Jenesis 19:1-38

  • Ndị mmụọ ozi gara n’ụlọ Lọt (1-11)

  • A gwara Lọt na ezinụlọ ya ka ha gbapụ (12-22)

  • E bibiri Sọdọm na Gọmọra (23-29)

    • Nwunye Lọt ghọrọ ogidi nnu (26)

  • Lọt na ụmụ ya (30-38)

    • Ebe obodo Moab na Amọn si (37, 38)

19  Ndị mmụọ ozi abụọ ahụ rutere Sọdọm ná mgbede. N’oge ahụ, Lọt nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá Sọdọm. Mgbe Lọt hụrụ ha, o biliri gaa izute ha, ọ kpọkwara isiala.+  Ọ sịrị ha: “Ndị nwe m, biko, batanụ n’ụlọ ohu unu, nọrọkwanụ ruo mgbe chi bọrọ, ka a saakwa unu ụkwụ, echi unu ebilie n’isi ụtụtụ gawa ebe unu na-aga.” Ha wee sị: “Mba, anyị ga-arahụ n’ámá obodo.”  Ma ọ rịọsiri ha arịrịọ ike, ha esorozie ya banye n’ụlọ ya. O wee siere ha ezigbo nri, meekwa achịcha na-ekoghị eko, ha erie.  Tupu ha alakpuo, ụmụ nwoke niile nọ n’obodo Sọdọm, ma nwata ma okenye, nuuru n’ìgwè bịa gbaa ụlọ ahụ gburugburu.  Ha nọ na-akpọ Lọt, na-asị ya: “Olee ebe ụmụ nwoke ndị ahụ bịakwutere gị n’abalị a nọ? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha nwee mmekọahụ.”+  Lọt wee pụkwuru ha n’ọnụ ụzọ, ma ọ kpọchiri ụzọ mgbe ọ pụrụ.  Ọ sịrị ha: “Bikonụ, ụmụnne m, unu emela ihe na-adịghị mma.  Bikonụ, m nwere ụmụ nwaanyị abụọ ha na nwoke na-enwebeghị mmekọahụ. Biko, ka m kpọpụtara unu ha ka unu mee ha ihe ọ bụla dị unu mma. Ma unu emela ụmụ nwoke a ihe ọ bụla, n’ihi na ha abatala n’ụlọ m ka m chebe ha.”+  Ha wee sị ya: “Pụọrọ anyị n’ụzọ!” Ha sịkwara: “Onye mbịarambịa a bịara biri ebe a, ma ụjọ anaghị atụ ya ikpe anyị ikpe. Ihe anyị ga-eme gị ugbu a ga-adị njọ karịa ihe anyị ga-eme ụmụ nwoke ahụ.” Ha wee nuru gakwuru Lọt, na-achọ ka ha kwakaa ibo ụzọ ahụ. 10  Ụmụ nwoke abụọ ahụ wee wepụta aka ha sebata Lọt n’ime ụlọ, ha mechikwara ụzọ. 11  Ma ha mere ka ụmụ nwoke ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ kpuo ìsì, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, nke mere na ike gwụrụ ha ebe ha nọ na-achọ ọnụ ụzọ ahụ. 12  Ụmụ nwoke abụọ ahụ sịziri Lọt: “È nwere onye ọzọ i nwere n’ebe a? Kpọrọ ha niile si n’obodo a pụọ, ma ndị ọgọ gị nwoke ma ụmụ gị ndị nwoke ma ụmụ gị ndị nwaanyị ma ndị ikwu gị niile bi n’obodo a! 13  N’ihi na anyị ga-ebibi ebe a, maka na Jehova anụla ihe ọjọọ a na-ekwu na ndị obodo a na-eme.+ Ọ bụ ya mere Jehova ji zite anyị ka anyị bịa bibie obodo a.” 14  N’ihi ya, Lọt gara na-agwa ndị ọgọ ya nwoke, bụ́ ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya ndị nwaanyị, sị: “Ngwanụ! Ka anyị sinụ n’ebe a pụọ n’ihi na Jehova ga-ebibi obodo a!” Ma ndị ọgọ ya nwoke weere ya na ọ na-egwu egwu.+ 15  Mgbe chi bọwara, ndị mmụọ ozi ahụ malitere ịgwa Lọt ka o mee ngwa ngwa. Ha sịrị ya: “Mee ngwa ngwa! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị nwaanyị abụọ ndị gị na ha nọ n’ebe a pụọ, ka a ghara ibibi unu mgbe a na-ebibi ndị obodo a maka mmehie ha!”+ 16  Mgbe ọ nọ na-egbu oge, Jehova meere ha ebere.+ Ụmụ nwoke ahụ wee dọkpụrụ ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n’aka ma kpọrọ ha kpọpụ n’obodo ahụ.+ 17  Ozugbo ha kpọgara ha ná mpụga obodo ahụ, otu n’ime ha sịrị ya: “Gbalaga maka ndụ gị! Elela anya n’azụ,+ akwụrụkwala n’ebe ọ bụla n’ógbè ahụ!+ Gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu ka a ghara ibibi gị!” 18  Lọt wee sị ha: “Biko, Jehova, ka m ghara ịgbaga ebe ahụ. 19  Biko, ihe ohu gị masịrị gị, i mekwaara m ebere na-enweghị atụ* wee dowe m ndụ.+ Ma agaghị m enwe ike ịgbaga n’ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu n’ihi na ụjọ na-atụ m na ọdachi ga-adakwasị m, mụ anwụọ.+ 20  Obodo a dị nso. Biko, ka m gbaga na ya. Ọ bụghị nnukwu obodo. Biko, ka m gbaga na ya. Ọ bụghị nnukwu obodo. M gbaga na ya, e nweghị ihe ga-eme m.” 21  Chineke* wee sị ya: “Ọ dị mma, m ga-emekwara gị ihe a ị rịọrọ.+ Agaghị m ebibi obodo a i kwuru okwu ya.+ 22  Mee ọsọ ọsọ! Gbaga n’ebe ahụ, n’ihi na agaghị m eme ihe ọ bụla ruo mgbe i ruru n’ebe ahụ!”+ Ọ bụ ya mere o ji kpọọ obodo ahụ Zoa.*+ 23  Anyanwụ awaala mgbe Lọt rutere n’obodo Zoa. 24  Jehova wee mee ka sọlfọ* na ọkụ zoo na Sọdọm na Gọmọra. Ọ bụ Jehova si n’eluigwe zite ọkụ ahụ.+ 25  O wee laa obodo ndị a n’iyi. Ọ lara ógbè ahụ niile n’iyi, ma ndị niile bi n’obodo ndị ahụ ma ihe ndị a kụrụ n’ala ndị ahụ.+ 26  Ma nwunye Lọt nọ n’azụ Lọt. O lere* anya n’azụ, o wee ghọọ ogidi nnu.+ 27  Ebreham biliri n’isi ụtụtụ gaa n’ebe ọ kwụbu mgbe ya na Jehova kwuru okwu.+ 28  Mgbe o ledara anya lee Sọdọm na Gọmọra na ala niile dị n’ógbè ahụ, ihe ọ hụrụ tụrụ ya egwu. Nnukwu anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ na-akwụgo elu. Ọ dị ka nnukwu anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú.+ 29  Mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị n’ógbè ahụ, Chineke chetara Ebreham wee mee ka Lọt pụọ n’obodo ndị ahụ o bibiri, bụ́ ebe Lọt bibu.+ 30  Mgbe e mechara, Lọt na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ si na Zoa kwapụ gaa biri n’ebe bụ́ ugwu ugwu+ maka na ụjọ ibi na Zoa+ na-atụ ya. Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ wee biri n’ọgba. 31  Nke ada gwara nke obere, sị: “Nna anyị emeela agadi, e nweghịkwa nwoke bi n’ala a anyị na ya ga-enwe mmekọahụ otú e si eme n’ebe niile n’ụwa. 32  Bịa ka anyị nye nna anyị mmanya ka ọ ṅụọ, ka anyị na ya nwee mmekọahụ* ka anyị wee si n’aka nna anyị mụta ụmụ.” 33  Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụ. Nke ada wee banye, ya na nna ya enwee mmekọahụ,* ma nna ya amaghị mgbe o dinara na mgbe o biliri. 34  N’echi ya, nke ada sịrị nke obere: “Mụ na nna m nwere mmekọahụ n’abalị ụnyaahụ. Ka anyị nyekwa ya mmanya n’abalị a. Ị ga-abanyezi ka gị na ya nwee mmekọahụ, ka anyị wee si n’aka nna anyị mụta ụmụ.” 35  Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụ. Nke obere banyere, ya na nna ya enwee mmekọahụ, ma nna ya amaghị mgbe o dinara na mgbe o biliri. 36  Lọt wee tụwa ụmụ ya abụọ ime. 37  Nke ada mụrụ nwa nwoke wee gụọ ya Moab.+ Ọ bụ ya bụ nna ndị Moab ndị nọ taa.+ 38  Nke obere mụkwara nwa nwoke wee gụọ ya Ben-amị. Ọ bụ ya bụ nna ndị Amọn+ ndị nọ taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “i gosikwara m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ya bụ, mmụọ ozi ahụ nke na-anọchite anya Chineke.
Zoa pụtara “Obere.”
Okwu a sụgharịrị sọlfọ ebe a pụtara ụdị nkume na-ere ọkụ.
Ma ọ bụ “Ọ nọ na-ele.”
Na Hibru, “dinaa.”
Na Hibru, “edinaa.”