Ozi Ọma Jọn Dere 19:1-42

  • A pịara Jizọs ihe, jirikwa ya mee ihe ọchị (1-7)

  • Paịlet jụrụ Jizọs ajụjụ ọzọ (8-16a)

  • A kpọgidere Jizọs n’osisi na Gọlgọta (16b-24)

  • Jizọs nyefere nne ya n’aka onye na-eso ụzọ ya (25-27)

  • Ọnwụ Jizọs (28-37)

  • Olili Jizọs (38-42)

19  Paịlet wee kpọrọ Jizọs pịa ya ihe.+  Ndị agha ji ogwu kpaa okpueze ma kpuwe ya Jizọs n’isi. Ha yiwekwara ya uwe na-acha pọpụl.+  Ha wee na-abịakwute ya, na-asị: “Eze ndị Juu, ndeewo.” Ha nọkwa na-ama ya ụra n’ihu.+  Paịlet pụrụ n’èzí ọzọ, sị ha: “Lee, m na-akpọpụtara unu ya n’èzí ka unu mara na e nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+  Jizọs wee pụta n’èzí. O kpu okpueze ahụ e ji ogwu kpaa, yirikwa uwe elu ahụ na-acha pọpụl. Paịlet sịrị ha: “Leenụ nwoke ahụ!”  Ma, mgbe ndị isi nchụàjà na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi! Kwụwa ya n’osisi!”*+ Paịlet wee sị ha: “Kpọrọnụ ya, jirinụ aka unu gbuo ya* n’ihi na e nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+  Ndị Juu wee sị ya: “Anyị nwere iwu. Iwu ahụ kwukwara na o kwesịrị ịnwụ+ n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.”+  Mgbe Paịlet nụrụ ihe ha na-ekwu, ụjọ tụkwuru ya.  O wee banye ọzọ n’ụlọ ya* ma sị Jizọs: “Ebee ka i si bịa?” Ma Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla.+ 10  Paịlet wee sị ya: “Ị́ chọghị ịtụpụrụ m ọnụ? Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike igbu gị?”* 11  Jizọs zara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya. Ọ bụ ya mere mmehie onye nyefere m n’aka gị ji ka nke gị.” 12  N’ihi ya, Paịlet chọwara otú ọ ga-esi hapụ ya. Ma ndị Juu tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla na-eme onwe ya eze na-ekwugide* Siza.”+ 13  Mgbe Paịlet nụchara ihe ha kwuru, ọ kpọpụtara Jizọs n’èzí ma nọdụ ala n’oche ikpe dị n’ebe e ji nkume wụọ ala ya. A na-akpọ ebe ahụ Gabata n’asụsụ Hibru. 14  Ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe Ememme Ngabiga.*+ Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke isii.* O wee gwa ndị Juu, sị: “Leenụ eze unu!” 15  Ma ha tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kwụwa ya n’osisi!”* Paịlet sịrị ha: “Ọ̀ bụ m gbuo eze unu?” Ndị isi nchụàjà wee sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ́ bụghị Siza.” 16  O nyefeziri Jizọs n’aka ha ka e gbuo ya n’elu osisi.+ Ha wee kpọrọ ya pụọ. 17  Jizọs buuru osisi ịta ahụhụ* gawa ebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi.+ A na-akpọ ya Gọlgọta n’asụsụ Hibru.+ 18  Ha kpọgidere ya n’osisi n’ebe ahụ,+ ya na ụmụ nwoke abụọ ọzọ. Otu onye nọ ya n’otu akụkụ, onye nke ọzọ anọrọ n’akụkụ ya nke ọzọ, Jizọs anọrọ n’etiti.+ 19  E nwekwara ihe Paịlet dere ma kụgide ya n’osisi ịta ahụhụ* ahụ. Ihe o dere bụ: “Jizọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.”+ 20  Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe ahụ o dere n’ihi na ebe a kpọgidere Jizọs n’osisi dị nso n’obodo. E dere ya n’asụsụ Hibru, n’asụsụ Latịn, nakwa n’asụsụ Grik. 21  Ma, ndị isi nchụàjà ndị Juu gwara Paịlet, sị: “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama dee na ọ sịrị, ‘Abụ m Eze ndị Juu.’” 22  Paịlet wee sị: “Edeela m ihe m dere.” 23  Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya ma kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha. Ha chịkwaara uwe ime ya. Ma uwe ime ya enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa si n’elu ruo n’ala. 24  Ha gwara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị fee nza iji mata onye ọ ga-abụ nke ya.”