Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Gị Aka ma Oké Ifufe Ma Ọ Bụ Oké Mmiri Ozuzo Jie Njinji?

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Gị Aka ma Oké Ifufe Ma Ọ Bụ Oké Mmiri Ozuzo Jie Njinji?

 Ì so n’ọtụtụ ijeri mmadụ ndị oké mmiri ozuzo ma ọ bụ oké ifufe kpataara nsogbu? Nsogbu oké mmiri ozuzo, na oké ifufe, na ihe ndị ọzọ yiri ha na-akpata dị iche iche. Ha nwere ike ime ka mmiri dị n’oké osimiri sọbata n’ala akọrọ, kpata idei mmiri, ma ọ bụ kpata ajọ ifufe na-emebisi ihe. Oké mmiri ozuzo nwekwara ike ime ka ala zee, oké ifufe emee ka àmụ̀mà gbuo, àmụ̀mà ahụ akpata ọkụ ọgbụgba. Oké ọkọchị, oké okpomọkụ na oké oyi nwekwara ike ịkpata nsogbu nke ha.

 N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ihe ndị a na-emezi ọtụtụ ugboro karịa otú ha na-emebu, na-akpakwa ike karịa otú ha na-akpabu. Òtù a na-akpọ International Federation of Red Cross and Red Crescent Societies kwuru, sị: “Ndị ọdachi dị iche iche na-akpatara nsogbu na-arịkwu elu kwa ụbọchị. Ihe kpatara ya bụ na a na-enwekwu oké idei mmiri, oké ifufe na oké ọkọchị n’ọtụtụ ebe. Ihe ndị a na-ata isi ọtụtụ ndị, na-eme ka ọtụtụ nọrọ n’ụkọ, na-agbawakwa ọtụtụ ndị ọzọ aka ụlọ kwa afọ.”

 Ọdachi ndị a mee, ha na-akpatara ndị mmadụ nsogbu ndị a na-ahụ anya, na-agbawakwa ha obi. O nwere ike ime ka obi na-ajọ ha njọ n’ihi na ọ gbawala ha aka ihe ndị ha nwere, na aka ụlọ ha, ma ọ bụdị kpata ọnwụ ndị ha hụrụ n’anya.

 Ọ bụrụ na ọdachi ndị a akpatarala gị nsogbu, Baịbụl ga-enyeliri gị aka idi ya. Baịbụl akasiela ọtụtụ ndị nwere ụdị nsogbu a obi, mee ka ha nwee olileanya, nyekwa ha ndụmọdụ ndị baara ha uru. (Ndị Rom 15:4) Ọ zakwara ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ọtụtụ ndị na-ajụ, dị ka, Gịnị mere Chineke ji kwe ka ụdị ihe a mee? Ò ji ihe a merenụ na-ata m ahụhụ?

Chineke ejighị oké mmiri ozuzo, oké ifufe, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha ndị na-eme taa ata ndị mmadụ ahụhụ

 Baịbụl kwuru na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. O mesiri anyị obi ike na “o nweghị onye nwere ike iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, Chineke anaghịkwa eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ihe a pụtara na oké mmiri ozuzo, oké ifufe ma ọ bụ ihe ndị yiri ha na-akpatara ndị mmadụ nsogbu taa esighị Chineke n’aka.

 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru banyere oge ụfọdụ Chineke ji ihe ndị o kere eke taa ndị ọjọọ ahụhụ, ma ndị nke ahụ dị iche ná ndị nke na-eme taa. Ndị nke taa na-eme na mberede, na-akpakwa ma ndị ọma ma ndị ọjọọ aka. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na Chineke chebere ndị ezi omume n’oge niile o ji ihe ndị ahụ taa ndị ọjọọ ahụhụ. Ọ na-ebu ụzọ adọ ndị mmadụ aka ná ntị, kwuokwa ihe mere o ji taa ha ahụhụ. Dị ka ihe atụ, Chineke kwuru ihe mere o ji mee ka e nwee Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’oge Noa, ọ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị tupu ya ebido, o chebekwara Noa na ezinụlọ ya.​—Jenesis 6:13; 2 Pita 2:5.

 Ị chọọ ịmatakwu ihe mere anyị ji kwere na Chineke ejighị ọdachi ndị na-emere onwe ha taa na-ata anyị ahụhụ, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?

Ihe banyere ndị ihe ndị ahụ kpataara nsogbu na-emetụ Chineke n’obi

 Baịbụl kwuru na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova a Chineke n’obi nakwa na ọ na-enwere anyị ọmịiko. Chegodị gbasara amaokwu Baịbụl ndị a na-akasi obi.

  •   Aịzaya 63:9: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute [Chineke].”

     Ihe ọ pụtara: Ahụhụ ndị nọ ná nsogbu na-ata na-emetụ Jehova n’obi nke ukwuu.

  •   1 Pita 5:7: “Ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”

     Ihe ọ pụtara: Jehova ejighị otú ihe si dịrị gị egwu egwu.

