ISI NKE 02
Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
N’ebe niile n’ụwa, ndị mmadụ na-enwe nsogbu ndị na-eme ka obi na-ajọ ha njọ, ha ana-echegbu onwe ha, obi ana-agbawakwa ha. Ụdị ihe a ò metụla gị? O nwere ike ịbụ na ọrịa na-echi gị ọnụ n’ala ma ọ bụkwanụ na onye gị na ya dị n’ezigbo mma nwụrụ. Ihe a nwere ike mee ka ị na-eche, sị, ‘Ihe ọ̀ ga-emecha dị mma?’ Ihe Baịbụl zara n’ajụjụ a ga-eme ka obi ruo gị ala.
1. Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?
Baịbụl na-agwa anyị ihe mere nsogbu ji ju ebe niile. Ọ na-agwakwa anyị na nsogbu ndị a agaghị adịte aka nakwa na ha ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Baịbụl kwere nkwa na ‘ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu nakwa na anyị ga-enwe olileanya.’ (Gụọ Jeremaya 29:11, 12.) Nkwa ndị a na-eme ka anyị na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, obi esiekwa anyị ike na anyị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
2. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu?
Baịbụl kwuru na n’ọdịnihu, “ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” (Gụọ Mkpughe 21:4.) Nsogbu ndị na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ agaghịzi adị, ma ịda ogbenye ma mmegbu ma ọrịa ma ọnwụ. Baịbụl kwukwara na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.
3. Gịnị ka ị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-eme?
Ọtụtụ ndị na-atụ anya ka ihe ọma meere ha, ma, obi anaghị esi ha ike na ihe ndị ahụ ga-emecha meere ha. Ma, ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-emerịrị. Obi ga-esi anyị ike na ha ga-emezu ma ọ bụrụ na anyị “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 17:11) Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-enwe ike iji aka gị kpebie ma ị̀ ga-ekweta na ihe ndị o kwuru gbasara ọdịnihu ga-eme n’eziokwu.
MỤTAKWUO IHE
Chebara ụfọdụ n’ime ihe ndị Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu echiche. Chọpụta otú ihe ndị o kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu si enyere ndị mmadụ aka n’oge a.
4. Baịbụl kwere nkwa na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla
Legodị ụfọdụ n’ime nkwa ndị Baịbụl kwere. Olee ndị nke kacha amasị gị? Maka gịnị?
Gụọnụ amaokwu Baịbụl ndị e dere ná ngwụcha nkwa ndị e depụtara ebe a, lebakwanụ anya n’ajụjụ ndị a:
-
Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị a hà mere ka i nwee olileanya? Ì chere na ha ga-abara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị uru?
Weregodị ya na i bi n’ụwa ebe
A NA-ENWEGHỊ . . . |
ONYE Ọ BỤLA . . . |
---|---|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
5. Uru nkwa ndị a Baịbụl kwere bara
Ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha ma ọ bụ na-ewe iwe n’ihi nsogbu ndị ha na-enwe. Ụfọdụ na-agbalịsi ike ka ha kwụsị nsogbu ndị a. Chọpụta otú nkwa Baịbụl kwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu si abara ndị mmadụ uru taa. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Na vidio a, olee ihe nọ na-enye Rafika nsogbu n’obi?
-
Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ nọ na-enye ya nsogbu n’obi akwụsịghị, olee otú Baịbụl si nyere ya aka?
Baịbụl kwuru na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ihe a o kwuru na-enyere anyị aka ka obi ghara ịna-ajọ anyị njọ, na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị n’ihi nsogbu ndị na-abịara anyị. Gụọnụ Ilu 17:22 na Ndị Rom 12:12. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Ì chere na nkwa Baịbụl kwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu emekataghị mee.
-
Gịnị mere o ji dị mma ka i leruo anya chọpụta nke bụ́ eziokwu?
NCHỊKỌTA
Baịbụl kwere nkwa na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Nkwa a na-eme ka anyị nwee olileanya, na-emekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịma gbasara nkwa dị iche iche Chineke kwere anyị?
-
Olee ihe Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu?
-
Ọ bụrụ na ị mara na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, olee otú ọ ga-esi baara gị uru ugbu a?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú inwe olileanya nwere ike isi nyere gị aka ma nsogbu bịara gị.
“Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?” (Teta!, Mee 8, 2004)
Chọpụta otú olileanya anyị nwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu nwere ike isi nyere ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala aka.
Ka ị na-ele vidio egwú a, were ya na gị na ezinụlọ gị nọ na-enwe obi ụtọ na Paradaịs ahụ Baịbụl kwuru na ọ ga-adị n’ọdịnihu.
Otu nwoke nọ na-agba mbọ ka ihe gbanwee n’obodo ha. Gụọ gbasara otú ndụ ya si gbanwee mgbe ọ mụtara ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu.
“O Doola M Anya na Agaghị M Agbanweli Ụwa A” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2013)