Samuel nke Mbụ 25:1-44
25 Ka oge na-aga, Samuel+ nwụrụ. Ndị Izrel niile zukọtakwara ruoro ya uju ma lie ya n’akụkụ ụlọ ya dị na Rema.+ Devid wee gaa nọrọ n’ala ịkpa Peran.
2 E nwere otu nwoke na Meyọn,+ onye na-arụ ọrụ n’obodo a na-akpọ Kamel.*+ Nwoke a bara ezigbo ọgaranya. O nwere puku atụrụ atọ (3,000) na otu puku (1,000) ewu. Ọ nọkwa na Kamel na-akpacha ajị atụrụ ya.
3 Nwoke a si n’ezinụlọ Keleb.+ Aha ya bụ Nebal.+ Aha nwunye ya bụ Abigel.+ Nwunye ya ma ihe, maakwa mma, ma yanwa dị aka ike, na-akpakwa àgwà ọjọọ.+
4 Devid nọkwa n’ala ịkpa nụ na Nebal na-akpacha ajị atụrụ ya.
5 Devid wee zie mmadụ iri n’ime ndị na-eso ya, sị: “Gakwurunụ Nebal na Kamel, jụtakwaranụ m ya otú o mere.
6 Gwakwanụ ya, sị, ‘Ị ga-adị ogologo ndụ. Ya dịrị gị ná mma,* dịkwara ezinụlọ gị na ihe niile i nwere.
7 Anụrụ m na ị na-akpacha ajị anụ. Mgbe anyị na ndị na-azụrụ gị atụrụ nọ, anyị akpaghị ha aka.+ O nweghịkwa ihe ọ bụla ha chọrọ achọ n’oge niile ha nọ na Kamel.
8 Ị jụọ ndị ohu gị, ha ga-agwa gị. Meere ndị a m ziri ozi amara, n’ihi na oge a anyị bịara bụ oge a na-enwe aṅụrị.* Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a m ziri ozi nakwa mụnwa bụ́ Devid nwa gị ihe ọ bụla aka gị ruru.’”+
9 Ndị ahụ Devid ziri ozi wee gaa gwa Nebal ihe niile Devid kwuru. Mgbe ha kwuchara,
10 Nebal asị ha: “Ònye ka Devid nwa Jesi chere na ọ bụ mere m ga-eji mee ihe o kwuru? N’oge a, ndị ohu ndị na-agbapụ n’aka nna ha ukwu dị ọtụtụ.+
11 M̀ ga-ewere achịcha m na mmiri m na anụ m gbuuru ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amadịghị ebe ha si?”
12 Ndị ahụ Devid ziri ozi lọtara bịa kọọrọ ya ihe a niile.
13 Ozugbo ahụ, Devid sịrị ndị agha ya: “Onye ọ bụla kee mma agha ya n’úkwù!”+ Ha niile wee kee mma agha ha n’úkwù. Devid kekwara mma agha nke ya n’úkwù. Ihe dị ka narị ụmụ nwoke anọ (400) esoro ya gawa, ebe narị ụmụ nwoke abụọ (200) nọkwa na-eche nche ebe ahụ ha mara ụlọikwuu.*
14 Ka ihe a na-eme, otu n’ime ndị na-ejere Nebal ozi kọọrọ Abigel, nwunye Nebal, sị: “Devid si n’ala ịkpa zite ndị ozi ka ha gọzie nna anyị ukwu, ma ọ kparịrị ha.+
15 Ụmụ nwoke ndị ahụ mesoro anyị otú dị mma. O nweghị mgbe ha nyere anyị nsogbu. O nweghịkwa otu mkpụrụ ihe funahụrụ anyị n’oge niile anyị na ha nọ n’ọhịa.+
16 Ha dị ka mgbidi gbara anyị gburugburu ma n’ehihie ma n’abalị, n’oge niile anyị na ha nọ, ka anyị na-azụ ewu na atụrụ anyị.
