Mgbe Omume Ọma Bidoro Lawa n’Ike n’Ike
Mgbe Omume Ọma Bidoro Lawa n’Ike n’Ike
OLEE mgbe ị ga-ekwu na ọ bụ mgbe omume ọma bidoro lawa n’ike n’ike? Ọ̀ bụ n’oge ndụ gị ka ọ bụ ikekwe n’oge ndụ nke ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi gị tọrọ gị? Ụfọdụ na-ekwu na Agha Ụwa nke Mbụ, bụ́ nke dara n’afọ 1914, mere ka anyị banye n’ọgbọ a anyị nọ na ya, nke omume ọma na-ala na ya n’ụzọ na-enweghị atụ. Robert Wohl, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme, dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Generation of 1914, sị: “Ndị dịịrị ndụ gabiga agha ahụ adịghị mgbe ha wepụliri ya n’obi ha na otu ụwa bịara ná njedebe, ụwa ọzọ amalitekwa n’August 1914.”
Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Norman Cantor kwuru, sị: “N’ebe nile, e bibichaziri ụkpụrụ omume ọma ndị a na-agbaso n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya—bụ́ ndị dị mbụ na-ada ada. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na ndị ọchịagha mesoro ọtụtụ nde mmadụ nọ n’okpuru ha ihe ka à ga-asị na ha bụ ụmụ anụmanụ a na-aga igbu egbu, gwazienụ m iwu okpukpe ma ọ bụ nke obodo, nke pụrụ igbochi ndị mmadụ iji obi ọjọọ mesoo ibe ha ihe ka à ga-asị na ha bụ anụ ọhịa? . . . Mgbukpọ e gbukpọrọ ndị mmadụ n’Agha Ụwa nke Mbụ [1914-1918] mere nnọọ ka ụmụ mmadụ gharazie iji ndụ ha akpọrọ ihe.”
N’akwụkwọ ya bụ́ The Outline of History, onye England na-akọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ H. G. Wells, kwuru na ọ bụ mgbe ndị mmadụ bịara kwere n’ozizi evolushọn ka “nke bụ́ omume ọma bidoro lawa.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụfọdụ bịara chee na ụmụ mmadụ bụ ụmụ anụmanụ, kama ọ bụ nanị na ha katụ ụmụ anụmanụ ndị ọzọ elu. Maazi Wells, bụ́ onye kweere n’ozizi evolushọn, dere n’afọ 1920, sị: “Ha bịara kwere na ụmụ mmadụ bụ ụmụ anụmanụ na-ebikọ ọnụ otú nkịta ọhịa ndị India si ebikọ ọnụ . . . , n’ihi ya, ha weere ya na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ya na ụmụ mmadụ, bụ́ ndị e weere dị ka nkịta ukwu, na-emegbu ma na-amaja ibe ha.”
N’ezie, dị ka Maazị Cantor si kwuo, Agha Ụwa nke Mbụ gbanwere nnọọ echiche ụmụ mmadụ nwere banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ kọwara, sị: “E weere ndị nna nna anyị hà dị ka ndị na-amatụghị nke a na-akọ n’ihe nile—n’ọchịchị, n’ejiji, [nakwa] n’otú ha si ele mmekọahụ anya.” Chọọchị dị iche iche, bụ́ ndị metọrọ ozizi Ndị Kraịst site n’ịnabata ozizi evolushọn nakwa site n’ịkwado òtù abụọ na-alụ agha, so mee nnọọ ka omume ọma laa. Frank Crozier, bụ́ onye agha Britain nke ọkwá ya gbagotetụrụ, dere, sị: “Chọọchị Ndị Kraịst kasị akpali ndị mmadụ ịkwafu ọbara, anyị jikwa ha eme ihe mgbe ọ bụla anyị chọrọ.”
Elegharala Ụkpụrụ Ndị Na-achịkwa Omume Ọma Anya
N’afọ ndị sochiri Agha Ụwa nke Mbụ, a kwụsịrị ịgbaso ụkpụrụ ndị na-achịkwabu omume ọma ma jirizie omume onye mere otú masịrị ya dochie ha. Frederick Lewis Allen, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, kwuru, sị: “N’ụzọ dabara adaba, a pụrụ ịkpọ afọ iri ndị sochiri agha ahụ Afọ Iri E Ji Omume Ọjọọ Mara. . . . Omume ọma ndị mere ka ndụ nwee nzube ma dị ụtọ so usoro ihe ochie ahụ laa, ọ dịghịkwa mfe inweta omume ọma ndị a pụrụ iji dochie ha.”
