Omume Ndị Na-adịghị Mma
Olee omume ndị na-adịghị mma Ndị Kraịst kwesịrị izere?
Okwu mkparị
Mat. 5:22; 1 Kọr. 6:9, 10; Efe. 4:31
I nwekwara ike ịgụ Ọpụ. 22:28; Ekli. 10:20; Jud 8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Sam. 16:5-8; 1 Eze 2:8, 9, 44, 46—Shimiaị kparịrị eze Jehova tere mmanụ, a takwara ya ahụhụ
-
Ịnara aka azụ ma ọ bụ inye aka azụ
Ọpụ. 23:8; Ọma 26:9, 10; Ilu 17:23
I nwekwara ike ịgụ Diut. 10:17; 16:19; Ọma 15:1, 5
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 8:1-5—Ụmụ Samuel onye amụma akpaghị ezigbo àgwà ka ya, kama ha nọ na-anara aka azụ, na-ekpekwa ikpe arụrụala
-
Nehe. 6:10-13—Ndị iro Jehova kwụrụ onye amụma ụgha bụ́ Shemaya ụgwọ ka o buo amụma ga-eme ka Nehemaya bụ́ gọvanọ tụọ ụjọ, meekwa ka ọrụ a na-arụrụ Jehova ghara ịga n’ihu
-
Itu ọnụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Itu Ọnụ”
Ime ihe ọjọọ n’asọghị anya; omume rụrụ arụ; ịkwa iko; di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko
Gụọ isiokwu bụ́ “Ịkwa Iko”
Ịma aka
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mak 9:33-37; 10:35-45—Jizọs gbaziri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro maka na ha na-arụ ụka banyere onye ka ibe ya
-
3 Jọn 9, 10—Dayotrefis na-achọ “ịbụ onye mbụ” n’ime ụmụnna ya
-
Ịkpata nkewa; inwe òtù
Rom 16:17; Gal. 5:19, 20; Taị. 3:10, 11; 2 Pita 2:1
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:29, 30; 1 Kọr. 1:10-12; Mkpu. 2:6, 15
Ịṅụbiga mmanya ókè; aṅụrụma
Ilu 20:1; 23:20, 29-35; 1 Kọr. 5:11; 6:9, 10
I nwekwara ike ịgụ Efe. 5:18; 1 Tim. 3:8; Taị. 2:3; 1 Pita 4:3
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ịṅụ Mmanya”
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 9:20-25—Ọ bụ maka na Noa ṅụbigara mmanya ókè mere Ham na nwa ya nwoke bụ́ Kenan ji mee mmehie dị oké njọ
-
Dan. 5:1-6, 30—Mgbe mmanya nọ na-egbu Belshaza, ọ kparịrị Jehova. Ihe a o mere kpataara ya ọnwụ, bibiekwa alaeze ya
-
Ịpụnara mmadụ ihe; irigbu mmadụ
Ọma 62:10; 1 Kọr. 5:10, 11; 6:9, 10
I nwekwara ike ịgụ Ilu 1:19; 15:27
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jere. 22:11-17—Jehova mara Eze Shalọm (Jehoahaz) ikpe maka na o rigburu ndị mmadụ, meekwa mmehie ndị ọzọ dị oké njọ
-
Luk 19:2, 8—Onyeisi ndị ọnaụtụ aha ya bụ Zakịọs chegharịrị, kwụsị irigbu ndị mmadụ, kwekwa nkwa na ya ga-enyeghachi ndị mmadụ ihe ọ pụnaara ha
-
Ọrụ 24:26, 27—Pọl onyeozi enyeghị Gọvanọ Filiks aka azụ ọ nọ na-atụ anya ka Pọl nye ya
-
Otuto elu ọnụ
Job 32:21, 22; Ọma 5:9; 12:2, 3; Ilu 26:24-28; 29:5
I nwekwara ike ịgụ Ilu 28:23; 1 Tesa. 2:3-6
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 18:18, 19—Jizọs anabataghị ihe a kpọrọ ya iji too ya otuto elu ọnụ
-
Ọrụ 12:21-23—Mgbe ndị mmadụ toro Eze Herọd Agrịpa, kwuo na ọ bụ chi, ọ nabatara ya. Ọ nwụkwara n’ihi mmehie ya