17 Ugbu a, mara ihe ị ga-eme, n’ihi na ihe a ga-akpatara nna anyị ukwu na ezinụlọ ya niile ọdachi.+ O nweghịkwa onye nwere ike ịgwa nna anyị ukwu okwu maka na ọ bụ nwoke na-abaghị uru ọ bụla.”+
18 N’ihi ya, Abigel+ chịịrị narị achịcha abụọ (200) ozugbo ahụ, burukwa nnukwu ite mmanya abụọ na atụrụ ise e gburu egbu na ọka* e ghere eghe* dị sia* ise nakwa otu narị (100) keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ nakwa narị keeki abụọ (200) e ji naanị mkpụrụ fig mee wee dọkwasị ha n’elu jakị.+
19 Ọ gwaziri ndị na-ejere ya ozi, sị: “Burunụ m ụzọ gawa. M ga na-eso unu n’azụ.” Ma ọ gwaghị Nebal di ya ihe ọ bụla.
20 Mgbe ọ gba jakị na-agbada ugwu, ugwu ahụ mere ka Devid na ndị agha ya ndị si ụzọ ahụ na-agbadata ghara ịhụ ya. Ha na ya mechakwara zute.
21 Ma, Devid nọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ n’efu ka m chere ihe niile nwoke a nwere nche n’ala ịkpa. O nweghị otu n’ime ihe niile o nwere furu efu.+ Ma, o ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma.+
22 Ka Chineke megwara ndị iro Devid ihe ha mere ya, ka ọ tasiekwa ha* ahụhụ ike ma ọ bụrụ na e nwee otu n’ime ụmụ nwoke ya niile m ga-ahapụ ndụ ruo ụtụtụ.”
23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o si n’elu jakị rịtuo ozugbo, kpudo ihu n’ala n’ihu Devid, kpọọkwa isiala.
24 O gbukwara ikpere n’ala n’ihu ya, sị: “Onyenwe m, were ya na ọ bụ m mere gị ihe ọjọọ ahụ. O nwere ihe ohu gị nwaanyị chọrọ ịgwa gị. Getụnụ ohu gị nwaanyị ntị.
25 Biko, onyenwe m, echela gbasara nwoke a na-abaghị uru ọ bụla a na-akpọ Nebal,+ n’ihi na otú aha ya dị ka yanwa dị. Nebal* bụ aha ya, nzuzu dịkwa ya n’ahụ́. Ma, ohu gị nwaanyị anọghị ya mgbe ndị onyenwe m ziri ozi bịara.
26 Ugbu a, onyenwe m, eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụrụ gị* iyi na ọ bụ Jehova mere ka ikpe ọbara ghara ịma gị,+ meekwa ka ị ghara+ iji aka gị megwara onye mere gị ihe.* Ka ndị iro gị na ndị na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ dịrị ka Nebal.
27 Ugbu a, ohu gị nwaanyị buteere onyenwe m onyinye* a+ ka e nye ya ndị na-ejere onyenwe m ozi.+
28 Biko, gbaghara ohu gị nwaanyị ihe o mejọrọ, n’ihi na Jehova ga-arụrụ onyenwe m ụlọ ga-adịru mgbe ebighị ebi,*+ maka na onyenwe m na-alụrụ Jehova agha.+ I mebeghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla kemgbe a mụrụ gị.+
29 Ọ bụrụ na mmadụ ebilie chụwa gị ọsọ, na-achọkwa igbu gị, Jehova bụ́ Chineke gị ga-echebe gị otú mmadụ si echebe ihe bara ezigbo uru e kechiri n’akpa. Ma ọ ga-agbapụ ndụ* ndị iro gị otú e si eji èbè* agbapụ nkume.*
30 Ọ bụrụkwa na Jehova emeere onyenwe m ihe ọma ndị o kwere nkwa imere ya, họpụtakwa gị ka ị bụrụ onye ndú Izrel,+
31 ị gaghị akwa mmakwaara ma ọ bụ kwaa ụta ị gaara akwa n’obi gị ma a sị na i gburu* onye aka ya dị ọcha ma ọ bụ ma a sị na onyenwe m ji aka ya megwara ihe e mere ya.*+ Biko, onyenwe m, chetakwa ohu gị nwaanyị mgbe Jehova ga-emere gị ihe ọma.”
