Abụ Ọma 124:1-8
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
124 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị,”+Ka ndị Izrel kwuo, sị,
2 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị+Mgbe ndị mmadụ lụsoro anyị ọgụ,+
3 Ha gaara eloda anyị ná ndụ+Mgbe ha na-ewesa anyị iwe dị ọkụ.+
4 Mmiri gaara eburu anyị.
Iyi gaara eburu anyị* bufuo.+
5 Mmiri na-enugharị n’ike n’ike gaara erikpu anyị.*
6 Ka e too JehovaN’ihi na o nyefeghị anyị n’aka ha ka ha jiri ezé tagbuo anyị ka anụ oriri.
7 Anyị* dị ka nnụnụNke si n’ọnyà dinta fepụ.+
E mebiri ọnyà ahụ,Anyị wee gbapụ.+
8 Ọ bụ Chineke, onye aha ya bụ Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,Na-enyere anyị aka.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi anyị.”