Ọrụ Ndịozi 22:1-30

  • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu ndị gbakọrọnụ (1-21)

  • Pọl kwuru na ya bụ onye Rom, a hapụ ịpịa ya ihe (22-29)

  • Ndị Sanhedrin zukọrọ (30)

22  “Ụmụnna m na ndị nna m, geenụ m ntị ka m gwa unu ihe merenụ.”+  Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu n’asụsụ Hibru, ha anọrọkwuo nwayọọ. O wee sị:  “Abụ m onye Juu+ a mụrụ na Tasọs nke dị na Silishia.+ Ma, agụrụ m akwụkwọ n’obodo a. Ọ bụkwa Gameliel+ kụziiri m ihe. A kụziiri m ka m na-esosi Iwu nna nna anyị hà soro ike.+ M na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi m na-ejere Chineke otú unu niile na-eme taa.+  Akpagburu m ndị na-eso Ụzọ a,* gbuodị ụfọdụ n’ime ha. M na-eke ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ha agbụ, na-atụkwa ha mkpọrọ.+  Nnukwu onye nchụàjà na ndị okenye niile makwa na ihe a m na-ekwu bụ eziokwu. O nwekwara mgbe ha nyere m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị Juu ibe anyị nọ na Damaskọs, mụ agawa ka m kpụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ bịa Jeruselem ka a taa ha ahụhụ.  “Ma mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo Damaskọs, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, m hụrụ ìhè dị egwu si n’eluigwe nwuo gburugburu m na mberede.+  M wee daa n’ala ma nụ olu sịrị m: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’  Mụ asị ya: ‘Ị̀ bụkwanụ onye?’* Ya asị m: ‘Abụ m Jizọs onye Nazaret, onye ị na-akpagbu.’  Ndị mụ na ha so hụrụ ìhè ahụ, ma ha aghọtaghị ihe onye ahụ na-agwa m okwu kwuru. 10  M kwuziri, sị: ‘Onyenwe m, gịnị ka m ga-eme?’ Onyenwe m asị m: ‘Bilie, banye Damaskọs. E nwere onye nọ ebe ahụ ga-agwa gị ihe niile e kpebiri ị ga-eme.’+ 11  Ma ìhè ahụ dị egwu mere ka m kpuo ìsì. Ndị ahụ mụ na ha so esekpụrụ m n’aka duru m ruo Damaskọs. 12  “Otu nwoke aha ya bụ Ananayas, onye na-atụ egwu Chineke otú Iwu Mosis kwuru, onye ndị Juu niile bi ebe ahụ na-ekwu okwu ọma banyere ya, 13  bịakwutere m. O guzo m n’akụkụ wee sị m, ‘Sọl, nwanna m, hụwa ụzọ.’ M hụwara ụzọ ozugbo ahụ, hụkwa ya.+ 14  Ya asị m: ‘Chineke nna nna anyị hà ahọrọla gị ka ị bịa mara uche ya, hụ Jizọs, onye ezi omume,+ nụkwa ihe o ji ọnụ ya kwuo. 15  Ọ họọrọ gị ka ị bụrụ onye àmà ya, ka ị na-akọrọ mmadụ niile ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.+ 16  Gịnị mere i ji na-egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim. Ọ bụrụkwa na ị na-akpọ aha Jizọs,+ Chineke ga-agbaghara gị mmehie gị.’+ 17  “Ma mgbe m laghachiri Jeruselem,+ nọrọ n’ụlọ nsọ na-ekpe ekpere, ahụrụ m ọhụụ. 18  Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ na-asị m: ‘Mee ngwa, si na Jeruselem pụọ ọsọ ọsọ, n’ihi na ha agaghị ekwere ihe ị ga-agwa ha gbasara m.’+ 19  M wee sị: ‘Onyenwe anyị, hanwa ma nke ọma na m na-agabu n’ụlọ nzukọ dị iche iche, na-akpụrụ ndị kwere na gị, na-atụ ha mkpọrọ, na-apịakwa ha ihe.+ 20  Anọkwa m mgbe e gburu Stivin ohu gị,* kwadoo ogbugbu e gburu ya. M chekwara uwe elu ndị gburu ya nche.’+ 21  Ma, ọ sịrị m: ‘Gawa, n’ihi na m ga-eziga gị ná mba ndị dị anya.’”+ 22  Ha nọkwa na-ege ya ntị ruo mgbe o kwuru ihe a. Ha wee tie mkpu, sị: “Nwoke a kwesịrị ọnwụ. Gbuonụ ya!” 23  Ha nọkwa na-eti mkpu, na-eyipụ uwe elu ha, na-atụsa ha aghara aghara, na-ekpolikwa uzuzu elu.+ 24  N’ihi ya, ọchịagha ahụ kwuru ka a kpọbata Pọl n’ogige ndị agha. O kwukwara na a ga na-apịa ya ihe ma a na-agba ya ajụjụ, ka ọ mara kpọmkwem ihe mere ha ji na-eti mkpu ka e gbuo ya. 25  Ma mgbe ha gbatịrị Pọl ka a pịa ya ụtarị, ọ jụrụ onyeisi ndị agha* guzo ebe ahụ, sị: “Iwu ò nyere unu ikike ịpịa onye Rom a na-amaghị ikpe* ihe?”+ 26  Ma mgbe onyeisi ndị agha ahụ nụrụ ihe a, ọ gakwuuru ọchịagha ahụ, sị ya: “Gịnị ka ị ga-eme ugbu a, ebe ọ bụ na nwoke a bụ onye Rom?” 27  N’ihi ya, ọchịagha ahụ bịakwutere Pọl, sị ya: “Ị̀ bụ onye Rom?” Ya asị: “Ee.” 28  Ọchịagha ahụ asị ya: “Akwụrụ m ezigbo ụgwọ tupu mụ abụrụ onye Rom.” Pọl asị: “Ma, mụnwa bụ onye Rom kemgbe a mụrụ m.”+ 29  N’ihi ya, ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ si ebe ọ nọ pụọ ozugbo ahụ. Ụjọ bịakwara ọchịagha ahụ mgbe ọ chọpụtara na ọ bụ onye Rom nakwa na ya ekeela ya agbụ.+ 30  N’echi ya, ọ tọpụrụ Pọl agbụ ma gwa ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin ka ha zukọọ, n’ihi na ọ chọrọ ịma kpọmkwem ihe ndị Juu sị na o mere. Ọ kpọtaziri Pọl n’ihu ndị ahụ zukọrọnụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst.
Na Grik, “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?”
Na Grik, “onye àmà gị.”
Ya bụ, onyeisi otu narị ndị agha.
Ma ọ bụ “a na-ekpeghị ikpe?”