Aịzaya 33:1-24
33 Gị,* onye na-ebibi ihe ndị mmadụ, ma e bibighị nke gị, ị ga-ata ahụhụ.+
Ị na-aghọgbu ndị ọzọ, ma a ghọgbughị gị.
I bibichaa ihe ndị mmadụ, a ga-ebibi gị.+
Ị ghọgbuchaa ndị ọzọ, a ga-aghọgbu gị.
2 Jehova, biko, meere anyị amara.+
Ọ bụ gị ka anyị tụkwasịrị obi.
Jiri aka* gị na-enyere anyị aka+ kwa ụtụtụ,Na-azọpụtakwa anyị n’oge nsogbu.+
3 Ndị mmadụ nụ mkpọtụ a na-eme n’oge ọgba aghara, ha agbaa ọsọ.
I bilie ọtọ, mba dị iche iche agbasasịa.+
4 Otú ahụ igurube si erichapụ ihe ọ bụla ọ hụrụ ka a ga-esi akwakọrọcha ihe unu* kwatara n’agha.
Ndị mmadụ ga-ejikwa ọsọ bịa ịkwakọrọ ihe ndị ahụ otú ahụ ìgwè igurube si eji ọsọ abịa ịtapịa ihe.
5 A ga-eto Jehova karịa otú e si eto ya,N’ihi na o bi n’ebe dị elu.
Ọ ga-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ebe niile na Zayọn, onye ọ bụla ana-emekwa ezi omume na ya.
6 Ọ bụ ya na-echebe unu.
Ọ na-azọpụta mmadụ otú na-enweghị atụ,+ na-eme ka mmadụ mara ihe, na-akụziri mmadụ ihe, na-emekwa ka a na-atụ egwu yanwa bụ́ Jehova.+
Ihe ndị a bụ akụ̀ ya.
7 Ndị dike ha na-ebesi ákwá ike n’okporo ámá.
Ndị ozi udo na-ebesikwa ákwá ike.
8 Okporo ụzọ tọgbọzi chakoo.
E nweghịzi onye na-aga n’ụzọ.
O mebiela* ọgbụgba ndụ.
Ọ jụla obodo dị iche iche.
O nweghịkwa ihe o ji mmadụ nkịtị kpọrọ.+
9 Ala a na-eru uju.* Ọ kpọọkwala nkụ.
E menyela Lebanọn ihere.+ O rekasịakwala.
Sharọn dịzi ka ọzara.
Beshan na Kamel na-agbụsịkwa akwụkwọ.+
10 Jehova kwuru, sị: “Ugbu a, m ga-eme ihe.
Ugbu a, m ga-egosi ike m.+
Ugbu a, m ga-egosi na m bụ onye ukwu.
11 Unu na-atụrụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, mụọkwa okporo ọka.
Àgwà ọjọọ unu ga-egbu unu otú ọkụ si erepịa ihe.+
12 Ndị mmadụ ga-adị ka ntụ a na-enweta ma a kpọọ ụrọ ọkụ.
A ga-akpọ ha ọkụ,+ ha adị ka osisi ogwu e gbuturu egbutu.
13 Ndị nọ ebe dị anya, nụrụnụ ihe m ga-eme.
Ndị nọ nso, kwetanụ na m dị ike.
14 Ụjọ na-atụ ndị mmehie nọ na Zayọn.+
Ahụ́ na-ama ndị kwụsịrị ife Chineke jijiji, ha ana-asị:
‘Ònye n’ime anyị ga-enwe ike ibi ebe a kwanyere nnukwu ọkụ?+
Ònye n’ime anyị ga-enwe ike ibi ebe ọkụ na-anaghị akwụsị akwụsị na-agba?’
15 Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile,+Na-ekwu eziokwu,+Na-akwụwa aka ọtọ, ghara igwu wayo,Ghara ịna aka azụ,+Na-emechi ntị ya ma a kpawa nkata igbu mmadụ,*Na-emechikwa anya ya ka ọ ghara ịhụ ihe ọjọọ,
16 Ọ ga-ebi n’ebe dị elu.
Ọ bụ na nkume siri ezigbo ike ka ọ ga-agbaba.
Nri agaghị akọ ya.
Mmiri ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+
17 Unu ga-eji anya unu hụ eze dị ebube,Hụkwa ala dị ebe dị anya.
18 Mgbe unu chetara ihe* na-emenye ụjọ, unu ga-asị n’obi unu:
“Olee ebe odeakwụkwọ nọ?
Olee ebe onye anyị si n’aka ya atụ ụtụ nọ?+
Olee ebe onye na-agụ ụlọ elu ọnụ nọ?”
19 Unu agaghịzi ahụ ndị na-akparị mmadụ,Ya bụ, ndị asụsụ ha na-anatụdịghị ekwe nghọta,
Ndị na-asụ asụsụ unu na-enweghị ike ịghọta.+
20 Legodịnụ Zayọn, bụ́ obodo anyị na-anọ eme ememme.+
Unu ga-eji anya unu hụ na Jeruselem bụ ebe unu ga-ebi ahụ́ eruo unu alaNakwa na ọ bụ ụlọikwuu a na-agaghị ebupụ ebupụ.+
O nweghị mgbe a ga-efopụ mkpọ́ ndị e ji jide ụlọikwuu a.
A gaghịkwa adọbi eriri ndị e ji rụọ ya.
21 Ma, Jehova, Onye Dị Ebube,Ga-echebe anyị ebe ahụ otú osimiri ma ọ bụ ọwa mmiri sara mbara si echebe obodo.
Ìgwè ụgbọ epeepe agaghị agafe n’ọwa mmiri ahụ.
Ụgbọ mmiri ndị dị ebube agaghịkwa agafe na ya.
22 N’ihi na Jehova bụ Onyeikpe anyị.+
Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu.+
Jehova bụ Eze anyị.+
Ọ bụ ya ga-azọpụta anyị.+
23 Eriri ji ụgbọ mmiri ndị iro unu ga-atọghe.
Ha agaghị ekesili osisi ákwà ụgbọ mmiri ha ike. Ha agaghịkwa agbasali ákwà ụgbọ mmiri ha.
N’oge ahụ, a ga-eke ọtụtụ ihe a kwatara n’agha.
Ndị ngwọrọ ga-akwatadị ọtụtụ ihe.+
24 O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: “Ahụ́ adịghị m.”*+
A ga-agbaghara ndị bi na ya mmehie ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, “ndị Asiria.”
^ Ma ọ bụ “ike.”
^ Ya bụ, “ndị Asiria.”
^ Ya bụ, onye iro emebiela.
^ O nwere ike ịbụ, “akpọọla nkụ.”
^ Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
^ Ma ọ bụ “ga-atụgharị uche n’ihe.”
^ Ma ọ bụ “Ana m arịa ọrịa.”