Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mozis—Ọ̀ Bụ Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo?

Mozis—Ọ̀ Bụ Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo?

Mozis—Ọ̀ Bụ Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo?

AMỤRỤ Mozis n’oge o yikarịrị ka à ga-egbu ya. Ndị obodo ya bụ ndị na-akwagharị akwagharị bụ́ ndị ha na nna ha bụ́ Jekọb, ma ọ bụ Izrel, gara biri n’Ijipt, iji lanahụ ụnwụ nri. Ruo ọtụtụ iri afọ, ha na ndị Ijipt ebikọwo n’udo. Ma e mesịa, ihe gbanwere n’ụzọ na-eyi egwu. Otu akụkọ mere eme a na-akwanyere ùgwù na-ekwu, sị: “Eze ọhụrụ biliri ịchịrị Ijipt . . . O wee sị ndị ya, Lee, ndị ụmụ Izrel dị ọtụtụ nweekwa ume karịa anyị; ngwa, ka anyị gosi onwe anyị ná ndị maara ihe n’ebe ha nọ; ka ha wee ghara ịba ụba.” Gịnị ka ha mere atụmatụ ime? Ọ bụ ịchịkwa ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel site ‘n’iwere mkpagbu mee ka ha fee ha ofufe,’ nakwa site n’inye ndị inyom Hibru na-ele ime iwu igbu nwa nwoke ọ bụla a mụrụ n’aka ha. (Ọpụpụ 1:8-10, 13, 14) N’ihi obi ike nke ndị inyom ha na-ele ime bụ́ ndị jụrụ irube isi n’iwu ahụ, ụmụ Izrel nọgidere na-aba ụba n’agbanyeghị mmegbu ndị a. N’ihi ya, eze Ijipt nyere iwu, sị: “Nwa nwoke ọ bụla a mụrụ, n’osimiri Naịl ka unu ga-atụfu ya.”—Ọpụpụ 1:22.

Otu di na nwunye bụ́ ndị Izrel, Amram na Jokebed, ‘atụghị iwu eze nyere egwu.’ (Ndị Hibru 11:23) Jokebed mụrụ nwa nwoke nke a ga-emesị kọwaa dị ka onye ‘mara mma na-enweghị atụ.’ * (Ọrụ 7:20) Ikekwe, ha chọpụtara n’ụzọ ụfọdụ na nwatakịrị a nwere nnwapụta Chineke. Ka o sina dị, ha jụrụ inye nwa ha ka e gbuo. N’itinye ndụ nke onwe ha n’ihe ize ndụ, ha kpebiri izo ya.

Mgbe ọnwa atọ gasịrị, nne na nna Mozis enweghịzi ike izo ya. N’enweghịzi ihe ọzọ ha ga-eme, ha mere nanị otu ihe ha chetara. Jokebed kunyere nwa ọhụrụ ahụ n’ime obere ụgbọ e ji papaịrọs mee ma dọsa ya ka ọ na-ese n’elu Osimiri Naịl. N’amaghị ama, ọ nọ na-amalite usoro nke ihe ndị ga-eme ka Mozis ghọọ onye a ma ama n’akụkọ ihe mere eme!—Ọpụpụ 2:3, 4.

Hà Bụ Ihe Omume Ndị E Kwesịrị Ikwere Ekwere?

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta taa na-ekwu na ihe ndị a emeghị eme. Akwụkwọ bụ́ Christianity Today na-ekwu, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịtụghị ihe mgbe ochie ọ bụla e nwetaworo nke na-egosi [afọ ndị] ụmụ Izrel biri n’Ijipt.” Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na e nweghị ihe àmà pụtara ìhè a na-ahụ anya, e nwere ọtụtụ ihe àmà ndị na-apụtachaghị ìhè na-egosi na ihe ndekọ Bible ahụ bụ ihe ndị e kwesịrị ikwere ekwere. N’akwụkwọ ya bụ́ Israel in Egypt (Izrel n’Ijipt), ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt oge ochie, bụ́ James K. Hoffmeier, na-ekwu, sị: “Ihe ndekọ mgbe ochie na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị Levant [mba ndị dị gburugburu ebe ọwụwa anyanwụ Mediterenian] na-agakarị n’Ijipt, karịsịa n’ihi nsogbu nke ọnọdụ ihu igwe bụ́ nke na-akpatakarị oké ọkọchị . . . N’ihi ya, malite n’ihe dị ka afọ 1800 ruo afọ 1540 T.O.A., Ijipt bụ ebe dị mma ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Semitic, na-aga biri.”

