Ozi Ọma Matiu Dere 3:1-17

  • Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ekwusa ozi ọma (1-12)

  • Mgbe Jizọs mere baptizim (13-17)

3  E mechaa, Jọn+ Onye Na-eme Baptizim bịara na-ekwusa ozi ọma+ n’ala ịkpa Judia.  Ọ nọ na-asị: “Chegharịanụ, n’ihi na Alaeze eluigwe adịla nso.”+  N’eziokwu, onye a bụ onye ahụ e si n’ọnụ Aịzaya onye amụma+ kwuo banyere ya, sị: “E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.’”+  Jọn na-eyi uwe e ji ajị kamel mee, na-ekekwa ájị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù.+ Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.+  N’oge ahụ, ndị nọ na Jeruselem na Judia niile na obodo niile dị gburugburu Osimiri Jọdan na-agakwuru ya.+  O wee na-eme ha baptizim* n’Osimiri Jọdan,+ ha ana-ekwupụta mmehie ha n’ihu ọha.  Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ n’ime ndị Farisii na ndị Sadusii+ ka ha na-abịa n’ebe ọ nọ na-eme baptizim, ọ sịrị ha: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+  Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ na-egosi na unu echegharịala.  Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’+ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ. 10  E dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.+ 11  Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim n’ihi na unu echegharịala.+ Ma onye ka m ike na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.+ Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ+ na ọkụ mee unu baptizim.+ 12  O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edowekwa ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ a na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.”+ 13  Jizọs wee si Galili bịakwute Jọn n’Osimiri Jọdan, ka o mee ya baptizim.+ 14  Ma Jọn nwara ka o gbochie ya. Ọ sịrị Jizọs: “Ọ bụ gịnwa kwesịrị ime m baptizim. Gịnịzi mere i ji bịakwute m?” 15  Jizọs sịrị ya: “Ka ọ dị otú a n’oge a, n’ihi na o kwesịrị ekwesị ka anyị si otú a mee ihe niile bụ́ ezi omume.” Ọ kwụsịziri igbochi ya. 16  Mgbe e mechara Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo. Ma, eluigwe meghere,+ o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata n’ụdị nduru wee bekwasị ya.+ 17  Otu olu sikwa n’eluigwe+ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-emikpu ha.”