NKEBI NKE 7
Ònye Bụ Jizọs?
Jehova zitere Jizọs n’ụwa. 1 Jọn 4:9
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, e nwere onye ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ige ntị. Ọtụtụ afọ tupu Jehova ekee Adam, o kere otu onye dị ike, bụ́ mmụọ, n’eluigwe.
Jehova mechara zite ya n’ụwa ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye aha ya bụ Meri, mụọ ya na Betlehem. Aha a gụrụ nwa ahụ Meri mụrụ bụ Jizọs.—Jọn 6:38.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ṅomiri àgwà Chineke nke ọma. O nwere obiọma, hụkwa ndị mmadụ n’anya. Ọ dịkwaara ndị mmadụ mfe ịbịakwute ya. Ọ kụziiri ndị ọzọ eziokwu banyere Jehova n’atụghị egwu..
1 Pita 2:21-24
Jizọs mere ihe ọma, ma ndị mmadụ kpọrọ ya asị.Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ.
Ndị ndú okpukpe kpọrọ Jizọs asị n’ihi na ọ gbara ozizi ụgha ha na omume ọjọọ ha n’anwụ.
Ndị ndú okpukpe gwara ndị Rom okwu ụgha banyere Jizọs. N’ihi ya, ndị ọchịchị Rom tiri Jizọs ihe ma gbuo ya.