Ọzọkwa, ọ dịwo anya e kwetara na nkọwa Bible nyere banyere ịgba ohu n’Ijipt ziri ezi. Akwụkwọ bụ́ Moses—A Life (Mozis—Ndụ Ya) na-akọ, sị: “O yiri ka otu ihe osise pụtara ìhè e sere n’otu ili Ijipt oge ochie, bụ́ nke a na-esepụtakarị n’akwụkwọ, nke e sere ebe otu ìgwè ndị ohu na-akpụ brik, ọ̀ na-akwado ihe ndekọ Bible banyere mmegbu e megburu ụmụ Izrel.”

Ụzọ Bible sikwa kọwaa obere ụgbọ ahụ Jokebed ji mee ihe na-adakwa ka eziokwu. Bible na-ekwu na e ji papaịrọs mee ya, bụ́ nke akwụkwọ bụ́ Commentary nke Cook dere, na-ekwu na “ndị Ijipt jikarịrị rụọ ụgbọ epeepe ndị na-adịghị arọ ma na-efe ọsọ.”

Otú ọ dị, ọ̀ bụ na o sighị ike ikweta na onyeisi ala ga-enye iwu ka e jiri obi ịta mmiri gbuo ụmụ ọhụrụ? Ọkà mmụta bụ́ George Rawlinson na-echetara anyị, sị: “Ogbugbu nke ụmụ ọhụrụ . . . abụwo ihe e mere n’ụzọ dị ukwuu n’oge nakwa n’ebe dịgasị iche iche, e lewokwa ya anya dị ka obere ihe.” N’ezie, ọ dịghị mmadụ mkpa ịgate aka iji hụ ihe atụ ndị na-awụkwa akpata oyi n’ahụ́ nke igbu ndị mmadụ n’ìgwè n’oge a. Ihe ndekọ Bible ahụ pụrụ ịbụ ihe na-enye nsogbu n’obi, ma, ọ bụ nnọọ ihe e kwesịrị ikwere ekwere.

E Kuchiri Ya n’Ezinụlọ Fero

Jokebed ahapụghị nwa ọhụrụ ya ka ihe ọ bụla dapụtaranụ mee ya. O ‘tinyere ụgbọ ahụ n’etiti amị n’ụsọ osimiri Naịl.’ O yiri ka ebe ahụ ọ̀ bụ ebe o nwere olileanya na mmadụ pụrụ ịhụ ya. Ọ bụ n’ebe a ka ada Fero bịara ịsa ahụ́, ma eleghị anya, ọ na-abịa ebe ahụ mgbe mgbe. *Ọpụpụ 2:2-4.

A hụrụ obere ụgbọ ahụ ngwa ngwa. Ada Fero “wee meghee ya, hụ nwa ahụ, ma, lee, ọ bụ nwata nwoke na-akwa ákwá. O wee nwee ọmịiko n’ahụ́ ya, sị, Otu n’ime ụmụ ndị Hibru ka nke a bụ.” Adaeze Ijipt ahụ kpebiziri ikuchi ya. Aha ọ bụla nne na nna ya gụrụ ya abụrụwo ihe e chefuru eri oge. Taa, e ji aha ahụ nne nkuchi ya gụrụ ya—Mozis—mara ya n’ụwa nile. *Ọpụpụ 2:5-10.

Otú ọ dị, ọ́ bụghị ihe siri ike ikweta na ada eze Ijipt ga-akpọrọ nwatakịrị dị otú ahụ? Ee e, n’ihi na okpukpe ndị Ijipt kụziri na ime ihe ọma bụ ihe dị mkpa iji gaa eluigwe. Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Joyce Tyldesley na-ekwu banyere nkuchi ahụ n’onwe ya, sị: “Ụmụ nwanyị Ijipt na ụmụ nwoke Ijipt bịara hara nhata. Ha nwere ikike há nhata ma a bịa n’ihe ndị ruuru mmadụ n’ụzọ iwu nakwa n’ụzọ akụ̀ na ụba, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’ọnụ, . . . ụmụ nwanyị [pụkwara] ime nkuchi.” N’akwụkwọ mpịakọta oge ochie bụ́ Papaịrọs Ime Nkuchi, e depụtara n’ezie banyere otu nwanyị Ijipt nke kuchiri ndị ohu ya. Banyere igo nne Mozis dị ka onye na-enye nwa ara, akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Ụgwọ a kwụrụ nne afọ Mozis inye ya ara na ilekọta ya . . . yiri ihe a na-eme na Mesopotemia ma a bịa n’ihe banyere ikuchi nwa.”