Nnukwu ndakpọ akụnụba e nwere n’ụwa n’afọ ndị 1930 mere ka ọtụtụ mmadụ daa nnọọ ogbenye, n’ihi ya kwa, ha
bịaziri mụrụ akọ. Ma, ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 1939, agha ọzọ, bụ́ nke kadị njọ, dara n’ụwa—ya bụ, Agha Ụwa nke Abụọ. N’oge na-adịghị anya, mba dị iche iche malitere ịkpụpụta ngwá agha ọ̀ gwụrụ mba. Nke a mere ka ndakpọ akụnụba ahụ kwụsị ma mezie ka ụmụ mmadụ malite ịta ụdị ahụhụ na ịhụ ụdị arụrụala ha na-echetụbeghị n’echiche. Ka ọ na-erule oge agha ahụ biri, ọtụtụ obodo aghọọla mkpọmkpọ ebe; e bibiri obodo abụọ na Japan, ihe e jikwa bibie nke ọ bụla n’ime ha bụ otu bọmbụ atọm! Ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ n’ogige ịta ahụhụ ndị jọgburu onwe ha. A gụkọta ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị, na ụmụaka nile nwụrụ n’agha ahụ, ha dị ihe dị ka nde iri ise.N’oge ọjọọ ahụ a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, kama ndị mmadụ ga-anọgide na-agbaso ụkpụrụ omume ọma ndị dịwara kemgbe ụwa, ha tụpụtara ụkpụrụ nke ha. Akwụkwọ bụ́ Love, Sex and War—Changing Values, 1939-45, kwuru, sị: “O yiri ka, n’oge agha ahụ, à kagburu iwu na-achịkwa mmekọahụ mgbe e buuru omume ọjọọ ndị a na-anabata n’ọgbọ agha batazie n’ebe obibi ndị mmadụ. . . . N’ihi otú o si dị mba dị iche iche ọkụ n’obi imeri n’agha ahụ ozugbo, o teghị aka, e leghara iwu ndị na-achịkwa omume ọma anya, ọtụtụ ndị nkịtị abịa lewezie ndụ anya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ na ihe na-anaghị adịte aka, dị nnọọ ka ndị agha si ele ya.”
Egwu ọnwụ e yiri ndị mmadụ n’esepụghị aka n’oge ahụ mere ka ha chọwakwuo ihe ndị ga na-eme ka obi ruo ha ala, ọ bụrụgodị na ọ bụ ruo nanị nwa oge. Ka otu nwanyị a na-alụ alụ na Britain na-achọ ime ka mmekọahụ e nwere aghara aghara n’oge agha ahụ yie ihe ziri ezi, o kwuru, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị abụghị ndị na-eme omume rụrụ arụ, ihe mere bụ na a na-alụ agha.” Otu onye agha America kwetara, sị, “Ọtụtụ mmadụ lere anyị anya dị ka ndị na-eme omume rụrụ arụ, ma i kwesịrị ịghọta na anyị ka na-eto eto n’oge ahụ, anyị nwekwara ike ịnwụ echi.”
Ọtụtụ ndị na-anwụghị n’agha ahụ hụsiri anya n’ihi arụrụala ndị ha ji anya ha hụ. Ruo taa, obi ka na-amapụ ụfọdụ n’ime ha, tinyere ndị nke ka bụ ụmụaka n’oge ahụ, ma ha cheta ihe ndị mere n’oge ahụ. Ọ na-adị ha mgbe ụfọdụ ka ihe ndị ahụ hà na-aga ime ọzọ. Ọtụtụ n’ime ha kwụsịrị inwe okwukwe, echiche ha banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ gbanwekwara. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ enweghịzi nsọpụrụ maka onye ọ bụla nke nwere ike isetịpụ ụkpụrụ banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ha bịaziri lewe ihe nile anya dị ka ihe e nwere ike ịgbanwe mgbe ọ bụla.
