Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye
Gịnị mere a ga-eji kwuo na alụghị di ma o bụ nwunye bụ onyinye?
Gịnị mere na ọ dịghị mma inyewe Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nsogbu ka ọ lụọ?
1 Kọr. 7:28, 32-35; 1 Tesa. 4:11
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Rom 14:10-12—Pọl onyeozi kwuru ihe mere na anyị ekwesịghị ikpe nwanna anyị ikpe
-
1 Kọr. 9:3-5—Pọl onyeozi nweere onwe ya ịlụ nwaanyị. Ma n’ihi na ọ lụghị nwaanyị, o nwere ohere jekwuoro Jehova ozi
-
Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye hà kwesịrị iche na ha agaghị enweli obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha alụghị?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ikpe 11:30-40—Ada Jefta alụghị di, ndụ ya nwekwara isi maka na o ji ya jee ozi n’ụlọikwuu
-
Ọrụ 20:35—Jizọs Kraịst alụghị nwaanyị, ma ihe o kwuru gosiri na obi dị ya ụtọ maka ihe o meere ndị ozọ
-
1 Tesa. 1:2-9; 2:12—Pọl onyeozi alụghị nwaanyị. O kwuru otú ozi o jere si mee ya obi ụtọ n’ihi na o nyeere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova
-
Gịnị mere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji kwesị ịna-akpa àgwà ọma otú ndị ọzọ na-efe Jehova na-akpa?
1 Kọr. 6:18; Gal. 5:19-21; Efe. 5:3, 4
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ilu 7:7-23—Eze Solomọn kwuru nsogbu otu nwa okorobịa banyere na ya mgbe o kwere ka nwaanyị akwụna rafuo ya
-
Abụ Solo. 4:12; 8:8-10—E toro nwa agbọghọ Shulem maka na o kweghị emebi iwu Jehova gbasara alụmdi na nwunye
-
Olee mgbe ọ ga-adị mma ka onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye chewe echiche ịlụ?
I nwekwara ike ịgụ 1 Tesa. 4:4, 5