Ozi Ọma Mak Dere 4:1-41

  • IHE ATỤ NDỊ GBASARA ALAEZE (1-34)

    • Ọgha mkpụrụ (1-9)

    • Ihe mere Jizọs ji eme ihe atụ (10-12)

    • A kọwara ihe atụ ọgha mkpụrụ (13-20)

    • A naghị adọwa ọkụ n’okpuru nkata (21-23)

    • Ihe unu ji atụ̀ ihe (24, 25)

    • Ọgha mkpụrụ nke na-ehi ụra (26-29)

    • Mkpụrụ osisi mọstad (30-32)

    • Ọ na-eji ihe atụ agwa ha okwu (33, 34)

  • Jizọs mere ka oké ifufe kwụsị (35-41)

4  Ọ malitekwara izi ihe n’akụkụ oké osimiri. Ìgwè mmadụ dị ukwuu gbakọtara n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, ọ banyere n’ụgbọ mmiri ma nọdụ ala. E wee kwọpụtụ ụgbọ ahụ n’ikpere mmiri. Ma, ìgwè mmadụ ahụ niile nọ n’ikpere mmiri ahụ.+  O wee malite iji ihe atụ dị iche iche na-ezi ha ọtụtụ ihe.+ Ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị ha:+  “Geenụ ntị. Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ.+  Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ abịa tụrụchaa ha.  Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala nkume ma pulite ozugbo n’ihi na ájá dị ebe ahụ emighị emi.+  Ma mgbe anwụ chawara, ha chanwụrụ, kpọnwụọkwa n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.  Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ebe ogwu juru. Ogwu ndị ahụ tolitere ma kpagbuo ha. Ha amịghịkwa mkpụrụ ọ bụla.+  Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma. Mgbe ha tolitere ma buo ibu, ha malitere ịmị mkpụrụ. Ha na-amịkwa okpukpu iri atọ, okpukpu iri isii nakwa okpukpu otu narị (100).”+  O wee sị: “Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+ 10  Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị na-eso ụzọ ya na ndịozi ya iri na abụọ malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ndị ahụ.+ 11  O wee sị ha: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo dị nsọ+ nke Alaeze Chineke. Ma ihe niile bụụrụ ndị ọzọ ihe atụ,+ 12  ka ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ihe ọ bụla, ka ha na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ bụla. Ha agaghịkwa alọghachikwute Chineke, ka e wee gbaghara ha.”+ 13  Ọ sịkwara ha: “Unu aghọtaghị ihe atụ a. Oleezi otú unu ga-esi ghọta ihe atụ ndị nke ọzọ niile? 14  “Ọgha mkpụrụ na-agha okwu Chineke.+ 15  Ụfọdụ ndị yiri mkpụrụ ndị ahụ dara n’akụkụ ụzọ. Ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, Setan na-abịa+ ewepụ okwu ahụ a ghara n’ime ha.+ 16  Ndị ọzọ yiri mkpụrụ ndị a ghara n’ala nkume. Ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, ha na-eji ọṅụ anabata ya.+ 17  Ma okwu ahụ agbanyeghị mgbọrọgwụ n’obi ha, kama ha na-anọ obere oge. Ozugbo nsogbu ma ọ bụ mkpagbu bịaara ha n’ihi okwu ahụ, ha na-akwụsị ikwere okwu ahụ. 18  E nwekwara ndị yiri mkpụrụ a ghara n’ebe ogwu juru. Ndị a bụ ndị nụrụ okwu ahụ,+ 19  ma nchegbu+ nke oge a* na akụnụba nke na-aghọgbu ndị mmadụ+ na ihe ndị ọzọ na-agụ ndị mmadụ agụụ+ na-abanye n’obi ha ma kpagbuo okwu ahụ, okwu ahụ agharazie ịmị mkpụrụ. 20  N’ikpeazụ, ndị yiri mkpụrụ a ghara n’ala dị mma bụ ndị na-ege ntị n’okwu ahụ, na-anabatakwa ya nke ọma ma na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ, okpukpu iri isii na okpukpu otu narị.”+ 21  Ọ sịkwara ha: “À na-ebute ọkụ* dọwa ya n’okpuru nkata* ma ọ bụ n’okpuru àkwà?* Ọ́ bụghị n’elu ihe e ji adọsa ọkụ* ka a na-adọkwasị ya?+ 22  N’ihi na e nweghị ihe e zoro ezo a na-agaghị ekpughe. E nweghịkwa ihe ọ bụla e kpuchiri nke ọma na-agaghị apụta ìhè.+ 23  Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+ 24  Ọ gwakwara ha, sị: “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.+ Ihe unu ji atụ̀ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu, a ga-atụkwasịkwara unu ihe na ya. 25  N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe ka a ga-enyekwu.+ Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere.”+ 26  O wee kwuo, sị: “Alaeze Chineke dị ka mgbe mmadụ ghara mkpụrụ n’ala. 27  Ọ na-ehi ụra n’abalị ma teta mgbe chi bọrọ. Mkpụrụ ndị ahụ pulitere, tookwa, ma ọ maghị otú o si mee. 28  Mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ si n’ala puo. Akwụkwọ na-ebu ụzọ apụta, oko ya apụtazie. N’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka na-esi n’oko ya apụta. 29  Ma ozugbo mkpụrụ ahụ chara, ọ na-eji mma e ji ewe ihe ubi were ya n’ihi na oge owuwe ihe ubi eruola.” 30  O wee sị: “Olee ihe anyị nwere ike iji Alaeze Chineke tụnyere? Ma ọ bụ, olee ihe atụ anyị nwere ike iji kọwaa ya? 31  Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad. Ọ bụ mkpụrụ kacha nta n’ime mkpụrụ niile dị n’ụwa n’oge a kụrụ ya.+ 32  Ma a kụhaala ya, ọ na-eto ma yie nnukwu osisi. Ọ na-awakwa alaka ndị buru ibu, nke mere na ụmụ nnụnụ na-abịa biri na ndò ya.” 33  O ji ọtụtụ ihe atụ+ ndị dị otú a gwa ha okwu Chineke otú ha nwere ike ịghọta. 34  N’eziokwu, ọ naghị agwa ha okwu n’emereghị ha ihe atụ. Ma, ọ na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ma ha na ya nọrọ.+ 35  N’ụbọchị ahụ, mgbe o ruru ná mgbede, ọ sịrị ha: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke osimiri a.”+ 36  N’ihi ya, mgbe ha gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, ha ji ụgbọ kwọrọ ya. E nwekwara ụgbọ ndị ọzọ so ụgbọ ọ nọ na ya.+ 37  Oké ifufe wee malite ife. Ebili mmiri nọkwa na-awụba mmiri n’ụgbọ ahụ, nke mere na ọ fọrọ obere ka mmiri ju n’ụgbọ ahụ.+ 38  Ma ọ nọ n’azụ ụgbọ ahụ, jiri ohiri isi na-ehi ụra. Ha wee kpọtee ya, sị ya: “Onye Ozizi, ọ́ naghị emetụ gị n’obi na mmiri na-achọ iri anyị?” 39  O wee bilie baara ifufe ahụ mba ma sị oké osimiri ahụ: “Shịị! Daa jụụ!”+ Ifufe ahụ kwụsịrị ife, ebe niile adaa jụụ. 40  O wee sị ha: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?* Ọ̀ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” 41  Ma oké egwu tụrụ ha, ha agwa ibe ha, sị: “Onye a ọ̀ bụdị onye? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ma ọ bụ “nkata e ji atụ̀ ihe.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “obi ji na-amapụ unu?”