ISI NKE 11
Jọn Onye Na-eme Baptizim Akwadebe Ụzọ
MATIU 3:1-12 MAK 1:1-8 LUK 3:1-18 JỌN 1:6-8, 15-28
-
JỌN ANA-EKWUSA OZI ỌMA, NA-EMEKWA NDỊ MMADỤ BAPTIZIM
-
E MERE ỌTỤTỤ NDỊ BAPTIZIM, MA Ọ BỤGHỊ MMADỤ NIILE
Afọ iri na asaa agaala kemgbe ahụ Jizọs nọ n’ụlọ nsọ na-ajụ ndị nkuzi okpukpe ajụjụ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Ugbu a bụ oge opupu ihe ubi nke afọ 29. Ọtụtụ ndị nọ na-ekwu banyere onye ikwu Jizọs bụ́ Jọn, onye nọ na-ekwusa ozi ọma n’obodo niile dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Jọdan.
Otú Jọn dị n’ile anya nakwa ihe ọ na-ekwu na-amasị ndị mmadụ. E ji ajị kamel mee uwe ya, jirikwa akpụkpọ anụ mee ájị̀ ọ na-eke n’úkwù. Nri ya bụ mmanụ aṅụ na igurube. Olee ozi ọ na-ezi ndị mmadụ? “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe eruwo nso.”—Matiu 3:2.
Ozi a Jọn na-ezi na-atọ ndị bịara ige ya ntị ụtọ. Ọtụtụ ndị bịara ghọta na ha kwesịrị ichegharị, ya bụ, ịgbanwe àgwà ha na otú ha si ebi ndụ, ma hapụ ihe ndị na-adịghị mma ha na-eme. Ndị bịara ige ya ntị si “Jeruselem na Judia dum na obodo dum dị gburugburu Osimiri Jọdan.” (Matiu 3:5) Ọtụtụ n’ime ha chegharịrị. O mikpukwara ha n’ime Osimiri Jọdan mee ha baptizim. N’ihi gịnị?
Baptizim Jọn mere ndị mmadụ gosiri na ha ejirila obi ha niile chegharịa ná mmehie ha mere megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ọrụ Ndịozi 19:4) Ma, ọ bụghị mmadụ niile ruru eru ka e mee ha baptizim. Mgbe ndị ndú okpukpe ụfọdụ, ndị Farisii, na ndị Sadusii bịakwutere Jọn, ọ kpọrọ ha “ụmụ ajụala.” Ọ sịrị ha: “Mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị; unu asịkwala n’ime onwe unu, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike ime ka Ebreham nweta ụmụ site na nkume ndị a. Anyụike atọgbọrọworị na mgbọrọgwụ osisi; n’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”—Matiu 3:7-10.
N’ihi otú ọtụtụ ndị si na-ege Jọn ntị, otú ozi ọ na-ezi si akpa ike, nakwa otú ọtụtụ ndị si na-abịa ya ana-eme ha baptizim, e zipụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha gaa jụọ ya sị: “Ònye ka ị bụ?”
Jọn zara ha, sị: “Abụghị m Kraịst.”
Ha jụrụ ya ọzọ, sị: “Ònyekwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?”
Ọ zara ha, sị: “Abụghị m.”
Ha ajụọkwa ya, sị: “Ị̀ bụ Onye Amụma Ahụ?” ya bụ, ma ọ̀ bụ onye Amụma ahụ Mozis kwuru na ọ ga-abịa.—Diuterọnọmi 18:15, 18.
Ọ sịrị ha, “Ee e!”
Ha nọgidere na-ajụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ? ka anyị wee mara ihe anyị ga-aza ndị zitere anyị. Olee ihe ị na-ekwu banyere onwe gị?” Jọn zara ha, sị: “Abụ m olu onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Meenụ ka ụzọ Jehova kwụrụ ọtọ,’ dị ka Aịzaya onye amụma kwuru.”—Jọn 1:19-23.
Ha jụziri ya, sị: “Gịnịzi mere i ji na-eme baptizim ma ọ bụrụ na ọ bụghị gị bụ Kraịst ma ọ bụ Ịlaịja ma ọ bụ Onye Amụma Ahụ?” Ya azaa ha sị: “Eji m mmiri na-eme baptizim. Ọ dị onye guzo n’etiti unu, onye unu na-amaghị, onye na-abịa n’azụ m.”—Jọn 1:25-27.
Ee, Jọn mere ka ha mata na ihe ya na-eme bụ ịkwadebe ụzọ, ya bụ, ime ka ndị mmadụ nwee obi ziri ezi iji nabata Mesaya ahụ, onye na-aga ịbụ Eze. Jọn kwuru gbasara onye ahụ, sị: “Onye ahụ nke na-abịa n’azụ m ka m ike, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.” (Matiu 3:11) Jọn kwudịrị, sị: “Onye na-abịa n’azụ m agafewo n’ihu m, n’ihi na ọ dị adị tupu mụ onwe m.”—Jọn 1:15.
N’ihi ya, ozi ahụ Jọn ziri ha, bụ́ “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe eruwo nso,” kwesịrị nnọọ ekwesị. (Matiu 3:2) Ozi ahụ mere ka ọhaneze mata na Jizọs Kraịst, bụ́ onye ahụ Jehova họpụtara ka ọ bụrụ Eze, agala ịmalite ozi ya.