ABỤ NKE 68
Ịgha Mkpụrụ Alaeze
-
1. Biko, bịa k’anyị jir’otuo-bi
Rụ’ọrụ Jizọs Kraịst nyer’anyị.
Jizọs g’edua-nyị k’anyị rụọ ya.
Ṅomie otúo si kụzi’ihe.
Mkpụr’Al’eze g’eto n’im’obi
Ndị niile nwer’ezio-bi.
K’anyị jir’ọṅụ n’agbam-bọ kw’ụbọchị,
N’arụọ-rụ Jizọs Kraịst nyer’anyị.
-
2. N’eme k’ozi gị n’eru n’obi.
Jehova ga n’agọzi ya.
Gbalịa gaghachi nyere h’aka
Ka ha mụt’Okwu Chineke.
Gbalịa n’enyere h’aka imeri
Nsogbu niile ha g’enwe.
Okwu Chineke ga n’eto n’obi ha.
Ọ g’eme k’ị n’enwe obiụ-tọ.
(Gụọkwa Mat. 13:19-23; 22:37.)