+ Ihe a bụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe m, ha fekwaara uwe m nza.”+ Ndị agha ahụ mere ihe ndị a n’eziokwu. 25  Ma nne Jizọs,+ nwanne nne Jizọs nke nwaanyị, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin+ guzo n’akụkụ osisi ịta ahụhụ* Jizọs. 26  Mgbe Jizọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ n’anya+ ka ha guzo nso, ọ sịrị nne ya: “Nwaanyị, lee nwa gị.” 27  Ọ gwakwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, sị: “Lee nne gị.” Malite n’oge ahụ gawa, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa n’ụlọ ya. 28  Mgbe ihe a mechara, Jizọs ma ugbu a na ihe niile emechaala. O wee sị: “Mmiri na-agụ m.”+ O kwuru ihe a ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo. 29  Otu ite nke mmanya gbara ụka juru dọ n’ebe ahụ. Ha wee tinye ogbo na mmanya ahụ gbara ụka, tụkwasị ya n’okporo osisi hisop,* welie ya elu ka o ruo ya n’ọnụ.+ 30  Mgbe Jizọs detụrụ mmanya ahụ gbara ụka ọnụ, ọ sịrị: “E mechaala ya.”+ O hulataziri isi kubie ume.+ 31  Ebe ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike,+ ndị Juu achọghị ka ozu ha dịrị n’elu osisi ịta ahụhụ+ n’Ụbọchị Izu Ike (n’ihi na Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ nke ukwu).+ N’ihi ya, ha rịọrọ Paịlet ka a kụjisịa ha ụkwụ ma bupụ ozu ha. 32  Ndị agha ahụ wee bịa kụjisịa ụkwụ onye nke mbụ nakwa ụkwụ onye nke abụọ a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi. 33  Ma mgbe ha rutere n’ebe Jizọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọla. N’ihi ya, ha akụjisịghị ya ụkwụ. 34  Ma otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ.+ Ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara. 35  Ọ bụ onye hụrụ ihe ndị a gbara àmà a, àmà ya bụkwa eziokwu. Ọ makwa na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ka unu wee kwerekwa.+ 36  N’eziokwu, ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “E nweghị ọkpụkpụ ya a ga-agbaji.”*+ 37  Ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ: “Ha ga-elegide onye ha mara ube anya.”+ 38  Mgbe ihe ndị a mechara, Josef onye Arimatia rịọrọ Paịlet ka ya buru ozu Jizọs. Ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma ọ na-ezo ya ezo n’ihi na ọ na-atụ egwu ndị Juu.+ Paịlet wee nye ya ikike, ya abịa buru ozu Jizọs.+ 39  Nikọdimọs,+ onye bịakwuteburu Jizọs n’abalị, bịakwara. O wetara ngwugwu mea na ihe otite alo nke dị ihe dị ka otu narị paụnd* n’arọ.+ 40  Ha wee buru ozu Jizọs ma kee ya ákwà linin e tinyere ihe ndị ahụ na-esi ísì ọma,+ otú ndị Juu si akwadebe ozu a chọrọ ili. 41  E nwere ubi dị n’ebe ahụ e gburu ya.* N’ubi ahụ, e nwere otu ili* ọhụrụ+ a na-elitụbeghị onye ọ bụla na ya. 42  Ebe ọ bụ ụbọchị ndị Juu ji akwadebe ememme,+ ha liri Jizọs n’ebe ahụ n’ihi na ili ahụ dị nso.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi! Gbuo ya n’elu osisi!”
Ma ọ bụ “gbuo ya n’elu osisi.”
Ya bụ, “n’ụlọ gọvanọ.”
Ma ọ bụ “igbu gị n’elu osisi.”
Ma ọ bụ “na-emegide.”
Ihe a bụ nkwadebe a na-eme maka Ememme Ngabiga e ji otu izu eme. A na-emekwa Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko n’izu ahụ.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”
Ma ọ bụ “a ga-egweri.”
Ya bụ, paụnd ndị Rom. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e gburu ya n’elu osisi.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”