32 Devid wee sị Abigel: “Too Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye zitere gị taa ka ị bịa hụ m.
33 Ka Chineke gọzie gị maka otú a i si gosi na ị ma ihe. Ka ọ gọziekwa gị maka otú i si mee ka ikpe ọbara ghara ịma m+ nakwa otú i si mee ka m ghara iji aka m megwara ihe e mere m.*
34 Ma, eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye gbochiri m ime gị ihe ọjọọ,+ aṅụ iyi na a sị na i meghị ngwa bịa hụ m,+ a garaghị enwe nwoke ọ bụla ga-afọdụ n’ezinụlọ Nebal ma chi bọọ.”+
35 Devid wee nara ya ihe o buteere ya, sị ya: “Laa n’ụlọ gị n’udo. Anụla m ihe i kwuru. M ga-emekwara gị ihe ị chọrọ.”
36 Abigel mechara bịakwute Nebal. Ma, ọ nọ na-enwe oriri n’ụlọ ya ka onye eze. Obi bụkwa ya sọ aṅụrị. Ọ ṅụrọkwara anya. Abigel agwaghịkwa ya ihe ọ bụla, ruo mgbe chi bọrọ.
37 N’ụtụtụ, mgbe anya doro Nebal, nwunye ya gwara ya ihe ndị a. Obi ya wee dị ka nke onye nwụrụ anwụ, ahụ́ ya akpọnwụọ, ya adị ka nkume.
38 Mgbe ihe dị ka abalị iri gachara, Jehova mere ka Nebal nwụọ.
39 Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị: “Ka e too Jehova, onye kpere Nebal ikpe+ maka otú o si kparịa m.+ Ka e tookwa ya maka na o mere ka ohu ya ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla.+ Ka e tookwa Jehova na o mere ka Nebal jiri isi ya buru ihe o metara.” Devid zigakwara ndị gara gwa Abigel na ya chọrọ ịlụ ya.
40 Ndị na-ejere Devid ozi wee bịakwute Abigel na Kamel ma sị ya: “Devid ziri anyị ka anyị kpọta gị ka ị bụrụ nwunye ya.”
41 Ozugbo ahụ, o biliri kpọọ isiala, sị: “Ka ohu gị nwaanyị bụrụ nwaanyị na-eje ozi nke ga na-asa ụkwụ+ ndị ohu onyenwe m.”
42 Abigel+ wee rịgoro n’elu jakị ozugbo soro ndị na-ejere Devid ozi. Ụmụ nwaanyị ise na-ejere ya ozi jikwa ụkwụ na-eso ya n’azụ. Ọ ghọkwara nwunye Devid.
43 Devid lụkwara Ahịnoam+ onye Jezril.+ Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ ghọkwara ndị nwunye ya.+
44 Ma, Sọl kpọọrọ Maịkal+ nwa ya nwaanyị, bụ́ nwunye Devid, kpọnye Paltaị,+ nwa Leyish, onye Galim.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Obodo a dị na Juda. Ọ bụghị ugwu Kamel.
^ Ma ọ bụ “Udo dịrị gị.”
^ Na Hibru, “ụbọchị ọma.”
^ Na Hibru, “nọ n’akụkụ ibu.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ma ọ bụ “ọka a ṅara n’ọkụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “ka ọ tasiekwa Devid.”
^ Nebal pụtara “Onye Na-enweghị Uche; Onye Nzuzu.”
^ Ma ọ bụ “iji aka gị zọpụta onwe gị.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
^ Na Hibru, “ngọzi.”
^ Ya bụ, ọchịchị ga-adị ruo ebighị ebi.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Èbè bụ ihe yiri katapọt.
^ Ma ọ bụ “dị ka à ga-asị na e si n’èbè gbapụ ya.”
^ Ma ọ bụ “zọpụta onwe gị.”
^ Na Hibru, “ị wụfuru ọbara”
^ Ma ọ bụ “iji aka m zọpụta onwe m.”