Ife Chineke Ofufe Ọ̀ Pụrụ Ịtọ Mmadụ Ụtọ?
Echiche nke Bible
Ife Chineke Ofufe Ọ̀ Pụrụ Ịtọ Mmadụ Ụtọ?
OTU nwanyị nke sị na ya bụ Onye Kraịst kwuru, sị: “Ekweere m na Chineke, ahụkwara m ya n’anya. Ma . . . ịga chọọchị na-agwụ m ike.” Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ ndị na-efezi Chineke otú o si masị ha n’ihi na chọọchị agbụla ha, gwụ ha ike ma na-agbakasị ha ahụ́.
Ihe otu akwụkwọ akụkọ kpọrọ ụdị ofufe a bụ “okpukpe onye kpere otú masịrị ya.” Ma, ndị chọrọ ka ofufe ha na-efe Chineke na-atọ ha ụtọ agaghị enweta ọṅụ ma ha na-efe ya otú o si masị ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na otu ihe ahụ mere ha ji si na chọọchị ha pụọ ga-emekwa ha ọzọ.
N’ihi ya, ajụjụ bụ: Ibi ndụ otú Bible kwuru ka a na-ebi ya, ọ̀ na-agwụ ike ma na-eme ka mmadụ ghara inwe ọṅụ? Mbanụ! Dị ka ihe atụ, tụlee okwu a otu ọbụ abụ nke Bible kwuru: “Bịanụ, ka anyị tikuo Jehova mkpu ọṅụ! . . . Batanụ, ka anyị kpọọ isiala hurukwa ala; ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova Onye meworo anyị.”—Abụ Ọma 95:1, 6.
Ọbụ abụ ọzọ nke Bible ji obi ekele bụkuo Jehova abụ, sị: “Nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” N’Akwụkwọ Nsọ, a kpọrọ Jehova “Chineke onye obi ụtọ.” Ọtụtụ mgbe, ndị fere ya n’oge ochie kwupụtara ọṅụ ha nwere. Ndị na-efe ya ofufe taa na-ekwupụtakwa ọṅụ ha nwere.—Abụ Ọma 83:18; 1 Timoti 1:11.
Ihe Mere O Ji Enye Ọṅụ
Ihe mere ife Jehova ofufe ji enye anyị ezigbo ọṅụ bụ na anyị maara ihe Jehova merela iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Gịnị ka o mere? Bible kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa [ụmụ mmadụ] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya [Jizọs Kraịst], ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
N’ihi ya, dị ka Bible kwuru, uche Chineke bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Nke ahụ apụtaghị nanị ịmara ihe amaokwu ụfọdụ nke Bible na-ekwu. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ‘ịghọta ihe ihe anyị na-agụ pụtara.’ Iji nwee ike ịghọta ya, ọ dị mkpa ka anyị jiri nlezianya na ezi obi na-amụ Bible. (Matiu 15:10) Uru ị ga-erite bụ na ‘ị ga-achọta ihe ọmụma Chineke.’ Nke ahụ pụrụ n’ezie ime ka i nwee ọṅụ!—Ilu 2:1-5.
Na narị afọ mbụ, ndị bi n’obodo Biria nke dị na Masedonia nwetara ụdị ọṅụ ahụ. Mgbe Pọl onyeozi kụziiri ha okwu Chineke, “ha ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ, jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe Ọrụ 17:11.
ndị a hà dị otú ahụ.” Ha agaraghị enwe ọchịchọ obi dị otú ahụ ma a sị na Akwụkwọ Nsọ ha na-amụ gwụrụ ha ike, ma ọ bụkwanụ ma a sị na ha enwetaghị ọṅụ na ya.—Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, ebe ọ bụ na a ga-eme ka afọ ju ha.” (Matiu 5:6) Dị ka ọ na-adị ndị agụụ na-emekpọbu ọnụ, bụ́ ndị na-erichi nri anya ugbu a, obi na-atọzi ọtụtụ ndị taa ezigbo ụtọ na ha na-eriju nri ime mmụọ afọ ugbu a. Ya mere, dị ka ndị Biria, “ọtụtụ n’ime ha [aghọọla] ndị kwere ekwe.”—Ọrụ 17:12.