Ugbu a e kuchiworo ya, à ga-ezochiri Mozis ịmata na ọ bụ onye Hibru? Ụfọdụ ihe nkiri Hollywood emewo ka o yie otú ahụ. Akwụkwọ Nsọ na-egosi ihe dị iche. Nwanne ya nwanyị, bụ́ Miriam, ji ụzọ amamihe mee ndokwa ka nne Mozis n’onwe ya, bụ́ Jokebed, nye ya ara ma lekọta ya. N’ezie, ọ dịghị mgbe nwanyị a na-atụ egwu Chineke ga-ezochiri nwa ya nwoke ihe bụ́ eziokwu! Ebe ọ bụkwa na n’oge ochie, a na-enyekarị ụmụaka ara ruo ọtụtụ afọ, Jokebed nwere ohere zuru ezu iji kụziere Mozis banyere ‘Chineke nke Ebreham, Aịzik, na Jekọb.’ (Ọpụpụ 3:6) Ntọala ime mmụọ dị otú ahụ baara Mozis uru nke ukwuu, n’ihi na mgbe a kpọnyesịrị ya ada Fero, “a kụziiri Mozis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.” A pụghị inweta ihe nkwado maka nzọrọ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-azọrọ na ọkwá Mozis rịrị ruo n’ịbụ ọchịagha n’agha a lụsoro Etiopia. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na Mozis “dị ike n’okwu na n’omume.” *Ọrụ 7:22.

Mgbe Mozis gbara afọ 40, ọ bịara nọrọ n’ọnọdụ dị mma ịghọ onye ndú Ijipt a ma ama. Ọ gaara enwe ike na akụ̀ na ụba ma ọ bụrụ na ọ nọgide n’ezinụlọ Fero. Mgbe ahụ, otu ihe mere bụ́ nke gbanwere ndụ ya.

Ịgbaga Midian

Otu ụbọchị, Mozis “[hụrụ] nwoke Ijipt ka ọ na-etigbu nwoke Hibru, otu n’ime ụmụnne ya.” Ruo ọtụtụ afọ, Mozis ritere uru ndị dị n’ịbụ ma onye Hibru ma onye Ijipt. Ma ịhụ ka a na-etigbu onye Izrel ibe ya kpaliri Mozis ime otu nhọrọ dị ịrịba ama. (Ọpụpụ 2:11) Ọ “jụrụ ịbụ onye a kpọrọ nwa ada Fero, na-ahọrọ ịbụ onye a na-emeso ya na ndị Chineke n’ụzọ ọjọọ.”—Ndị Hibru 11:24, 25.

Mozis ji ọkụ ọkụ mee ihe a na-apụghị imekwata emekwata: “O tigbue onye Ijipt ahụ, zobe ya n’ájá.” (Ọpụpụ 2:12) Nke a abụghị omume onye “na-ewe iwe ọkụ,” dị ka otu onye nkatọ kwuru. O yiri ka ọ̀ bụ ihe e mere n’okwukwe—ọ bụ ezie na o hiere ụzọ—ná nkwa Chineke bụ́ na a ga-anapụta Izrel n’Ijipt. (Jenesis 15:13, 14) Ikekwe, n’ihi enweghị ahụmahụ, Mozis chere na ihe ndị o mere ga-akpali ndị ya ịmalite nnupụisi. (Ọrụ 7:25) Otú ọ dị, n’ụzọ juru ya anya, ụmụ Izrel ibe ya jụrụ iwere ya dị ka onye ndú ha. Mgbe akụkọ igbu ọchụ ahụ ruru Fero ntị, Mozis bịara bụrụ onye na-aghaghị ịgbaga n’ala ọzọ. Ọ gara biri na Midian, lụọ otu nwanyị aha ya bụ Zipora, nwa nwanyị nke otu onyeisi na-akwagharị akwagharị nke aha ya bụ Jetro.

