Ofufe
Naanị ònye ka anyị kwesịrị ife ofufe?
Ọpụ. 34:14; Diut. 5:8-10; Aịza. 42:8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 4:8-10—Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma o fee ya ofufe. Jizọs ekweghị eme ihe Setan kwuru, kama o kpebisiri ike ife naanị Jehova
-
Mkpu. 19:9, 10—Otu mmụọ ozi dị ike ekweghị ka Jọn onyeozi fee ya ofufe
-
Olee otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Aịza. 1:10-17—Jehova anaghị anabata ofufe ndị jụrụ irubere ya isi na-efe ya iji mezuo iwu
-
Mat. 15:1-11—Ihe Jizọs kwuru gosiri na Jehova anaghị anabata ofufe ndị na-efe ya n’elu ọnụ, ndị na-eso ọdịnala ụmụ mmadụ kama iso iwu Chineke
-
Mgbe ọ bụla o kwere omume, olee ndị anyị na ha kwesịrị ịna-efekọ Jehova?
I nwekwara ike ịgụ Ọma 133:1-3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 2:40-42—N’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst na-ezukọta ka ha kpee ekpere, soro ibe ha nọrịa, ma mụkọọ Okwu Chineke nke e ji ike mmụọ nsọ dee ọnụ
-
1 Kọr. 14:26-40—Pọl onyeozi kwuru na e kwesịrị ịhazi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ahazi nakwa na o kwesịrị ịgba ndị bịara ya ume. Ihe a ga-eme ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe a na-akụzi, ghọtakwa ya
-
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị jide n’aka na Jehova na-anabata ofufe anyị?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Hib. 11:6—Pọl onyeozi kwuru na anyị kwesịrị inwe okwukwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị
-
Jems 2:14-17, 24-26—Jems, nwanne Jizọs, kwuru na anyị ga-emerịrị ihe ga-egosi na anyị nwere okwukwe. Okwukwe anyị kwesịrị ime ka anyị na-eme ihe dị mma
-