Jenesis 13:1-18
13 Ebram wee si n’Ijipt kwapụ gawa Negeb,*+ ya na nwunye ya na ihe niile o nwere, nakwa Lọt.
2 Ebram nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ọlaọcha na ọlaedo.+
3 Ka o si na Negeb na-aga Betel, ọ nọ na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ruo mgbe o rutere n’ebe ọ maburu ụlọikwuu n’agbata Betel na E-aị.+
4 Ebe ahụ bụ ebe ọ rụburu ebe ịchụàjà. Ebram kpọkuru aha Jehova n’ebe ahụ.
5 Lọt, onye ya na Ebram so na-aga, nwekwara atụrụ, ehi, na ụlọikwuu.
6 N’ihi ya, ala ahụ abaghị ha niile. Akụnụba ha ehiela nne nke na ha enweghị ike ibikọta ọnụ.
7 Ihe a meziri ka ndị na-azụrụ Ebram anụ ụlọ na ndị na-azụrụ Lọt anụ ụlọ sewe okwu. (N’oge ahụ, ndị Kenan na ndị Perizaịt bi n’ala ahụ.)+
8 Ebram wee sị Lọt:+ “Biko, mụ na gị ekwesịghị ise okwu, ndị na-azụrụ m anụ na ndị na-azụrụ gị anụ ekwesịghịkwa ịna-ese okwu, maka na mụ na gị bụ nwanne.
9 I nwere ike ịhọrọ ebe ọ bụla dị gị mma n’ala a. Biko, kwaga ebe ọzọ. Ị gaa n’aka ekpe, m ga-aga n’aka nri. Ma ọ bụrụ na ị gaa n’aka nri, m ga-aga n’aka ekpe.”
10 Lọt wee legharịa anya malite ná mpaghara Osimiri Jọdan+ niile ruo Zoa.+ Ọ hụrụ na mmiri na-ede ógbè ahụ niile nke ọma (tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra), hụkwa na ọ dị ka ubi Jehova kụrụ,+ ka ala Ijipt.
11 Lọt wee họrọ mpaghara Osimiri Jọdan ahụ niile. Lọt gara maa ụlọikwuu ya n’ebe ọwụwa anyanwụ. Otú ahụ ka ha abụọ si biri iche iche.
12 Ebram bi na Kenan, ma Lọt bi n’obodo ndị dị ná mpaghara Osimiri Jọdan.+ N’ikpeazụ, Lọt mara ụlọikwuu ya n’ebe dị nso na Sọdọm.
13 Ndị Sọdọm bụ ndị ọjọọ, ha na-emehiekwa Jehova nke ukwuu.+
14 Mgbe Lọt kwapụchara, Jehova gwara Ebram, sị: “Biko, si n’ebe ị nọ lee anya n’ebe ugwu, n’ebe ndịda, n’ebe ọwụwa anyanwụ, nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ,
15 n’ihi na ọ bụ gị na ụmụ* gị ka m ga-enye ala a niile ị na-ahụ ka ọ bụrụ nke unu mgbe niile.+
16 M ga-emekwa ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka ájá dị n’ala. Otú ahụ a na-enweghị ike ịgụta ájá dị n’ala ọnụ ka a na-agaghị enwe ike ịgụta ụmụ* gị ọnụ.+
17 Bilie, gagharịa n’ala a. Gaa ya gburugburu n’ihi na ọ bụ gị ka m ga-enye ya.”
18 Ebram nọ na-ebi n’ụlọikwuu. Mgbe e mechara, ọ bịara biri n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na Mamri,+ bụ́ ndị dị na Hebrọn.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
^ Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”