Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 13:1-14

  • Ndụmọdụ ikpeazụ Pọl dụrụ ndị Kọrịnt na ume ọ gbara ha (1-14)

    • “Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike” (5)

    • Na-emezinụ ebe ndị unu na-anaghị emetecha, nweekwanụ otu obi (11)

13  Nke a bụ nke ugboro atọ m ga-abịa hụ unu. “A ga-esi n’àmà* ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.”+  Ọ bụ eziokwu na mụ na unu anọghị ugbu a, ma ọ dị m ka mụ na unu nọ ọzọ. Ihe a ka m na-agwa ndị mere mmehie n’oge gara aga na ndị ọzọ niile: Ọ bụrụ na mụ emechaa bịa ọzọ, agaghị m emere ndị na-eme ihe ọjọọ ebere.  M ga-esi otú ahụ gosi unu na Kraịst na-esi n’ọnụ m ekwu okwu. Ọ naghịkwa egosi unu na ya adịghị ike, kama ọ na-egosi unu na ya dị ike.  N’eziokwu, e gburu ya n’elu osisi mgbe ọ na-adịghị ike, ma ọ dị ndụ n’ihi ike Chineke.+ N’eziokwu, anyị adịghịkwa ike otú ahụ yanwa na-adịbughị ike, ma anyị na ya ga-adịkọ ndụ+ n’ihi ike Chineke nke na-arụ ọrụ n’ime unu.+  Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike. Na-egosinụ ụdị mmadụ unu bụ.+ Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na Jizọs Kraịst dị n’otu? Unu kwesịrị ịma, ọ gwụkwala ma Chineke ọ̀ jụla unu.  Ọ dị m ka ya bụrụ na unu ma na Chineke ajụghị anyị ajụ.  Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla. Ihe anyị bu n’obi abụghị ka anyị gosi na ihe anyị dị ndị mmadụ mma. Kama, anyị chọrọ ka unu na-eme ezi ihe, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ihe anyị ghara ịdị ndị mmadụ mma.  Anyị agaghị eme ihe ọ bụla ga-emegide eziokwu. Naanị ihe anyị ga-eme bụ ihe ga-akwado eziokwu.  Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ bụla unu dị ike, ọ bụrụgodị na anyịnwa adịghị ike mgbe ahụ. Anyị na-ekpekwa ekpere ka unu mezie ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* 10  Ọ bụ ya mere m ji ede ihe ndị a tupu mụ abịa hụ unu, ka ọ ga-abụ, mụ na unu nọrọ, mụ aghara ịdị aka ike, n’ihi na ikike Onyenwe anyị nyere m+ bụ ka m na-agba unu ume, ọ bụghị ime ka unu daa mbà. 11  N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-emezikwanụ ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* Na-ekwenụ ka a kasie unu obi.+ Nweenụ otu obi,+ na-ebikwanụ n’udo.+ Chineke nke udo,+ onye hụrụ anyị n’anya, ga-anọnyere unu. 12  Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.* 13  Ndị nsọ niile na-ekele unu. 14  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara. Ka Chineke hụ unu n’anya. Ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị niile na-arụkwa ọrụ n’ime unu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “n’ọnụ.”
Ma ọ bụ “ka unu kwe ka a gbazie unu.”
Ma ọ bụ “na-ekwekwanụ ka a gbazie unu.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.