Chebe Obi Gị
Were Ya:
Akwụkwọ Egwú
1. M chọr’ime ihe dịm-ma,
Ihe g’adị Jehovam-ma.
N’im’obim, ụjọ n’atụm.
Ọ n’emekwa k’ike gwụm.
M g’agbalị rịọ Chineke.
Ọ bụ ya bụ Chi n’azam ekpere.
Obim gwawam kam kwụsị,
Jehova Chineke n’asịm
(UKWE)
Kam gbalịsi’ike n’echebe obim,
Kam tụkwasị naanị y’obi.
M ga n’eche ihe dị yam-ma.
Naanị ya g’eme k’obi ruom ala.
2. M kpebiri im’uche gị,
Ịn’efe gị ma n’eto gị.
Man-sogbu juru n’ụwa.
Ọ n’eme k’ike gwụwam.
Ị kwadorom ma sịm gawa,
Gaa gwan-dị ‘madụ n’Al’eze n’abịa.
M ga n’ejere gịo-zi.
Jehova, biko, n’eduzim.
(UKWE)
M ga n’agbalị n’echebe obim,
N’atụkwasị Jehov’obi.
M ga n’eche ihe dị yam-ma.
Naanị ya g’eme k’obi ruom ala,
N’erum ala.
(AHỊRỊ ỌZỌ)
Ihe dịm-ma kam ga n’eme.
Jehova, biko, nyem ike.
M g’agbalị kam kwụsịn-chegbu.
Jehova, biko, napụtam nán-sogbu.
Napụtam nán-sogbu.
(UKWE)
M ga n’agbalị n’echebe obim,
N’atụkwasị Jehov’obi.
M ga n’eche ihe dị yam-ma.
Naanị ya g’eme k’obi ruom ala.