Ruo ogologo afọ 40, Mozis biri ndụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-adịghị okomoko, olileanya ya nke ịbụ onye mgbapụta kụrụ afọ n’ala. Otú ọ dị, otu ụbọchị, ọ chịịrị ìgwè atụrụ Jetro gaa n’otu ebe dị nso n’ugwu Horeb. N’ebe ahụ, mmụọ ozi Jehova pụkwutara Mozis n’ọhịa na-agba ọkụ. Were anya nke uche see onyinyo ihe na-emenụ: ‘Mee ka ndị m, bụ́ ụmụ Izrel, si n’Ijipt pụta,’ ka Chineke na-enye n’iwu. Ma obi akaghị Mozis mgbe ọ na-azaghachi. “Ònye ka m bụ,” ka ọ na-arịọ, “na m ga-ejekwuru Fero, na m ga-emekwa ka ụmụ Izrel si n’Ijipt pụta?” O kpughere ọbụna otu adịghị ike o nwere bụ́ nke ụfọdụ ndị na-emepụta ihe nkiri zochiworo: Ihe àmà gosiri na o nwere nsogbu ikwu okwu. Lee ka Mozis si dị iche n’ebe ndị dike a na-akọ n’akụkọ ifo nakwa n’akụkọ mgbe ochie nọ! Afọ 40 nwoke a zụrụ atụrụ emewo ka ọ dịrị umeala n’obi ma dị nwayọọ. N’agbanyeghị na obi akaghị Mozis, Chineke nwere obi ike na o ruru eru maka idu ndú!—Ọpụpụ 3:1-4:20.

Nnapụta Pụọ n’Ijipt

Mozis ahapụ Midian ma bịa n’ihu Fero, na-ekwu ka ọ tọhapụ ndị Chineke. Mgbe eze ahụ kpọrọ ekwo nkụ jụrụ, e tie ha ihe otiti iri kpụ ọkụ n’ọnụ. Ihe otiti nke iri ahụ akpata ọnwụ nke ihe ndị e buru ụzọ mụọ n’Ijipt, Fero ike gwụrụla emesịakwa tọhapụ ụmụ Izrel.—Ọpụpụ, isi nke 5-13.

Ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ maara ihe ndị a nke ọma. Ma ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ha mere eme? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ebe ọ bụ na a kpọghị aha Fero ahụ, ọ ghaghị ịbụ na akụkọ ahụ emeghị eme. * Otú ọ dị, Hoffmeier, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu na ndị odeakwụkwọ Ijipt na-amakarị ụma ahapụ ide aha ndị iro Fero. Ọ na-ekwu, sị: “N’ezie, ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme agaghị ekwu na agha Thutmose nke Atọ lụrụ na Megido emeghị eme n’ihi na e dekọghị aha eze nke Kedesh na nke Megido.” Hoffmeier na-enye echiche na “e nwere ezi ihe ndị metụtara nkà mmụta okpukpe” ndị mere na a kpọghị Fero aha. Otu ihe bụ na site n’ịhapụ ịkpọ aha Fero, akụkọ ahụ dọọrọ uche gaa n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’ebe Fero nọ.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nkatọ na-ajụ ịnakwere echiche bụ́ na ọ dị mgbe ndị Juu si n’Ijipt pụọ n’ìgwè. Ọkà mmụta bụ́ Homer W. Smith na-ekwu na ọpụpụ dị otú ahụ a pụrụ n’ìgwè “gaara ehiwo ụdụ n’ezie n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Ijipt ma ọ bụ Siria . . . O yikarịrị ka akụkọ mgbe ochie banyere ọpụpụ ahụ ọ̀ bụ akụkọ e chepụtara echepụta, nke e tinyere nnu na ose, banyere mgbaga obere ìgwè mmadụ si n’Ijipt gbaga Palestaịn.”

