Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 53

Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ

Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ

Jehova bụ “Chineke, onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Ọ chọrọ ka anyị na-enwe aṅụrị, na-enwekwa obi ụtọ ná ndụ. Obi na-abụ ya sọ aṅụrị ma anyị hapụtụ ọrụ anyị ma wepụta oge tụọ ndụ mmanụ. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-eme ka oge anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ baara anyị uru, mee ka anyị nwee obi ụtọ, masịkwa Jehova.

1. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-achọ ihe anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ?

Gịnị ka obi na-adị gị mma ime ma ị na-ezu ike? Ụfọdụ ndị na-anọdụrụ onwe ha n’ụlọ na-agụ akwụkwọ, na-egere egwú, na-ele fim, ma ọ bụ jiri Ịntanet na-eme ihe dị iche iche. Ndị ọzọ anaghị achọ ịnọ otu ebe. Ha na-achọ ka ha na ndị enyi ha soro na-agbagharị ígwè, na-egwu mmiri, ma ọ bụ na-azụ okwe. Nke ọ sọrọ ya bụrụ ya na-amasị anyị, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na ihe anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ “dị Onyenwe anyị mma.” (Ndị Efesọs 5:10) Ọ dị mma ka anyị buru ihe a n’obi n’ihi na a na-ahụ ihe dị iche iche Jehova kpọrọ asị n’ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ. A na-ahụ ihe ndị dị ka tigbuo zọgbuo, ịkwa iko, ma ọ bụ ime mgbaasị. (Gụọ Abụ Ọma 11:5.) Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ihe dị mma anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ?

Ọ bụrụ na anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya bụ enyi, ha ga-enyere anyị aka ịma ihe dị mma anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ. Dị ka anyị mụrụ n’otu isiokwu bu nke a ụzọ, “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe.” Ma, “ihe agaghị agaziri” anyị ma anyị na ndị na-emebi iwu Chineke na-akpa.​—Ilu 13:20.

2. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji oge karịrị akarị na-eme onwe anyị obi ụtọ?

Ọ bụrụgodị na ihe anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ dị mma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ịna-ericha oge anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-ericha oge anyị, anyị agaghịzi enwe oge fọdụrụ anyị ga-eji na-eme ihe ndị ka mkpa. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘jiri oge anyị na-eme ihe kacha mkpa.’​—Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ị ga-esi na-amata ihe dị mma ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ.

3. Ejila ihe na-adịghị mma eme onwe gị obi ụtọ

Gịnị mere anyị ji kwesị ịsa anya ná mmiri tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eji mee onwe anyị obi ụtọ? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú egwuregwu a na-egwu n’oge ochie na Rom si yie ụfọdụ ihe ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ taa?

  • Na vidio a anyị lere, gịnị ka Danny mụtara gbasara ihe o ji atụrụ ndụ?

Gụọnụ Ndị Rom 12:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú amaokwu a ga-esi nyere gị aka ịmata ihe dị mma ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ?

Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Jehova kpọrọ asị? Gụọnụ Ilu 6:16, 17 na Ndị Galeshia 5:19-21. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • N’ime ihe ndị a kpọrọ aha ebe a, ò nwere nke ị na-ahụ n’ihe ndị mmadụ na-ejikarị eme onwe ha obi ụtọ?

 Ihe ga-enyere gị aka ịma ihe dị mma ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ

Jụọ onwe gị, sị:

  • Gịnị? Ihe Jehova kpọrọ asị ò so n’ihe a ga-eme na ya?

  • Ole mgbe? Ọ̀ ga-egbochi m ime ihe ndị ka mkpa?

  • Ole ndị? Ọ̀ ga-eme ka mụ na ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-akpatụ ma ọ bụ na-akpachi anya?

Ọ ka mma ka anyị ghara ịnọ ihe nwere ike ịkpatara anyị nsogbu nso. N’ihi ya, e nwee ihe ọ bụla na-eme anyị obi abụọ ma ọ̀ dị mma iji ya eme onwe anyị obi ụtọ, anyị kwesịrị ịgbara ya ọsọ ụkwụ eru ala

4. Jiri oge gị na-eme ihe bara uru

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ bụ eziokwu na nwanna nwoke a anyị lere na vidio anaghị ele ihe na-adịghị mma, gịnị ghọọrọ ya nsogbu?

Gụọnụ Ndị Filipaị 1:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú amaokwu a nwere ike isi nyere anyị aka ikpebi otú oge anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ ga-aha?

5. Jiri ihe dị mma na-eme onwe gị obi ụtọ

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ n’ime ihe ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ adịghị Jehova mma, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mma anyị nwere ike iji mee onwe anyị obi ụtọ. Gụọnụ Ekliziastis 8:15 na Ndị Filipaị 4:8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe dị mma mmadụ nwere ike iji mee onwe ya obi ụtọ nke na-amasị gị?

E nwere ihe dị iche iche dị mma i nwere ike iji mee onwe gị obi ụtọ

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na o nweghị ihe dị njọ na mmadụ ji ihe ndị a na-eme tigbuo zọgbuo, na-akwa iko ma ọ bụ na-eme anwansi na ha na-eme onwe ya obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe ndị ahụ.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ka anyị jiri ihe dị mma na-eme onwe anyị obi ụtọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ihe ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ Ndị Kraịst kwesịrị izere?

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-etinye oge karịrị akarị n’ihe ndị anyi ji eme onwe anyị obi ụtọ?

  • Olee ihe mere ị ga-eji jiri ihe ndị dị Jehova mma na-eme onwe gị obi ụtọ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta onye ọ dị n’aka ikwu ihe ndị ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ.

“Ndịàmà Jehova Hà Na-agwa Ndị Òtù Ha Aha Fim, Akwụkwọ, na Egwú Ndị Ha Ga-ezere?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe nwere ike inyere gị aka ịmata ihe dị mma ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ.

“Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?” (Ụlọ Nche, Ọktoba 15, 2011)

N’isiokwu bụ́ “M Kwụsịdịrị Ịkpọ Ndị Ọcha Asị,” chọpụta ihe mere otu nwoke ji gbanwee ihe ndị o ji eme onwe ya obi utọ.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2010)

Chọpụta ihe nyeere otu nne aka ikpebi ihe dị mma ọ ga-eme mgbe a chọrọ igosi fim ndị na-eme mgbaasị.

Elela Fim Na-egosi Ihe Gbasara Mgbaasị (2:02)