-
Iri oké nri
I nwekwara ike ịgụ Luk 21:34, 35
Ịgba asịrị; mmadụ itinye anya n’ihe na-agbasaghị ya
Ilu 25:23; 1 Tesa. 4:11; 2 Tesa. 3:11; 1 Pita 4:15
I nwekwara ike ịgụ Ilu 20:19; 1 Tim. 5:13
Ikpere arụsị
Gụọ isiokwu bụ́ “Ikpere Arụsị”
Ịgha ụgha; ịghọgbu mmadụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Ịgha Ụgha”
Ịgha ụgha; ikwuto mmadụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Ịgha Ụgha”
Iji ọbara eme ihe na-ekwesịghị ekwesị
Jen. 9:4; Diut. 12:16, 23; Ọrụ 15:28, 29
I nwekwara ike ịgụ Lev. 3:17; 7:26
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 14:32-34—Mgbe ndị Izrel riri anụ n’ebughị ụzọ kwe ka ọbara ya gbapụchaa, ha mehiere Jehova
-
Igbu mmadụ
Ọpụ. 20:13; Mat. 15:19; 1 Pita 4:15
I nwekwara ike ịgụ Mat. 5:21, 22; Mak 7:21
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 4:4-16—Ken gburu Abel nwanne ya bụ́ onye ezi omume n’agbanyeghị na Jehova ji ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị
-
1 Eze 21:1-26; 2 Eze 9:26—Anyaukwu mere ka Eze Ehab na Jezibel nwunye ya kpaa nkata ma gbuo Nebọt na ụmụ ya
-
Ịtamu ntamu
1 Kọr. 10:10; Fil. 2:14; Jud 16
I nwekwara ike ịgụ Ọnụ Ọgụ. 11:1
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọnụ Ọgụ. 14:1-11, 26-30—Ndị Izrel tamuru ntamu n’ihi Mosis na Erọn, ma Jehova weere ya na ọ bụ n’ihi ya ka ha ji tamuo ntamu
-
Jọn 6:41-69—Ndị Juu tamuru ntamu n’ihi Jizọs. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya kwụsịkwara iso ya
-
Okwu rụrụ arụ ma ọ bụ njakịrị rụrụ arụ
I nwekwara ike ịgụ Efe. 4:29, 31
Ile ndị gba ọtọ
Gụọ isiokwu bụ́ “Ile Ndị Gba Ọtọ”
Ise okwu
Gụọ isiokwu bụ́ “Esemokwu”
Ịkwa emo
I nwekwara ike ịgụ Ilu 17:5; 22:10; 2 Pita 3:3, 4
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 36:15-21—A tara ndị na-efe Chineke nupụụrụ ya isi ahụhụ maka na ha kwara ndị ozi ya emo, jirikwa ndị amụma ya mee ihe ọchị
-
Job 12:4; 17:2; 21:3; 34:7—Mgbe ọnwụnwa siri ezigbo ike bịaara Job bụ́ onye ezi omume, a kwara ya emo
-
Izu ohi
Gụọ isiokwu bụ́ “Izu Ohi”
Ịlụ ọgụ; ime tigbuo zọgbuo
I nwekwara ike ịgụ 1 Tim. 3:2, 3; Taị. 1:7
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọpụ. 21:22-27—Iwu Mosis kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ alụọ ọgụ ma merụọ onye ọzọ ahụ́, a ga-ata ndị ahụ ahụhụ
-
Ịmaja mmadụ
I nwekwara ike ịgụ Ọma 10:4, 7; 73:3, 8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 4:15-21—Ndị Sanhedrin majara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha wee kwụsị ikwusa ozi ọma
-
Oriri oké mkpọtụ
Rom 13:13; Gal. 5:19, 21; 1 Pita 4:3
I nwekwara ike ịgụ Ilu 20:1; 1 Kọr. 10:31
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 5:1-4, 30—Mgbe Eze Belshaza mere “nnukwu oriri,” ọ ṅụrụ oké mmanya nke mere ka ọ ghara ịkwanyere Jehova ùgwù. Ihe a o mere kpataara ya ọnwụ
-