Ụkpụrụ Omume Ndị Ọhụrụ
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, e bipụtara ọtụtụ akwụkwọ ndị kwuru ihe ndị a chọpụtara banyere àgwà ụmụ mmadụ n’ihe banyere mmekọahụ. Otu n’ime ndị nke e bipụtara na United States n’afọ ndị 1940 bụ akwụkwọ a kpọrọ Kinsey Report, nke dị ihe karịrị narị peeji asatọ. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ bịara malite ikwu banyere mmekọahụ n’ezoghị ọnụ, nke bụ́ ihe a na-ejibughị otú ahụ ekwu. Ọ bụ eziokwu na e mesịrị chọpụta na akwụkwọ ahụ tinyere nnu na ose n’ọnụ ọgụgụ ndị dinara ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwanyị ibe ha nakwa n’ọnụ ọgụgụ ndị nwere ụdị mmekọahụ ndị ọzọ a na-asọ asọ, ihe akwụkwọ ahụ kwuru gosiri otú omume ọma si malite ịla n’ike n’ike mgbe agha ahụ biri.
Ruo oge ụfọdụ, e mere mgbalị iji hụ na a nọgidere na-eme omume ọma, ka ọ́ dịkwa ka à na-eme. Dị ka ihe atụ, na redio, fim, nakwa na televishọn, a malitere inyocha ihe ndị a na-egosi, ma na-ewepụ ihe ndị metụtara mmekọahụ. Ma, e meteghị ya aka. William
Bennett, onye bụ́bu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na United States, kọwara, sị: “Ka ọ na-erule n’afọ ndị 1960, America bịara banyewe nnọọ n’ìsì n’eleghị anya n’azụ, kama imepewe anya.” Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Gịnị mere omume ọma ji lasiwekwuo ike n’afọ ndị 1960?Ihe kpatara ya bụ na ọ bụ n’oge ahụ ka e hiwere òtù na-ahụ maka nnwere onwe ụmụ nwanyị, n’otu oge ahụkwa ka ụzọ e si ele mmekọahụ anya gbanwere nke ukwuu, bụ́ nke mere ka e nwee ihe a sị na ọ bụ ụkpụrụ omume ọhụrụ. Ọzọkwa, e mepụtara mkpụrụ ọgwụ ndị na-egbochi afọ ime. Ebe ọ bụ na a pụziri inwe mmekọahụ n’atụghị ụjọ ịtụrụ ime, ọtụtụ mmadụ bịara “mewe enyi maka mmekọahụ” ma ọ bụ “nwewe mmekọahụ n’enyeghị ndị ọ bụ ha na ha obi ha.”
N’otu mgbe ahụ, ndị na-ede akwụkwọ akụkọ, ndị na-eme fim, na ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ televishọn bịara kwụsịlata ịgbaso ụkpụrụ omume ọma. Ka e mesịrị, Zbigniew Brzezinski, onye bụ́bu onyeisi oche nke Kansụl Na-ahụ Maka Ichebe Mba United States, kwuru banyere ụkpụrụ omume ndị a na-akụzi na TV, sị: “O doro anya na ha na-akụziri ndị mmadụ imejụ ọchịchọ nke onwe ha, ha na-eme ka ime ihe ike na ịta obi mmiri yie ihe dị mma, ha na-agba[kwa] ndị mmadụ ume inwe mmekọahụ aghara aghara.”
Ka ọ na-erule afọ ndị 1970, vidio aghọọlarị ihe a ma ama. Ndị mmadụ pụziri ịnọ n’ime ụlọ ha kirie fim ndị rụrụ arụ a na-egosi ndị na-enwe mmekọahụ na ha, bụ́kwa ụdị fim ha na-agatụghị anwa anwa anọ n’ebe ọhaneze na-anọ ekiri fim, kirie. Na nso nso a, e sila n’Intanet na-eme ka ihe nkiri ndị jọgburu onwe ha, bụ́ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, na-eru onye ọ bụla nwere kọmputa aka n’ụwa nile.