N’eziokwu, a hụbeghị ihe ndekọ Ijipt ọ bụla kọrọ banyere ihe a. Ma ndị Ijipt ezereghị àgwà nke ịgwagbu ihe ndekọ ihe mere eme ma ọ bụrụ na eziokwu eyie ihe ga-emenye ihere ma ọ bụ ihe na-agaghị ewetara ọchịchị ha aha ọma. Mgbe Thutmose nke Atọ banyere n’ọchịchị, ọ nwara iwepụ ihe nile ga-eme ka a na-echeta onye bu ya ụzọ, bụ́ Hatshepsut. Ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt oge ochie, bụ́ John Ray, na-ekwu, sị: “E hichara ihe ndị o dere, jiri mgbidi gbaa ogidi ndị o wuru gburugburu, chezọọkwa ihe ncheta ya. Aha ya apụtaghị n’ihe ndekọ ndị e dere mgbe ọ nwụsịrị.” Mgbalị ndị yiri nke ahụ nke ịgbagọ ma ọ bụ izochi eziokwu ndị na-emenye ihere, ewerewo ọnọdụ n’oge ndị a.

A bịa n’ụkọ nke ihe ndekọ mgbe ochie nke na-agba akaebe banyere njem ahụ e mere n’ọzara, anyị aghaghị icheta na ndị Juu bụ ndị na-akwagharị akwagharị. Ha ewughị obodo ọ bụla; ha akọghị ihe ọ bụla. Dị ka nzọrọ e mere si dị, ọ dịghị ezigbo ihe àmà ha hapụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ime Bible n’onwe ya, a pụrụ ịhụ ihe àmà nke na-eme ka e kwenye na njem ahụ weere ọnọdụ. E zoro aka na ya n’ebe nile n’akwụkwọ ahụ dị nsọ. (1 Samuel 4:8; Abụ Ọma 78; Abụ Ọma 95; Abụ Ọma 106; 1 Ndị Kọrint 10:1-5) N’ụzọ dị ịrịba ama, Jizọs Kraịst gbakwara akaebe na ihe ndị ahụ mere n’ọzara, weere ọnọdụ n’ezie.—Jọn 3:14.

Otú ọ dị, obi abụọ adịghị ya na ihe ndekọ Bible banyere Mozis bụ ihe e kwesịrị ikwere ekwere, eziokwu. Otú o sina dị, ọ dịrị ndụ ogologo oge gara aga. Mmetụta dị aṅaa ka Mozis pụrụ inwe ná ndụ gị taa?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’ụzọ nkịtị, ọ pụtara “mara mma n’anya Chineke.” Dị ka akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary si kwuo, okwu ahụ pụrụ izo aka ọ bụghị nanị n’ọdịdị elu ahụ nwata ahụ, bụ́ nke magburu onwe ya, kamakwa “n’àgwà ya.”

^ par. 11 Ịsa ahụ́ n’osimiri Naịl “bụ ihe a na-emekarị n’Ijipt oge ochie,” ka akwụkwọ ahụ Cook dere bụ́ Commentary na-ekwu. “E fere Naịl ofufe dị ka ihe sitere n’aka . . . Osiris, e kwukwara na mmiri ya nwere ike pụrụ iche nke inye ndụ na ike ọmụmụ.”

^ par. 12 Ndị ọkà mmụta na-arụrịta ụka n’etiti onwe ha banyere ebe e si nweta aha a. N’asụsụ Hibru, Mozis pụtara “Onye A Gụpụtara; Onye A Zọpụtara ná Mmiri.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na-ekwu na ihe mejupụtara okwu ahụ bụ́ Mozis bụ okwu Ijipt abụọ ndị pụtara “mmiri” na “zọpụta.” Taa, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwekwaara na aha ahụ bụ́ Mozis bụ aha ndị Ijipt ma chee na o yikarịrị ka ọ̀ pụtara “Nwa Nwoke.” Otú ọ dị, arụmụka a dabeere n’otú ụda nke okwu ahụ bụ́ “Mozis” si yie ụda nke aha ụfọdụ nke ndị Ijipt. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye maara n’ezie otú e si akpọpụta okwu Hibru ma ọ bụ okwu Ijipt n’oge ochie, ihe ndị ahụ ha na-ekwu bụ ịkọ nkọ.

^ par. 14 Akwụkwọ bụ́ Israel in Egypt na-ekwu, sị: “Echiche ahụ nile nke Mozis ịbụ onye a zụlitere n’obí eze Ijipt yiri akụkọ ifo. Ma nnyocha e mekwuru n’obí eze ahụ n’oge Alaeze Ọhụrụ na-egosi ihe dị iche. Thutmose nke Atọ . . . malitere ịkpọrọ ụmụ ndị ikom nke ndị eze nọ n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia, bụ́ ndị nọ n’okpuru ya, bịa n’Ijipt iji kụziere ha ụzọ ndụ ndị Ijipt . . . Ya mere, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom nke ndị eze mba ndị ọzọ n’obí eze Ijipt.”

