Jenesis 44:1-34
44 Mgbe e mechara, Josef nyere onye na-elekọta ụlọ ya iwu, sị: “Kponye ihe oriri n’akpa ụmụ nwoke ahụ otú ha ga-ebuli, tinyekwa ego onye nke ọ bụla n’ọnụ akpa ya.+
2 Ma ị ga-etinye iko m, ya bụ, iko ọlaọcha m, n’ọnụ akpa nke ọdụdụ nwa, ya na ego o ji bịa ịzụ ọka.” O wee mee ihe Josef gwara ya.
3 Mgbe chi bọrọ n’ụtụtụ, a hapụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha akpụrụ jakị ha lawa.
4 Mgbe ọ na-adịchabeghị anya ha hapụrụ obodo ahụ, Josef gwara onye na-elekọta ụlọ ya, sị: “Bilie! Chụwa ụmụ nwoke ndị ahụ. Ị chụkwuru ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji jiri ihe ọjọọ kwụọ nna m ukwu ụgwọ ihe ọma?
5 Gịnị mere unu ji were iko nna m ukwu ji aṅụ mmanya, nke o jikwa amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ihe a unu mere bụ ihe ọjọọ.’”
6 Onye na-elekọta ụlọ Josef wee chụkwuru ha ma gwa ha ihe a.
7 Ma ha sịrị ya: “Gịnị mere onyenwe m ji ekwu ụdị ihe a? Ndị ohu gị agaghị anwa anwa eme ụdị ihe a.
8 Ọ̀ kwa anyị si na Kenan weghachiri gị ego anyị hụrụ n’ọnụ akpa anyị?+ Oleezi otú anyị ga-esi zuru ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo n’ụlọ nna gị ukwu?
9 Ka e gbuo onye ọ bụla n’ime ndị ohu gị a hụrụ ya n’akpa ya, ndị fọrọ n’ime anyị ga-abụkwara nna m ukwu ndị ohu.”
10 O wee sị ha: “Ka ọ dị otú unu kwuru: Onye a hụrụ ya n’akpa ya ga-abụ ohu m, ma a ga-ewere ndị fọrọ n’ime unu ka ndị aka ha dị ọcha.”
11 N’ihi ya, onye nke ọ bụla n’ime ha buturu akpa ya ọsọ ọsọ ma meghee ya.
12 Ọ chọrọ iko ahụ nke ọma. Ọ malitere n’akpa nke okenye wee kwụsị na nke ọdụdụ nwa. N’ikpeazụ, a hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin.+
13 Ha wee dọwaa ákwà ha. Onye nke ọ bụla n’ime ha buuru ibu ya dọkwasị n’elu jakị ya. Ha wee laghachi n’obodo ahụ.
14 Mgbe Juda+ na ụmụnne ya banyere n’ụlọ Josef, ọ ka nọ n’ebe ahụ. Ha wee daara ya n’ala.+
15 Josef sịrị ha: “Gịnị mere unu ji mee ihe a? Ọ̀ bụ na unu amaghị na nwoke dị ka m na-amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu?”+
16 Juda zara ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-agwa nna m ukwu? Gịnị ka anyị ga-ekwu? Oleekwa otú anyị ga-esi gosi na anyị bụ ndị ezi omume? Ọ bụ ezi Chineke na-akwụ ndị ohu gị ụgwọ mmehie ha.+ Anyị bụzi ndị ohu nna m ukwu, ma anyịnwa ma onye a hụrụ iko a n’akpa ya.”
17 Ma Josef sịrị: “Agaghị m anwa anwa mee otú a. Ọ bụ onye a hụrụ iko a n’akpa ya ga-abụ ohu m.+ Ma ndị nke ọzọ n’ime unu, lawanụ n’udo lakwuru nna unu.”
18 Juda gara ya nso, sị ya: “Nna m ukwu, m na-arịọ gị arịrịọ. Biko, ka ohu gị gwatụ gị okwu. Ewesala ohu gị iwe, n’ihi na gị na Fero bụ otu.+
19 Nna m ukwu jụrụ ndị ohu ya, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ? Ùnu nwere nwanne nwoke ọzọ?’
20 N’ihi ya, anyị zara nna m ukwu, sị, ‘Ee, nna anyị ka nọ ndụ. O meela agadi. Anyị nwekwara nwanne nwoke nke nna anyị mụrụ n’agadi ya, bụ́ ọdụdụ nwa ya.+ Ma onye nne ji ya na ya anwụọla.+ Ọ bụ naanị ya fọrọ n’ime ha,+ nna ya hụkwara ya n’anya.’
21 Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Kpọtaranụ m ya ka m hụ ya.’+
22 Ma anyị gwara nna m ukwu, sị, ‘Nwa ahụ agaghị ahapụli nna ya. Nna ya ga-anwụ ma ọ hapụ ya.’+
23 Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Ọ bụrụ na nwanne unu nke ọdụdụ agaghị eso unu bịa, unu abịakwala ịhụ m ọzọ.’+
24 “N’ihi ya, anyị lakwuuru ohu gị nna m kọọrọ ya ihe nna m ukwu kwuru.
25 Mgbe e mechara, nna anyị sịrị anyị, ‘Gaghachinụ zụta obere ihe oriri anyị ga-eri.’+
26 Ma anyị sịrị ya, ‘Anyị agaghị aga. Ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ ga-eso anyị, anyị ga-aga, maka na nwoke ahụ agaghị ekwe ka anyị hụ ya ma ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ esoghị anyị.’+
27 Ohu gị nna m gwaziri anyị, sị, ‘Unu ma nke ọma na nwunye m mụụrụ m naanị ụmụ nwoke abụọ.+
28 Ma, otu n’ime ha anọghịzi. M wee sị: “Ọ ga-abụrịrị na anụ ọhịa adọriela ya!”+ Ahụbeghịkwa m ya ruo ugbu a.
29 Ọ bụrụ na unu akpọrọkwa onye nke a pụọ, ihe emee ya, ya anwụọ, unu ga-eme ka obi mgbawa gbuo m.’+
30 “Ugbu a, ọ bụrụ na mụ edughị nwa a lakwuru ohu gị nna m, ebe ọ bụ na nna m hụrụ nwa a n’anya otú ọ hụrụ onwe ya,
31 ọ ga-anwụ ozugbo ọ hụrụ na nwa a esoghị anyị. Ọ pụtara na ndị ohu gị emeela ka ohu gị nna anyị rugide uju n’isi awọ́ ya nwụọ.
32 Ohu gị kwere nna m nkwa n’ihi nwa a, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ pụtara na emehiela m nna m ruo mgbe ebighị ebi.’+
33 N’ihi ya, kama nwa a ga-anọ, m na-arịọ ka ohu gị nọrọ ma bụrụ ohu nna m ukwu, ka nwa a wee soro ụmụnne ya laa.
34 Olee otú m ga-esi lakwuru nna m ma ọ bụrụ na nwa a esoghị m? Agaghị m achọ ịhụ ihe ọjọọ ga-eme nna m.”