nkeji ole na ole.”—Carmen
[Foto dị na peeji nke 145]
Ị chọọ ịgafe ebe mmiri juru, ịzọ ụkwụ na nkume ndị dị n’ebe ahụ ga-enyere gị aka. Otú ahụ ka ndị nkụzi ga-enyere gị aka ịmụta ihe ma i mee ihe i kwesịrị ime