^ par. 22 Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na Fero nke chịrị n’oge Ọpụpụ ahụ bụ Thutmose nke Atọ. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Amenhotep nke Abụọ, Ramses nke Abụọ, na ndị ọzọ. N’ihi otú usoro ọgụgụ oge ndị Ijipt si dị mgbagwoju anya, o kweghị omume ịchọpụta kpọmkwem onye Fero a bụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Nnapụta A Napụtara Mozis—Ọ̀ Bụ Akụkọ Mgbe Ochie Ndị Ọgọ Mmụọ?

Ndị nkatọ na-ekwu na nnapụta a napụtara Mozis n’Osimiri Naịl na-ada n’ụzọ a na-enyo enyo ka akụkọ mgbe ochie ahụ a kọrọ banyere Eze Sagọn nke Akkad—akụkọ nke ụfọdụ ndị na-ekwu na o bu akụkọ banyere Mozis ụzọ. Ọ na-akọkwa banyere otu nwa ọhụrụ nọ n’ime nkata bụ́ onye a napụtara n’osimiri.

Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe ndị yiri ibe ha n’akụkọ ihe mere eme. Ịdọkwasị nwa ọhụrụ n’osimiri nwekwara ike ghara ịbụ ihe ọhụrụ dị ka ọ pụrụ iyi. Akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review, na-ekwu, sị: “Anyị kwesịrị ịrịba ama na ma Ijipt ma Babilọn bụ mba ndị dị n’akụkụ mmiri, nakwa na itinye nwatakịrị na nkata mmiri na-adịghị aba na ya pụrụ ịbụ ụzọ katụ mma isi na-atụfu nwa ọhụrụ karịa ịtụnye ya n’ikpo ahịhịa, bụ́ nke a na-emekarị. . . . Akụkọ nke nwa a tụtụtara atụtụta imesị ghọọ onye a ma ama pụrụ ịbụ ihe a na-akọkarị n’akụkọ ifo, ma, n’ezie, nke ahụ bụ n’ihi na ọ bụ akụkọ na-emekarị eme ná ndụ.”

N’akwụkwọ ya bụ́ Exploring Exodus, Nahum M. Sarna na-ekwu na ọ bụ ezie na e nwere myirịta ụfọdụ, akụkọ banyere ọmụmụ Mozis dị iche ‘n’Akụkọ Mgbe Ochie Banyere Sagọn’ “n’ọtụtụ ụzọ ndị dị ịrịba ama.” Nzọrọ ndị a na-eme na e nwetara ihe ndekọ Bible ahụ site n’akụkọ ifo ndị ọgọ mmụọ erijughị afọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ònye Dere Akwụkwọ Ise Ndị Mbụ nke Bible?

Kemgbe ụwa, e kwuwo na ọ bụ Mozis dere akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible, bụ́ nke a na-akpọ Pentateuch. Mozis pụrụ inwetawo ụfọdụ n’ime ihe ndị o dere na ha site n’ihe ndekọ nke ihe mere eme e nwere tupu a mụọ ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nkatọ kweere na ọ bụghị Mozis dere Pentateuch ma ọlị. “N’ihi ya, o doro nnọọ anya na ọ bụghị Mozis dere Pentateuch,” ka otu onye ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 17, bụ́ Spinoza, kwuru. N’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke 19, ọkà mmụta bụ́ onye Germany, bụ́ Julius Wellhausen, gbasara n’ebe nile nchepụta echiche bụ́ na akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible bụ njikọta nke ihe ọtụtụ ndị dere.

Wellhausen kwuru na otu n’ime ndị edemede ahụ nọgidere na-eji ahaaka Chineke bụ́ Jehova eme ihe. Onye nke ọzọ akpọọ Chineke “Elohim.” Onye edemede ọzọ dere iwu ndị metụtara ọrụ nchụàjà n’akwụkwọ Levitikọs, onye ọzọkwa edee Deuterọnọmi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ọkà mmụta anakwerewo nchepụta echiche a ruo ọtụtụ iri afọ, akwụkwọ bụ́ The Pentateuch, nke Joseph Blenkinsopp dere, na-akpọ nchepụta Wellhausen ahụ nchepụta “a na-esere okwu.”

