Abụ Solomọn 2:1-17
2 “Abụ m okooko safrọn nke puru n’ụsọ oké osimiri,Abụ m okooko lili nke puru na ndagwurugwu.”+
2 “Otú ahụ okooko lili na-adị n’etiti ahịhịa ogwu,Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwaanyị.”
3 “Otú ahụ osisi apụl na-adị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa,Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.
Ọ na-agụsi m ike ka m nọrọ na ndò ya,Mkpụrụ osisi ya na-atọkwa m ụtọ.
4 Ọ kpọbatara m n’ụlọ oriri,*Mmadụ niile na-ahụkwa na ọ bụ m ka ọ hụrụ n’anya.
5 Nyenụ m achịcha mkpụrụ vaịn na apụl ka m taa;+Ka obi dị m ụtọ, ka m wee nweta ume,N’ihi na anaghị m enweta onwe m maka na onye m hụrụ n’anya anọghị m nso.
6 M tụkwasịrị isi m n’aka ekpe ya,O konyekwara m aka nri ya.+
7 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele+ na nne mgbada bi n’ọhịaNa-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyiNa unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.+
8 Anụrụ m olu onye m hụrụ n’anya.
Lee, ọ bịawala.
Ọ na-arị ugwu ukwu, na-awụkwa ọsọ n’ugwu nta.
9 Onye m hụrụ n’anya yiri ele. O yiri oké mgbada.+
Lee, o guzo n’azụ mgbidi anyị.
O si na windo na-ele anya.
O si na mpio ụlọ na-enyobata anya.
10 Onye m hụrụ n’anya kwuru okwu. Ọ sịrị m:
‘Ọdị m n’obi, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
11 Lee, oge oyi* agafeela.
Mmiri akwụsịla izo, mmiri alaala.
12 Okooko awaala n’ọhịa.+
Oge e ji akwacha osisi vaịn eruola,+A nụwakwala ubé nduru n’ala anyị.+
13 Mkpụrụ mbụ osisi fig mịrị achaala.+
Osisi vaịn amaala ifuru, na-esikwa ísì ọma.
Onye m hụrụ n’anya, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
14 Nduru m, ka m hụ gị ma nụ olu gị+N’ebe zoro ezo ná nnukwu nkume,+N’ebe zoro ezo n’ọnụ ọnụ ugwu,N’ihi na olu gị dị ụtọ, ị makwara mma.’”+
15 “Jiderenụ anyị nkịta ọhịa,Ụmụ nkịta ọhịa ndị na-emebisị ubi vaịn,N’ihi na ubi vaịn anyị amaala ifuru.”
16 “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.+
Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili dị.+
17 Tupu oge ikuku ji eku eruo,* tupu onyinyo alakpuo,Onye m hụrụ n’anya, lọta ọsọ ọsọKa ele+ ma ọ bụ oké mgbada+ nke nọ n’ugwu ndị dị n’agbata anyị abụọ.*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’ụlọ mmanya.”
^ Ma ọ bụ “udu mmiri.”
^ Na Hibru, “Tupu ụbọchị ekuwe ume.”
^ Ma ọ bụ “n’ugwu Beta.”