Aịzaya 8:1-22

  • Ndị Asiria ga-abịa lụso ndị Juda agha (1-8)

    • Meha-shalal-hash-baz (1-4)

  • Unu atụla egwu, “Chineke nọnyeere anyị!” (9-17)

  • Aịzaya na ụmụ ya bụ ihe na-egosi ihe Jehova zubere (18)

  • Sinụ n’iwu Chineke mata ihe unu chọrọ ịmata, unu ajụla ndị mmụọ ọjọọ ase (19-22)

8  Jehova gwara m, sị: “Were mbadamba osisi buru ibu,+ jiri mkpịsị akwụkwọ nkịtị* dee ‘Meha-shalal-hash-baz’* n’elu ya.  Achọrọ m ka ndị a tụkwasịrị obi, ya bụ, Yuraya+ onye nchụàjà na Zekaraya nwa Jeberekaya, dee* na ha hụrụ mgbe e dere ya.”  Mụ na nwunye m, bụ́ onye amụma nwaanyị, wee nwee mmekọahụ,* ya adịrị ime, mechaakwa mụọ nwa nwoke.+ Jehova wee sị m: “Gụọ ya Meha-shalal-hash-baz,  n’ihi na tupu nwata ahụ amata otú e si akpọ ‘Papa’ na ‘Mama,’ a ga-ebugara eze Asiria akụ̀ Damaskọs na ihe a kwatara na Sameria.”+  Jehova gwakwara m, sị:   “Ebe ọ bụ na ndị a ajụla mmiri Shaịloa* nke na-asọ nwayọọ nwayọọ,+Na-achịkwa Rizin na nwa Remalaya ọchị,+   Jehova ga-eziteEze Asiria+ na ebube ya niile ka ọ lụso ha agha. Eze a na ndị agha ya ga-abịa ngwa ngwaOtú nnukwu mmiri bụ́ Osimiri Yufretis si eto,Tochie ebe niile, sọrọ pụta n’elu ala,   Sọrọkwa gafee Juda. Ọ ga-etoju ebe niile na Juda, na-eru mmadụ n’olu, sọrọkwa na-aga.+ Ọ ga-eju ebe niile n’alaGịnwa bụ́ Ịmanuel.”*+   Merụọnụ ha ahụ́, unu ndị dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị, unu ndị niile nọ n’ebe ndị dị anya n’ụwa! Jikerenụ agha,* ma a ga-etipịa unu!+ Jikerenụ agha, ma a ga-etipịa unu! 10  Meenụ atụmatụ, ma a ga-akụghasị ya! Kpaanụ ụdị nkata ọ bụla, ma ọ gaghị enwe isi,N’ihi na Chineke nọnyeere anyị!*+ 11  Mgbe Jehova na-agwa m okwu, ọ tụkwasịrị m aka ya siri ike, gwakwa m ka m ghara ịkpa àgwà ka ndị a. Ọ gwara m, sị: 12  “E nwee ihe ọ bụla ndị a kpọrọ mgba okpuru, unu esola ha akpọ ihe ahụ mgba okpuru. Unu atụkwala egwu ihe ha na-atụ egwu. Unu amakwala jijiji n’ihi ya. 13  Chetanụ na ọ bụ naanị Jehova nke ụsụụ ndị agha dị nsọ.+ Ọ bụ ya ka unu kwesịrị ịna-atụ egwu,Ọ bụ ya kwesịrị ime ka unu na-ama jijiji.”+ 14  Ọ ga-adị ka ụlọ nsọ,Ma ọ ga-aghọrọ alaeze abụọ dị n’IzrelNkume na-akpọbi mmadụ ụkwụ+Na oké nkume na-akwada mmadụ. Ọ ga-aghọkwara ndị bi na JeruselemIgbudu na ọnyà. 15  Ọtụtụ n’ime ha ga-azọhie ụkwụ daa, merụọkwa ahụ́. A ga-amata ha n’ọnyà, jidekwa ha. 16  Pịachie ihe ahụ i dere.* Zoo iwu* ahụ e nyere ndị na-eso ụzọ m. 17  M ga na-atụ anya Jehova,+ onye kpuchiri ihu ya ka ezinụlọ Jekọb ghara ịhụ ya.+ M ga-enwe olileanya na ya. 18  Leenụ mụ na ụmụ Jehova nyere m.+ Anyị bụ ọrụ ebube, bụrụkwa ihe na-egosi ndị Izrel ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, onye bi n’Ugwu Zayọn, zubeere ha.+ 19  Ọ bụrụ na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ma ọ bụ ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase, bụ́ ndị na-ebe ubé ka nnụnụ, na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ùnu kwesịrị ime ihe ha kwuru? Ọ́ bụghị Chi ndị obodo ọ bụla ka ndị obodo ahụ kwesịrị ịna-ajụ ase? Ùnu kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase gbasara ndị dị ndụ?+ 20  Mba, kama unu kwesịrị isi n’iwu Chineke nakwa n’ihe ndị ọzọ o kwuru* mata ihe unu chọrọ ịmata. Ọ bụrụ na ihe ha na-ekwu abụghị ihe Chineke kwuru, ha enweghị ihe na-enye ha ìhè.+ 21  Ihe ga-esiri onye ọ bụla na-agafe n’obodo a ike. Agụụ ga na-agụkwa ya.+ N’ihi iwe juru ya obi maka agụụ na-agụ ya, ọ ga-eleli anya elu kparịa ma eze ya ma Chineke ya. 22  Ọ ga-elekwa anya n’ụwa, ma naanị ihe ọ ga-ahụ bụ nsogbu na ọchịchịrị, ihe na-emenye mmadụ ụjọ na ihe isi ike, ihe mgbu na itiri.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ na Meha-shalal-hash-baz pụtara “Ịgbaga Ngwa Ngwa n’Ebe A Ga-akwata Ihe, Ịbịa Ngwa Ngwa n’Ebe A Ga-akwakọrọ Ihe.”
Na Hibru, “mkpịsị akwụkwọ mmadụ.”
Ma ọ bụ “gbaa akaebe.”
Na Hibru, “M wee garuo onye amụma nwaanyị nso.”
Shaịloa bụ okpo mmiri.
Ma ọ bụ “Keenụ ájị̀ n’ume.”
Okwu Hibru bụ́ Ịmanuel pụtara “Chineke nọnyeere anyị.” Gụọ Aịza. 7:14; 8:8.
Ma ọ bụ “ihe akaebe ahụ.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “n’ihe akaebe ahụ.”