 Jehova na-enyere anyị aka maka na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi nakwa maka na ọ na-enwere anyị ọmịiko. Ọ na-eji ndụmọdụ ndị bara uru dị na Baịbụl akasi anyị obi. Ihe ọzọ o jikwa akasi anyị obi bụ ihe ndị e ji n’aka Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, mgbe oké mmiri ozuzo na ihe ndị yiri ya na-agaghịzi akpatara anyị ọdachi.​—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

Mgbe oké mmiri ozuzo, oké ifufe na ihe ndị yiri ha na-agaghịzi abụrụ anyị nsogbu

 Baịbụl kwuru na Jehova kwere nkwa ime ka ihe ‘dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu nakwa ka anyị nwee olileanya.’ (Jeremaya 29:11) Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ biri na paradaịs n’ụwa a ma na-enwe obi ụtọ, ọ bụghị ka ha na-atụ ụjọ nsogbu oké mmiri ozuzo, oké ifufe na ihe ndị yiri ha ga-akpata.​—Jenesis 1:28; 2:15; Aịzaya 32:18.

 Chineke ga-eji Alaeze ya, bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe nke Jizọs bụ eze ya, mezuo ihe a. (Matiu 6:10) Jizọs nwere amamihe na ike ọ ga-eji kwụsị nsogbu oké mmiri ozuzo, oké ifufe na ihe ndị yiri ha na-akpata. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na o nwere ikike ime ka ihe ndị e kere eke ghara ịkpata nsogbu. (Mak 4:37-41) Ọ ga-eji amamihe na nghọta chịa ọchịchị ya, kụziekwara ụmụ mmadụ otú ha ga-esi na-elekọta ụwa ma ghara imebi ya. (Aịzaya 11:2) Mgbe Jizọs ga-achịwa ụwa, oké mmiri ozuzo na ihe ndị yiri ya emekataghị kpatara ụmụ mmadụ nsogbu.

 I nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Olee mgbe Jizọs ga-eji ike ya kwụsị nsogbu oké mmiri ozuzo, oké ifufe na ihe ndị yiri ha na-akpata?’ Ị chọọ ịmata azịza ajụjụ a, gụọ isiokwu bụ́: “Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

Ihe ga-enyere gị aka idi nsogbu oké mmiri ozuzo, oké ifufe ma ọ bụ ihe ndị yiri ha na-akpata

 Ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka tupu e nwee ọdachi, mgbe e nwere ọdachi, nakwa mgbe ọdachi mechara.

  •   Tupu e nwee ọdachi: Jikere ime ihe ozugbo.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.”​—Ilu 22:3.

     Ihe ọ pụtara: Chọpụta ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe unu bi ka i nwee ike ime ihe ozugbo ma chebe ezinụlọ gị.

     Ihe mmadụ kọrọ: “Ụbọchị anyị si n’ụlọ anyị gbapụ n’ihi ọkụ ọgbụgba, anyị adịla mbụ jikere ejike. Anyị nwere akpa ndị anyị kwanyere ihe ndị anyị ga-eji agbapụ. Ọgwụ anyị na uwe anyị dịkwa n’ime ha. Ndị mmadụ nọ na-agbagharị n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eme eme. Ma, anyịnwa ji ihe niile dị anyị mkpa. Ihe a mere m obi ụtọ.”​—Tamara, o bi na Kalịfọnịa dị n’Amerịka.

  •   Mgbe ọdachi na-eme: Lekwasị anya n’ihe kacha mkpa.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”​—Luk 12:15.

     Ihe ọ pụtara: Ndụ dị mkpa karịa akụnụba.

     Ihe mmadụ kọrọ: “Mgbe ajọ ifufe a na-akpọ Lawin b mebisiri ụlọ anyị, isi ghasara m, amaghịzi m ihe m ga-eme eme. Ma otu ihe m mere bụ ikpe ekpere kọọrọ Jehova Chineke otú obi dị m. Ọ bịara doo m anya na naanị ihe funahụrụ anyị bụ ihe ndị anyị nwere, ọ bụghị ndụ anyị.”​—Leslie, o bi na Filipinz.

  •   Mgbe ọdachi mechara: Anọla na-eche banyere echi.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi.”​—Matiu 6:34.

     Ihe ọ pụtara: Ekwela ka ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu na-echu gị ụra.

     Ihe mmadụ kọrọ: “Mgbe oké ifufe a na-akpọ Irma mere ka idei mmiri bata n’ụlọ m, e nwere ọtụtụ ihe m kwesịrị ikpebi ozugbo ahụ. Ihe a mere ka m na-echegbu onwe m. M gbalịrị ka m ghara ichegbu onwe m otú ahụ Baịbụl kwuru. M mechara chọpụta na Jehova ga-enyeliri m aka idi ọtụtụ ihe karịadị otú m chere.”​—Sally, o bi na Flọrịda dị n’Amerịka.

 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka, gụọ isiokwu bụ́: “Ọdachi Mee, Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ịzọ Anyị Ndụ?

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

b A na-akpọkwa ya Typhoon Haima.