Ihe Ga-enyere Nwaanyị Di Ya Na-emekpọ Ọnụ Aka
Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike sịrị: “N’ụwa niile, a na-emekpọ ụmụ nwaanyị ọnụ. Ọ na-agbasa ebe niile ka ọrịa na-efe efe. E kwesịkwara ime ihe maka ya ozugbo.” Ha kwuru na n’ihe dị ka ụmụ nwaanyị iri lụrụ di ma ọ bụ ndị ha na nwoke na-akpa, a na-akụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ atọ n’ime ha ihe, na-edinakwa ha n’ike ma ọ bụ na-eme ha otu n’ime ha. Akụkọ si n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na n’otu afọ na-adịbeghị anya, otu narị ụmụ nwaanyị na iri atọ na asaa (137) nwụrụ ụbọchị ọ bụla n’ụwa niile n’ihi na di ha ma ọ bụ onye ha na ha na-akpa ma ọ bụkwanụ onye ezinụlọ ha kụgburu ha. a
Akụkọ nwere ike igosi na ndị di ha na-akụ ihe dị ọtụtụ, mana, ọ gaghị akọwali otú ihe a na-akụ onye nke ọ bụla n’ime ha si afụ ya ụfụ n’ahụ́ nakwa otú o si agbawa ya obi.
Di gị ọ̀ na-emekpọ gị ọnụ? Ka è nwere onye ị ma di ya na-emekpọ ọnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enye aka.
Ọ bụghị gị kpatara ya
Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Ndị Rom 14:12.
Cheta na ọ bụ onye ahụ na-akụ gị ihe ga-aza ajụjụ maka ihe ọ na-eme gị.
Ọ bụrụ na di gị na-ata gị ụta maka ihe ọ na-eme gị, ọ dara ya. Di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, ọ bụghị imekpọ ya ọnụ.—Ndị Kọlọsi 3:19.
Mgbe ụfọdụ, di gị nwere ike ịna-akụ gị ihe n’ihi na ihe na-emetụ ya n’isi, papa ya na-akụ mama ya ihe, ma ọ bụkwanụ na ọ na-aṅụ oké mmanya. N’agbanyeghị ya, ọ ga-aza Chineke ajụjụ maka otú o si emeso gị. Ọ bụkwa ya ka ọ dị n’aka ime ihe ndị o kwesịrị ime ka ọ kwụsị àgwà ọjọọ ahụ.
E nwere ike inyere gị aka
Ihe Baịbụl kwuru: “A na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”—Ilu 15:22.
Cheta na ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na di gị ga-akụ gị ihe ma ọ bụkwanụ na ị maghị ihe ị ga-eme, ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka.
Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị ọzọ nyere gị aka? Ọ bụrụ na a na-emekpọ gị ọnụ, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịna-echegbu gị. O nwere ike isiri gị ike ikpebi ihe kacha mma ị ga-eme n’ihi na ị maghị nke kacha mkpa n’ime ihe ndị e dere n’okpuru ebe a:
Ị chọghị ka ihe mee gị
Ihe ga-akachara ụmụ gị mma
Ego
Otú i si hụ di gị n’anya
I nwere ike ịchọ ka gị na di gị dịwakwa ná mma ma ọ gbanwee
E nweghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-eme n’ihi na isi na-agba gị ghara ghara. Ònye ka ị ga-akọsara ka o nyere gị aka?
Ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị nwere ike inyere gị aka ma kasie gị obi. Ịkọsara ya onye ihe gbasara gị na-emetụ n’obi nwere ike inyere gị ezigbo aka.
Ndị a na-akpọtụrụ ma di kụwa nwunye ya ihe nwere ike inyere gị aka ozugbo. Ha nwere ike inyere gị aka ịma ihe ị ga-eme iji chebe onwe gị. Ọ bụrụ na di gị ekweta na ya nwere nsogbu ma jiri obi ya niile chọọ ịgbanwe, ha nwere ike inyere ya aka ịma ihe ndị o kwesịrị ibu ụzọ mee.
Ndị ọzọ a na-akpọtụrụ maka ihe gbata gbata nwere ike inyere gị aka ozugbo ma ọ bụrụ na e nwere ihe mere gị. Ha nwere ike ịbụ ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ a zụrụ azụ.
Chineke nọ ya
Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova b nọ ndị obi gbawara nso. Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.”—Abụ Ọma 34:18.
Cheta na Chineke kwere nkwa inyere gị aka.
Ihe gbasara gị na-emetụ Jehova n’obi. (1 Pita 5:7) Ọ na-aghọta otú obi dị gị na ihe ị na-eche. O nwere ike iji Okwu ya bụ́ Baịbụl kasie gị obi. Ọ na-agwakwa gị ka ị na-akọrọ ya nsogbu gị n’ekpere. I kpewe ekpere, i nwere ike ịrịọ ya ka o nye gị amamihe na ike ị ga-eji edi nsogbu gị.—Aịzaya 41:10.
E nwere mgbe ọ ga-akwụsị
Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”—Maịka 4:4.
Cheta na Baịbụl kwere nkwa na udo ga-adị n’ezinụlọ ọ bụla n’oge na-adịghị anya.
Ọ bụ naanị Jehova Chineke ga-ewepụli nsogbu niile anyị nwere kpamkpam. Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” (Mkpughe 21:4) N’oge ahụ, anyị agaghịdị na-echeta nsogbu ndị anyị na ha na-alụ ugbu a. Naanị ihe anyị ga na-echezi bụ ihe ọma ndị na-emere anyị. (Aịzaya 65:17) Ọ bụ ya bụ ihe ọma Baịbụl na-ekwe gị nkwa ya.