Ụzọ Ndụ
Ndị fere ezi ofufe na narị afọ mbụ nabatara aha bụ́ “Ụzọ Ahụ,” nke bụ́ aha a kpọrọ Ndị Kraịst oge mbụ n’Ọrụ 9:2 n’ihi ụzọ ndụ ọhụrụ ha gbasoro. Taa, ndị chọrọ inweta ụdị ọṅụ a na-enwe n’ife Chineke ofufe ga-emerịrị otu ihe ahụ. Ha kwesịrị ikwe ka eziokwu nke Bible na-akpụzi echiche ha na omume ha kwa ụbọchị.
Ya mere, Pọl onyeozi gbara ndị Efesọs ume, sị: “Yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga.” Ma, a ka nwere ihe ọzọ a chọrọ n’aka ha. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”—Ndị Efesọs 4:22-24. *
Ọ bụrụ na anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ ahụ ma na-eme mgbanwe ndị kwekọrọ n’uche Chineke ná ndụ anyị, mgbe ahụ ka anyị ga-aghọta isi ihe na-eme ka anyị nwee ezigbo ọṅụ na afọ ojuju. Gịnị ka ọ bụ? Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi ma gwa ha na ha kwesịrị ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha ‘ka ha wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) N’eziokwu, anyị na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị maara na otú anyị si ebi ndụ na-amasị ezi Chineke! Chineke na-emekwa ka o kwe anyị omume ime ihe na-amasị ya “n’ụzọ zuru ezu.” Olee otú o si eme nke a? Ọ bụ site n’ịgbaghara anyị mmehie anyị.
Onye ọ bụla n’ime anyị na-eme mmehie; ọ dịkwa onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ka Chineke gbaghara ya mmehie ya. Na 1 Timoti 1:15, Pọl kwuru, sị: “Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.” Mgbe Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà n’ihi anyị, o mere ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ya mere, ahụ́ na-eru onye na-efe Chineke ezi ofufe ala n’ihi na e wepụrụla ya ihe gaara eme ka ọ na-enwe obi amamikpe. Ọ pụrụ inwe akọ na uche dị ọcha. Ọ pụkwara ịṅụrị ọṅụ n’ihi na obi siri ya ike na ọ bụrụhaala na ọ na-agba mbọ ime uche Chineke, a ga-agbaghara ya mmehie ya.
Ihe Ọzọ Mere O Ji Enye Ọṅụ
Mgbe mmadụ malitere ife ezi Chineke ofufe, ọ bụghị nanị ya bụ onye na-efe ezi Chineke ofufe. Otu n’ime ọbụ abụ nke Bible bụ́ Devid dere, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.” (Abụ Ọma 122:1) N’ezie, iso ndị ọzọ, bụ́ ndị na-efe ezi ofufe, na-ezukọta mgbe nile, na-eme ka anyị nwekwuo ezigbo ọṅụ.
Mgbe otu nwoke bịasịrị ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, o dere, sị: “Otú e si jiri obiọma nabata anyị ma nyere anyị aka gosiri na onye ọ bụla na ibe ya ‘dị n’otu.’ Ọ ga-abụrịrị na otú ahụ́ si ruo ọtụtụ ndị na-eto eto ala na-eme ka obi dị ma ha ma ndị mụrụ ha ụtọ. Obi dị m ụtọ ikwupụta ekele m nwere maka otú e si kpọọ m ịbịa nzukọ dị otú ahụ nke na-enye ọṅụ ma na-akpali akpali.”
Gị onwe gị kwa pụrụ inweta ọṅụ na obi ụtọ n’oge ị na-ewepụta iji fee Jehova ofufe dị ka Devid oge ochie nwetara. Ọ gbara anyị ume, sị: “Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe. Werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu Ya.” (Abụ Ọma 100:2) Ndị nile ji ezi obi na-ejere Chineke ozi pụrụ ịtụ anya na ofufe ha na-efe ya ga na-atọ ha ụtọ.
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 14 Ọ bụrụ na ị gụọ Ndị Efesọs isi nke anọ na Ndị Kọlọsi isi nke atọ, ị ga-ahụ nke ọma ihe iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ a pụtara.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Olee ihe na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ na-efe Chineke ezi ofufe?—1 Timoti 2:3-6.
▪ Olee otú àjà mgbapụta Kraịst si eme ka anyị nwee ọṅụ?—1 Timoti 1:15.
▪ Olee otú nzukọ Ndị Kraịst pụrụ isi nyere gị aka ka ofufe ị na-efe Chineke na-atọ gị ụtọ?—Abụ Ọma 100:1-5.
[Foto dị na peeji nke 28]
Iso ndị ọzọ na-amụkọ Bible ọnụ pụrụ ime ka mmadụ nwee ọṅụ