Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 2

Gịnị Mere Otú M Dị Ji Echu M Ụra?

Gịnị Mere Otú M Dị Ji Echu M Ụra?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

E nwere ihe ndị dị mkpa karịa ihe ị na-ahụ ma i lee onwe gị n’enyo.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Ọ na-abụ Julia lee onwe ya n’enyo, ya adị ya ka ò buru ibu. Ọ na-agwa onwe ya na ya kwesịrị ifelata n’agbanyeghị na papa ya na mama ya na ndị enyi ya na-asị na ọ bụ “ogwu azụ̀.”

N’oge na-adịbeghị anya, Julia nọ na-eche ahụhụ ọ ga-ata onwe ya iji felatatụ naanị obere. Naanị ihe ọ ga-eme bụ ibu ọnụ ụbọchị ole na ole . . .

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ ọ dị Julia, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Otú i si ele onwe gị anya nwere ike ịdị ka ile onwe gị anya n’enyo na-akọ mmadụ ọnụ

Ọ dịghị njọ ma ọ bụrụ na ị na-eche banyere otú ị dị. N’eziokwu, e nwere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị mara mma Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ Sera, Rechel, Abigel, Josef, na Devid. Baịbụl kwuru na otu nwaanyị aha ya bụ Abishag “mara mma nke ukwuu.”1 Ndị Eze 1:4.

Ma, ọtụtụ ndị na-eto eto na-echegbu onwe ha banyere otú ha dị. O nwere ike ịkpatara ha ezigbo nsogbu. Dị ka ihe atụ:

  • N’otu nchọpụta e mere, ihe dị́ ka ụmụ agbọghọ isii n’ime ụmụ agbọghọ iri kwuru na ha bụ akpa akpụ, ebe ọ bụkwanụ naanị ihe dị́ ka mmadụ abụọ bụ akpa akpụ.

  • Ná nchọpụta ọzọ e mere, ihe dị́ ka ụmụ nwaanyị ise n’ime ụmụ nwaanyị iri, ndị a ma na ha dị gịrịgịrị, chere na ha buru oké ibu.

  • Ụfọdụ ndị na-eto eto na-anọ ebe ha na-achọ ifelata, ha atụwazie ụjọ nri. Ịtụ ụjọ nri bụ ọrịa nwere ike igbu mmadụ n’ihi ibu ọnụ.

Ị chọpụta ihe gosiri na ị na-atụ ụjọ nri ma ọ bụ na i nwere nsogbu ọzọ, chọọ enyemaka. Gwa papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto ị tụkwasịrị obi. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”Ilu 17:17.

IHE KACHA MMA I KWESỊRỊ IMEZIKWU

Nke bụ́ eziokwu bụ na àgwà bụ mma. Chegodị banyere Absalọm bụ́ nwa Eze Devid. Baịbụl kwuru, sị:

“Ọ dịghị nwoke mara mma n’Izrel dum dị ka Absalọm. . . . Ntụpọ adịghị ya n’ahụ́.”2 Samuel 14:25.

Ma, nganga juru nwa okorobịa a isi. Ọ na-achọ ihe ukwu, bụrụkwa onye aghụghọ. Ọ bụ ya mere na Baịbụl ekwughị okwu ọma banyere Absalọm; o mere ka a mata na Absalọm bụ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, bụrụkwa onye ụfụ obi chọrọ igbu nna ya.

Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji dụọ anyị ọdụ, sị:

“Yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ.”Ndị Kọlọsi 3:10.

“Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ . . . iyi ihe ịchọ mma . . . , kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.”1 Pita 3:3, 4.

Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị njọ ma ị chọọ ịdị mma n’anya, ihe kacha mkpa bụ àgwà gị. Àgwà ọma gị ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ị nọ karịa ịgbasi ike ma ọ bụ ịma mma. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Phylicia sịrị: “Ndị mmadụ na-ahụta onye mara mma ozugbo. Ma, ọ bụ ụdị onye ị bụ na àgwà ọma gị ka ndị mmadụ ga-akacha echeta.”

ILERU OTÚ Ị DỊ ANYA

Obi ọ̀ na-ajọkarị gị njọ n’ihi otú ị dị?

Ì chetụla echiche itewe mmanụ ka ị chawa ọcha ma ọ bụ buwe ọnụ ka ị ghara ibu ibu?

Olee ihe ị ga-achọ ịgbanwe n’ahụ́ gị ma a sị na ị ga-emeli ya? (Họrọ ndị nke ị chọrọ.)

  • OGOLOGO GỊ

  • OTÚ Ị HA N’IBU

  • NTỤTỤ GỊ

  • AHỤ́ GỊ

  • IHU GỊ

  • ỤCHA AHỤ́ GỊ

Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ ahụ e bu ụzọ jụọ, ọ bụrụkwa na ị họọrọ ihe atọ ma ọ bụ karịa n’ime ihe ndị ahụ e dere, cheta na o nwedịrị ike ịbụ na ndị ọzọ anaghị ele gị anya otú ahụ i si ele onwe gị. Ma ị́ maghị ihe i mere, otú ị dị nwere ike ime ka i mefee ihe ókè, ya echuwezie gị ụra.1 Samuel 16:7.