Ụlọ Nche na Teta!
Anyị na-ebipụta magazin anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ, asụsụ ndị ogbi sokwa na ha. I nwekwara ike isi ebe a danloduo ha. Ụlọ Nche na-eme ka anyị mara otú ihe na-eme n’ụwa si emezu amụma Baịbụl. Ọ na-akọrọ ndị mmadụ na Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu ha niile, na-emekwa ka ndị na-agụ ya nwee okwukwe na Jizọs Kraịst. Teta! na-akọrọ anyị otú anyị nwere ike isi die nsogbu ndị anyị na-enwe taa. Ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike na Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs ebe udo ga-adị, obi eruokwa mmadụ niile ala.