Ihe nke a na-akpata na-emenye ụjọ n’ọtụtụ ụzọ. Otu onye na-arụ n’otu ụlọ mkpọrọ dị na United States kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Afọ iri gara aga, ndị na-eto eto bata n’ụlọ mkpọrọ, mụ na ha pụrụ ikwurịta banyere ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ndị nke na-abata ugbu a amatụghị ihe m na-ekwu banyere ya.”
Ebee Ka Mmadụ Pụrụ Inweta Nduzi?
Anyị apụghị inweta nduzi banyere omume ọma n’aka chọọchị ndị dị n’ụwa. Kama ịkwado ụkpụrụ ezi omume dị ka Jizọs na ndị soro ụzọ ya na narị afọ mbụ mere, chọọchị dị iche iche emeela onwe ha akụkụ nke ụwa na ihe ọjọọ ya nile. Otu onye edemede jụrụ, sị: “Ọ̀ dịtụla agha a lụrụ nke nke ọ bụla n’ime òtù abụọ ahụ na-alụ agha na-ekwughị na Chineke kwụnyeere ha?” A bịa n’ihe banyere ịhụ na a na-agbaso ụkpụrụ omume Chineke setịpụrụ, otu onye ụkọchukwu nọ na New York City kwuru ọtụtụ afọ gara aga, sị: “Chọọchị bụ nanị òtù nọ n’ụwa nke ihe a chọrọ mmadụ n’aka iji bata na ya dị ala karịa ihe a chọrọ mmadụ n’aka iji baa bọs.”
O doro nnọọ anya na otú omume ọma si na-ala n’ike n’ike n’ụwa a kwesịrị ka e mee ihe banyere ya. Ma, gịnị ka a ga-eme banyere ya? Olee mgbanwe ọ dị mkpa ka e mee? Olee onye pụrụ ime ya, oleekwa otú ọ ga-esi mee ya?
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo dị na peeji nke 5]
“Mgbukpọ e gbukpọrọ ndị mmadụ n’Agha Ụwa nke Mbụ [1914-1918] mere nnọọ ka ụmụ mmadụ gharazie iji ndụ ha akpọrọ ihe”
[Igbe dị na peeji nke 6]
OMUME ỌMA NA IHE NDỊ E JI KPỌRỌ IHE
N’oge mbụ, ihe ndị bụ́ omume ọma na-edo onye ọ bụla anya. Ma ọ́ bụghị na mmadụ bụ onye eziokwu, na-eguzosi ike n’ihe, na-adị ọcha n’omume, na-ekwesị nsọpụrụ, ya abụrụ na ọ bụghị. Ma ugbu a, ndị mmadụ na-ewerezi “ihe ndị ha ji kpọrọ ihe” dị ka “omume ọma.” Ma, e nwere nsogbu dị na ya, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Gertrude Himmelfarb si kwuo ya n’akwụkwọ ya bụ́ The De-Moralization of Society. O kwuru, sị: “Mmadụ apụghị ikwu banyere omume ọma otú ọ ga-esi ekwu banyere ihe ndị e ji kpọrọ ihe, a pụghịkwa ikwu . . . na onye ọ bụla nweere onwe ya ịhọrọ omume ọma nke ya.”
O kwuru na mmadụ ‘pụrụ iji nkwenkwe ya, echiche ya, omume ya, mmetụta ya, àgwà ya, ụkpụrụ ya, ihe ndị na-amasị ya, ihe ndị na-adịghị amasị ya, nakwa àgwà ndị na-adịghị mma e ji mara ya kpọrọ ihe—ya bụ, ihe ọ bụla mmadụ ọ bụla ma ọ bụ òtù ọ bụla ji kpọrọ ihe mgbe ọ bụla, ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya mere ha ji jiri ya kpọrọ ihe.’ N’ụwa taa nke onye ọ bụla na-emezi ihe masịrị ya, ndị mmadụ chere na ọ bụghị ihe ọjọọ iji aka ha họrọ ụkpụrụ ha ga-agbaso, dị nnọọ ka ha si ahọrọ ihe ha chọrọ ịzụ n’ahịa. Ma ya dị otú a, gịnị ga-emezi omume ọma nke bụ́ ezigbo ya?
[Foto dị na peeji nke 6 na 7]
Ọ nọgidela na-adịkwu nnọọ mfe inweta ihe ntụrụndụ ndị rụrụ arụ