Mkpughe E Kpugheere Jọn 2:1-29

  • Ihe a gwara ndị Efesọs (1-7), ndị Smeana (8-11), ndị Pagamọm (12-17), na ndị Tayataịra (18-29)

2  “Degara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị n’Efesọs+ akwụkwọ, sị: Onye ahụ chị kpakpando asaa ahụ n’aka nri ya, onye na-eje ije n’etiti ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ,+ kwuru ihe ndị a:  ‘Ama m ihe ndị unu na-eme, marakwa otú unu si arụsi ọrụ ike na otú unu si atachi obi. Amakwa m na unu anaghị anabata ndị ọjọọ, nakwa na unu na-anwale ndị na-asị na ha bụ ndịozi,+ ma ha abụghị, unu wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha.  Unu na-atachi obi, na-edi ọtụtụ ihe n’ihi aha m,+ unu adabeghịkwa mbà.+  Ma, ihe na-adịghị mụ mma unu mere bụ na unu ahụghịzi Chineke n’anya otú unu hụrụ ya na mbụ.  “‘N’ihi ya, chebaranụ ebe unu si daa echiche, chegharịakwanụ.+ Mewenụ ihe ndị unu na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na unu echegharịghị,+ m ga-abịakwute unu, m ga-agakwa ebe ihe unu ji adọsa ọkụ* dị wepụ ya.+  Ma, otu ihe dị mma unu na-eme bụ na unu kpọrọ ihe ndị òtù Nikọleyọs+ na-eme asị otú mụnwa kpọrọ ya.  Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a:+ Onye meriri n’agha,+ m ga-ekwe ka o rie mkpụrụ si n’osisi nke ndụ,+ nke dị na paradaịs Chineke.’  “Degakwara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Smeana akwụkwọ, sị: ‘Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ,’+ onye nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ, kwuru ihe ndị a:+  ‘Ama m ahụhụ unu na-ata, marakwa na unu dara ogbenye. Ma, unu bara ọgaranya.+ Amakwa m ndị na-ekwulu unu ma na-asị na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị. Ha bụ ndị nke* Setan.+ 10  Ụjọ atụla unu maka ahụhụ unu na-aga ịta.+ Ekwensu ga na-eme ka a tụọ ụfọdụ n’ime unu mkpọrọ ka o wee nwaa unu ruo n’isi, kpagbuokwa unu ruo ụbọchị iri. Kwụsienụ ike n’ebe m nọ ruo mgbe unu nwụrụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.+ 11  Onye nwere ntị, ya nụ+ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a: Onye meriri n’agha+ agaghị anwụ ọnwụ nke abụọ.’+ 12  “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Pagamọm akwụkwọ, sị: Onye ahụ nke ji ogologo mma agha dị nkọ, nke nwere ihu abụọ, kwuru ihe ndị a:+ 13  ‘Ama m ebe unu bi, ya bụ, n’ebe ocheeze Setan dị. Ma, unu ka na-erubere m isi.*+ Unu nwere okwukwe siri ike na m,+ ọbụnadị n’oge Antipas, bụ́ onye àmà m, onye e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye e gburu+ n’obodo unu, ebe Setan bi. 14  “‘Ma, ihe ole na ole unu na-eme na-adịghị mụ mma bụ na unu kwere ka unu na ndị nabatara ihe Belam kụziri nọrọ.+ Ọ bụ Belam kụziiri Belak+ otú a ga-esi rata ndị Izrel ka ha mehie, rie ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, kwaakwa iko.*+ 15  Otú ahụkwa ka unu si kwere ka unu na ndị nabatara ihe ndị òtù Nikọleyọs+ na-akụzi nọrọ. 16  N’ihi ya, chegharịanụ. Ọ bụrụ na unu echegharịghị, m ga-abịakwute unu ọsọ ọsọ, jirikwa ogologo mma agha dị n’ọnụ m+ lụso ndị ahụ agha. 17  “‘Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a:+ M ga-enye onye meriri n’agha+ ụfọdụ mana e zoro ezo.+ M ga-enyekwa ya obere okwute na-acha ọcha. E dekwara aha ọhụrụ n’elu obere okwute ahụ. O nweghịkwa onye ma aha ahụ ma ọ́ bụghị onye nwetara ya.’ 18  “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Tayataịra+ akwụkwọ, sị: Ọkpara Chineke, onye anya ya dị ka ire ọkụ na-enwu enwu,+ onye ụkwụ ya dịkwa ka ọla kọpa mara mma,+ kwuru ihe ndị a: 19  ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Ama m na unu hụrụ ndị ọzọ n’anya, nwee okwukwe, na-ejere Chineke ozi, na-atachikwa obi. Amakwa m na ihe unu na-eme ugbu a karịrị ihe unu mere na mbụ. 20  “‘Ma, ihe na-adịghị mụ mma unu mere bụ na unu gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel+ nkịtị. Ọ na-akpọ onwe ya onye amụma, na-eduhiekwa ndị ohu m ka ha na-akwa iko,*+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà. Ọ na-akụzikwara ha ihe ndị a. 21  M nyekwara ya oge ka o chegharịa, ma ọ chọghị ịkwụsị iko ọ na-akwa.* 22  M ga-eme ka ọ rịawa ọrịa. M ga-emekwa ka ndị ha na ya na-akwa iko taa ezigbo ahụhụ ma ha echegharịghị wee kwụsị ime ihe ndị ọ kụziiri ha. 23  M ga-emekwa ka ụmụ ya rịawa ọrịa ga-emecha gbuo ha, ka ọgbakọ niile wee mara na ọ bụ m na-enyocha obi na ihe dị n’ala ala obi.* M ga-akwụkwa onye ọ bụla n’ime unu ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+ 24  “‘Ma, ndị nke fọdụrụ n’ime unu na Tayataịra, ndị niile na-ekweghị ihe Jezibel na-akụzi, ndị na-amaghịkwa ihe ndị a sịrị na ha bụ “ihe ndị dị omimi nke Setan,”+ ihe a ka m na-agwa unu: Anaghị m ebo unu ibu arọ ọ bụla ọzọ. 25  Kama, na-emenụ ihe dị mma unu na-eme ruo mgbe m bịara.+ 26  Onye meriri n’agha, debekwa iwu m ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile.+ 27  Ikike m ga-enye ya bụ ụdị ikike Nna m nyere m. Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè+ taa ndị mmadụ ahụhụ.* Ọ ga-ebibi ha, ha adịrị ka arịa e ji ụrọ kpụọ, nke a kụriri akụri. 28  M ga-enyekwa ya kpakpando ụtụtụ.+ 29  Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Grik, “ụlọ nzukọ.”
Na Grik, “jidesiri aha m ike.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Na Grik, “na akụrụ.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-eji mkpanaka ígwè chịa ndị mmadụ.”