Abụ Ọma 118:1-29

  • Ọbụ abụ kelere Jehova na o meriela

    • ‘M kpọkuru Jaa, ya aza m’ (5)

    • “Jehova nọnyeere m” (6, 7)

    • Nkume a jụrụ ajụ ga-aghọ nkume ji ụlọ (22)

    • “Onye na-abịa n’aha Jehova” (26)

118  Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+ Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   Ka ndị Izrel kwuo, sị: “Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”   Ka ndị ezinụlọ Erọn kwuo, sị: “Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”   Ka ndị na-atụ egwu Jehova kwuo, sị: “Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”   M kpọkuru Jaa* n’oge m na-ata ahụhụ. Jaa zara m wee kpọba m ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*+   Jehova nọnyeere m. Agaghị m atụ egwu.+ Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?+   Jehova nọnyeere m. Ọ bụ ya na-enyere m aka.*+ M ga na-ele ndị kpọrọ m asị anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+   Ọ ka mma ịgbaba n’ime JehovaKama ịtụkwasị mmadụ obi.+   Ọ ka mma ịgbaba n’ime JehovaKama ịtụkwasị ndị isi obi.+ 10  Mba niile gbara m gburugburu,Ma ọ bụ aha JehovaKa m ji chụọ ha ọsọ.+ 11  Ha gbara m gburugburu. N’eziokwu, ha gbara m nnọọ gburugburu. Ma ọ bụ aha JehovaKa m ji chụọ ha ọsọ. 12  Ha gbara m gburugburu ka aṅụ,Ma a lara ha n’iyi ngwa ngwa otú ọkụ si erechapụ osisi ogwu ngwa ngwa. Ọ bụ aha JehovaKa m ji chụọ ha ọsọ.+ 13  A kwasiri* m aka ike ka m daa,Ma Jehova nyeere m aka. 14  Jaa bụ ebe mgbaba m na ike m,Ọ bụkwa ya na-azọpụta m.+ 15  Mkpu ọṅụ na mkpu mmeri*Na-ada n’ụlọikwuu ndị ezi omume. Aka nri Jehova na-akpa ike.+ 16  Jehova weliri aka nri ya maka na o meriela. Aka nri Jehova na-akpa ike.+ 17  Agaghị m anwụ, kama m ga-adị ndụ,Ka m wee kọsaa ọrụ dị iche iche Jaa na-arụ.+ 18  Jaa dọsiri m aka ná ntị ike,+Ma o kweghị ka m nwụọ.+ 19  Megheerenụ m ọnụ ụzọ ámá ezi omume.+ M ga-esi na ya banye too Jaa. 20  Ọ bụ ọnụ ụzọ ámá Jehova. Ndị ezi omume ga-esi na ya gafere.+ 21  M ga-eto gị n’ihi na ị zara m,+Ọ bụkwa gị zọpụtara m. 22  Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụAghọọla nkume ji ụlọ.+ 23  Ihe a si n’aka Jehova.+ Ọ dị ebube n’anya anyị.+ 24  Taa bụ ụbọchị Jehova wepụtara. Anyị ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ na ya. 25  Jehova, biko, anyị na-arịọ gị, zọpụta anyị. Jehova, biko, mee ka anyị merie. 26  Onye na-abịa n’aha Jehova bụ onye a gọziri agọzi.+ Anyị si n’ụlọ Jehova na-agọzi unu. 27  Jehova bụ Chineke. Ọ na-enye anyị ìhè.+ Jirinụ alaka osisi soro ndị na-eme ememme kwụrụ n’ahịrị.+ Garuonụ n’ebe ịchụàjà.*+ 28  Ị bụ Chineke m. M ga-eto gị. Chineke m, m ga-aja gị mma.+ 29  Keleenụ Jehova+ n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ebe sara mbara.”
O nwere ike ịbụ, “ya na ndị na-enyere m aka.”
O nwere ike ịbụ, “Ị kwasiri.”
Ma ọ bụ “mkpu nzọpụta.”
Na Hibru, “na mpi ebe ịchụàjà.” Gụọ Nkọwa Okwu.