Akwụkwọ bụ́ Introduction to the Bible, nke John Laux dere, na-akọwa, sị: ‘Nchepụta echiche bụ́ na ọ bụ ọtụtụ ndị dere Pentateuch dabeere ná nzọrọ ndị ma ọ́ bụghị na ha gabigara ókè ọ̀ bụrụ na ha abụtụghị eziokwu. . . . Ọ bụrụ na nchepụta echiche ahụ nke bụ́ na akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible bụ njikọ nke ihe ọtụtụ ndị dere, bụ eziokwu, ụmụ Izrel ga-abụwo ndị a ghọrọ aghụghọ na-enweghị isi mgbe ha kwere ka e bokwasị ha ibu arọ nke Iwu ahụ. Ọ ga-abụwo ụgha kasịnụ a ghatụworo n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa.”

Arụmụka ọzọ bụ na ndịrịta iche ndị e nwere n’ụzọ e si dee Pentateuch bụ ihe na-egosi na ọ bụ ọtụtụ ndị dere ya. Otú ọ dị, K. A. Kitchen na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Ancient Orient and Old Testament, sị: “Ndịrịta iche ndị e nwere n’ụzọ e si dee ihe enweghị ihe ọ bụ, ha na-egosipụta ọdịiche ndị e nwere n’ihe ndị a na-ekwu maka ha.” A pụkwara ịhụ ndịrịta iche ndị yiri nke ahụ n’ụzọ e si dee “ihe odide oge ochie bụ́ ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ otu onye dere ha.”

Arụmụka bụ́ na ojiji e ji aha na utu aha dịgasị iche mee ihe maka Chineke na-egosi na ọ bụ ọtụtụ ndị dere ya kasị bụrụ nke na-erijughị afọ. Nanị n’otu obere akụkụ nke akwụkwọ Jenesis, a na-akpọ Chineke “Chineke Nke kachasị ihe nile elu,” “Onye nwe eluigwe na ụwa,” “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova,” “Chineke na-ahụ ụzọ,” “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile,” “Chineke,” na “Onyeikpe ụwa nile.” (Jenesis 14:18, 19; 15:2; 16:13; 17:1, 3; 18:25) Ọ̀ bụ mmadụ dị iche iche dere nke ọ bụla n’ime akụkụ Bible ndị ahụ? Gịnịkwanụ banyere Jenesis 28:13, bụ́ ebe e ji okwu ndị bụ́ “Elohim” (Chineke) na “Jehova” mee ihe n’otu ebe? Ọ̀ bụ mmadụ abụọ gbakọtara aka dee otu amaokwu ahụ?

Erijughị afọ nke ụzọ iche echiche a na-apụta ìhè karịsịa ma e jiri ya tụnyere ihe odide ndị e nwere n’oge a. N’otu akwụkwọ e dere n’oge na-adịbeghị anya banyere Agha Ụwa nke Abụọ, a kpọrọ onyeisi ọchịchị Germany “Führer,” “Adolf Hitler,” nakwa nanị “Hitler” n’ime nanị peeji ole na ole. Ọ̀ dị onye ga-anwa anwa ekwu na nke a na-egosi na ọ bụ mmadụ atọ dere ya?

Ka o sina dị, a nọgidewo na-enwewanye nkọwa dị iche iche nye nchepụta echiche Wellhausen. Otu n’ime ha bụ nchepụta echiche nke ndị ọkà mmụta abụọ chepụtara banyere onye edemede ahụ nke nọgidere nnọọ na-eji aha Chineke, bụ́ Jehova, eme ihe. Ọ bụghị nanị na ha kwuru na ọ bụghị Mozis dere ya, kamakwa ha kwuru na onye dere ya bụ nwanyị.

[Foto]

Mozis ji ịdị umeala n’obi dekọọ ọdịda ọ dara inye Chineke otuto

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe e sere n’ili n’Ijipt bụ́ ebe ndị ohu na-akpụ brik

[Ebe E Si Nweta Foto]

Erich Lessing/Art Resource, NY