Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Surasak Suwanmake/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Oké Okpomọkụ Mere n’Ụwa Niile n’Afọ 2023?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Oké Okpomọkụ Mere n’Ụwa Niile n’Afọ 2023?

 N’ebe niile n’ụwa, ụdị okpomọkụ a na-enwetụbeghị ụdị ya na ọdachi ndị ọ na-akpata na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Legodị ihe dị iche iche e kwuru gbasara ihe a:

  •   N’abalị 13 n’ọnwa Julaị afọ 2023, otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihu ígwé n’Amerịka kwuru, sị: “Kemgbe otu narị afọ na iri asaa na anọ (174) a malitere idekọ otú okpomọkụ si eme n’ụwa, e nwetụbeghị ọnwa Jun kporo ọkụ ka ọnwa Jun afọ a.”

  •   N’abalị 13 n’ọnwa Julaị afọ 2023, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara mbara igwe na Yurop kwuru, sị: “Oké okpomọkụ e nwere n’Ịtali, Spen, Frans, Jamanị na Poland enweghị atụ. O ruru nke na a na-atụ anya na okpomọkụ a ga-enwe n’agwaetiti Sisili na Sadinia ga-akarị okpomọkụ niile e nwetụrụla na Yurop.”

  •   N’abalị 17 n’ọnwa Julaị afọ 2023, Stefan Uhlenbrook bụ́ otu n’ime ndị isi n’ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọnọdụ Ihu Ígwé, kwuru, sị: “Ka ụwa na-ekpokwu ọkụ, o nwere ike ime ka mmiri na-ezosikwu ike ma na-akpakwa ike karịa, kpatazie idei mmiri na-enweghị atụ.”

 Otú ụdị akụkọ ndị a si arị elu kwa ụbọchị, ọ̀ na-eme ka ị na-echegbu onwe gị? Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara isiokwu a dị mkpa.

Oké okpomọkụ na ọdachi ndị ọzọ yiri ya hà na-emezu amụma Baịbụl?

 Ee. Oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa niile na ọdachi ndị ọzọ yiri ya so n’ihe ndị na-emezu amụma Baịbụl buru gbasara ihe ndị ga na-eme n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, Jizọs buru amụma na anyị ga-ahụ “ihe ndị na-atụ egwu” ma ọ bụ “oké ihe àmà dị iche iche.” (Luk 21:11) Oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa niile emeela ka obi koro ọtụtụ ndị n’elu na ụmụ mmadụ ga-emebi ụwa.

È nwere mgbe ụwa a na-agaghịzi adị mma obibi?

 Mba. Chineke kere ụwa ka ọ bụrụ ebe anyị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị ekwe ka ndị mmadụ bibie ya. (Abụ Ọma 115:16; Ekliziastis 1:4) O kwedịrị nkwa na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’​—Mkpughe 11:18.

 Baịbụl gosiri na Chineke ga-echebeli ụwa ka ọdachi ghara ịla ya n’iyi, ọ ga-echebekwa ya.

  •   “[Chineke] na-eme ka oké ifufe kwụsị ife. Ebili mmiri na-adajụ.” (Abụ Ọma 107:29) Chineke nwere ikike igbochi ihe ndị o kere eke, dị ka anyanwụ na ihe ndị ọzọ, ịkpa ike. Ọ ga-akwụsịli ihe ndị na-akpata oké okpomọkụ na ọdachi ndị ọzọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụwa taa.

  •   “Ị na-elekọta ụwa, na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.” (Abụ Ọma 65:9) Chineke ga-agọzi ụwa, ya aghọọ paradaịs.

 Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke ga-esi mezie ụwa, gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?