Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Anaghịzi Akpa Àgwà Ọma?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Anaghịzi Akpa Àgwà Ọma?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ọtụtụ ndị anaghịzi akpa àgwà ọma. Ndị ọrịa nwere ọnụ ọjọọ na-abakasị ndị dọkịta mba ahụ́; ndị n’enweghị nkwanye ùgwù gaa iri nri ebe a na-ere nri, ha na-agwa ndị na-ebunye ndị mmadụ nri okwu otú masịrị ha; ndị e bu n’ụgbọala na-akparị ọkwọ ụgbọala kwọ ha; ụmụ akwụkwọ na-akpa àgwà ọjọọ, na-akwa ndị nkụzi ha emo, na-emenye ha ụjọ, na-alụsokwa ha ọgụ; ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eme ihe ọjọọ, ndị ọzọ a na-agbalịsi ike ka ọhaneze chewe na ha na-akpa àgwà ọma.

 Ọ bụ Baịbụl ga-agwa anyị ihe bụ́ àgwà ọma n’eziokwu. O kwukwara ihe mere ọtụtụ ndị taa anaghịzi akpa àgwà ọma.

Gịnị mere ndị mmadụ anaghịzi akpa àgwà ọma?

 N’ebe niile n’ụwa, ọtụtụ ndị anaghịzi akpa àgwà ọma. Àgwà ọma bụ mmadụ ime ihe dị mma na ịkpa àgwà ọtụtụ ndị weere na ọ dị mma.

  •   N’otu nchọpụta ndị mmadụ nabatara e mere na nso nso a, ọtụtụ ndị Amerịka chere na kemgbe afọ iri abụọ na abụọ, e nwebeghị oge ọzọ ndị mmadụ na-anaghị akpa àgwà ọma n’obodo ha otú ha na-anaghị akpa ya taa.

  •   Ná nchọpụta ọzọ e mere ná mba iri abụọ na asatọ, a jụrụ puku mmadụ iri atọ na puku abụọ ajụjụ. E kee ha niile ụzọ iri, mmadụ isii na ọkara n’ime ha kwuru na e nweghị oge ọzọ naanị mmadụ ole na ole na-akpa àgwà ọma karịa n’oge a.

 Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà otú ha na-akpa ya taa.

  •   “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, . . . ndị tigbuo zọgbuo, [na] ndị ihe ọma na-anaghị amasị.”​—2 Timoti 3:1-3.

 Ị chọọ ịmatakwu otú amụma a si na-emezu, gụọ isiokwu bụ́ “Did the Bible Predict the Way People Think and Act Today?

Otú anyị ga-esi amata ihe bụ́ àgwà ọma n’eziokwu

 N’ụwa a ndị mmadụ na-anaghịzi akpa àgwà ọma, ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala na ha ga-esili na Baịbụl amata ihe bụ́ àgwà ọma n’eziokwu. Ọ gwara anyị ihe ndị dị mma anyị ga na-eme, “a ga-atụkwasịli ha obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 111:8) Dị ka ihe atụ:

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.”​—Matiu 7:12.

     Ihe ọ pụtara: Ebe ọ bụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ na-akpaso anyị àgwà ọma ma na-akwanyere anyị ùgwù, anyịnwa kwesịkwara ịna-emere ha otú ahụ.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Ebe unu hapụrụla aghụghọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”​—Ndị Efesọs 4:25.

     Ihe ọ pụtara: Anyị kwesịrị ịna-ekwu eziokwu mgbe niile, na-akwụwakwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla anyị na-eme.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, biko, gụọ: