ISI NKE 23
Olee Otú E Si Ede Akwụkwọ Anyị? Oleekwa Otú E Si Asụgharị Ha?
Anyị na-ezi ndị “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe na-enyere anyị aka ime ya bụ akwụkwọ anyị na-ebipụta n’ihe karịrị narị asụsụ asaa na iri ise. (Mkpughe 14:6) Ibi akwụkwọ n’asụsụ dị iche iche abụghị obere ọrụ. Ma, gịnị na-enyere anyị aka? Anyị nwere ndị ọrụ ha bụ ide ihe, nweekwa ọtụtụ ndị nsụgharị n’ụwa niile. Ma ndị na-ede ihe ma ndị na-asụgharị ya bụcha Ndịàmà Jehova.
A na-ebu ụzọ ede ha n’asụsụ Bekee. N’isi ụlọ ọrụ anyị, e nwere ngalaba a na-akpọ Ngalaba Ide Ihe. Òtù Na-achị Isi na-elekọta ya. Ọrụ ha bụ ide ihe. Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ na ya na-anọ n’isi ụlọ ọrụ anyị ede ihe, ndị ọzọ anọrọ n’ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ anyị. Ma, ọ bụ ngalaba a na-agwa onye nke ọ bụla isiokwu ọ ga-ede. Ọ na-abụ onye dechaa, ya ezigara Ngalaba Ide Ihe ihe o dere. Otú a ha si nọrọ ná mba dị iche iche na-ede ihe mere ka ihe a na-ede n’akwụkwọ anyị na-abara mmadụ niile uru n’agbanyeghị omenala ha.
A na-ezigara ha ndị nsụgharị. E dechaa ihe a chọrọ ibi n’akwụkwọ anyị, e nye ya ndị ga-agụgharị ya ma dezie ihe ọ bụla e dejọrọ. E mechaa, Ngalaba Ide Ihe esi na kọmputa zigara ya ndị nsụgharị. Ndị nsụgharị sụgharịchaa, ha elee ma ihe ha sụgharịrị na ihe Bekee kwuru ọ̀ bụ otu ihe. Ha mechaa, ha agụgharịa ya. Ndị nsụgharị na-eji ‘okwu ziri ezi na nke bụ́ eziokwu’ asụgharị ihe e dere otú ndị ga-agụ ya ga-aghọta ya.—Ekliziastis 12:10.
A na-eji kọmputa eme ka ọrụ a na-aga aga. Kọmputa anaghị arụ ọrụ ndị na-ede ihe na ndị na-asụgharị ihe na-arụ. Ma, ha na-eji ya arụ ọrụ ha ngwa ngwa. Na kọmputa ndị nsụgharị ji arụ ọrụ, e nwere akwụkwọ ọkọwa okwu, nweekwa ngwá ọrụ ndị ọzọ na-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. O nwere ihe Ndịàmà Jehova mepụtara a na-akpọ MEPS. Ọ na-enyere ndị nsụgharị aka ide mkpụrụ akwụkwọ ndị e nwere n’asụsụ dị iche iche. Ha sụgharịchaa, e tinye foto n’ebe ndị e kwesịrị itinye ha, mezie ya otú ọ ga-adịrị ígwè na-ebiri anyị akwụkwọ mfe ibi ya.
Gịnị mere anyị ji agba mbọ a niile? Gịnị mere anyị ji na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị na-agụ ha bụ naanị puku mmadụ ole na ole? Ọ bụ maka na uche Jehova bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4.
-
Olee otú e si ede ihe ndị a na-ebi n’akwụkwọ anyị?
-
Gịnị mere anyị ji asụgharị akwụkwọ anyị n’ọtụtụ asụsụ?