Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Nwee Obi Ụtọ Ma Ahụ́ Adịghị M?

Olee Otú M Ga-esi Nwee Obi Ụtọ Ma Ahụ́ Adịghị M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Otú M Ga-esi Nwee Obi Ụtọ Ma Ahụ́ Adịghị M?

ILU 20:29 kwuru, sị: “Ịma mma nke ndị na-eto eto bụ ike ha.” (The Jerusalem Bible) Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ, i nwere ike iche na amaokwu Baịbụl ahụ enwetụghị ike ịgbasa gị. Ma, o nwere ike ịgbasa gị! Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị ntorobịa nwere nkwarụ na ndị nke na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala emeriela ihe mgbochi ndị kasị sie ike. Teta! gbara anọ n’ime ndị ntorobịa dị otú ahụ ajụjụ ọnụ.

Hiroki, onye bi na Japan, na-arịa ọrịa ụbụrụ kemgbe a mụrụ ya. O kwuru, sị: “Olu m anaghị ebuli isi m, m chọọkwa imeghe aka m, ya ana-emechi emechi. Ọ bụ ndị ọzọ na-emere m ihe niile.”

Natalie na nwanne ya nwoke, bụ́ James, bụ́ ndị bi na South Africa, bụ nnọọ ndị akakpọ site n’ọmụmụ. Natalie nwekwara ọrịa nke mere ka ọkpụkpụ azụ ya gbagọọ agbagọọ. O kwuru, sị: “A waala m ahụ́ n’ọkpụkpụ azụ ugboro anọ, n’ihi otú azụ m sikwa gbagọọ agbagọọ, akpa ume m anaghị arụ ọrụ nke ọma.”

Timothy, bụ́ onye bi na Britain, dị afọ iri na asaa mgbe a chọpụtara na o nwere ọrịa oké ike ọgwụgwụ. O kwuru, sị: “N’ihe na-erughị ọnwa abụọ, mụnwa ahụ́ gbasiburu ike ghọziri onye ike na-agwụ nke na ụkwụ m anaghịzi ebuli m.”

Danielle, bụ́ onye bi n’Australia, dị afọ iri na itoolu mgbe a chọpụtara na o nwere ọrịa shuga. O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọrịa shuga abụghị ọrịa a na-ahụ anya, ụfọdụ ndị amaghị na ọ bụghị obere ọrịa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọrịa shuga nwere ike igbu m.”

Ya bụrụ na ị na-arịa ọrịa ma ọ bu nwee nkwarụ, o doro anya na ihe ndị Hiroki, Natalie, Timothy, na Danielle kwuru ga-agba gị ume. Ọ bụrụ na ahụ́ gbasiri gị ike, ihe ndị ha kwuru nwere ike inyere gị aka ịghọta nsogbu ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ na-enwe.

Teta!: Olee ihe kasị enye gị nsogbu n’ọrịa gị?

Natalie: Ihe kasị enye m nsogbu bụ ihe ndị mmadụ na-eme ma ha hụ m. Ahụ́ anatụghị eru m ala. Ọ na-adị m ka ndị mmadụ hà na-elegide m anya mgbe niile.

Danielle: Nsogbu kasị ukwuu m na-enwe n’ọrịa shuga m na-arịa bụ ịmata ihe m ga-eri, otú m ga-eriru ya, na nri ndị m na-ekwesịghị iri nnukwu. Ọ bụrụ na akpachaaraghị m anya banyere ihe ndị m na-eri, shuga dị n’ọbara m nwere ike ịgbada gabiga ókè, bụ́ nke nwere ike ime ka m tụbọọ.

Hiroki: Enwere m otu oche nkwagharị a rụrụ naanị maka m, kwa ụbọchị, m na-anọkwa n’otu ebe ruo ihe dị ka awa iri na ise n’emegharịghị ahụ́. Ọzọkwa, anaghị m ehi ụra nke ọma. Obere ụzụ na-emete m.

Timothy: Ná mmalite, ihe kasị siere m ike bụ ikweta na ahụ́ adịghị m. Ọrịa m na-eme m ihere.

Teta!: Olee nsogbu ndị ọzọ ị na-enwe?

Danielle: Ọrịa shuga na-eme nnọọ ka ike na-agwụ m. Ahụ́ m na-achọ ụra karịa ahụ́ ndị ọgbọ m. Ọzọkwa, ọrịa shuga enweghị ọgwụgwọ.

Natalie: Mkpụmkpụ m dị na-enye m nnọọ nsogbu. Ime obere ihe ndị dị ka iwere ihe n’elu shelf na-abụrụ m nsogbu. Mgbe m gara ịzụ ihe n’ụlọ ahịa naanị m, ọ naghị adịrị m mfe.

Timothy: M na-anọ n’ahụ́ ụfụ mgbe niile, o nwekwara oge ndị obi na-ajọ m njọ. Tupu ọrịa m amalite, m dị nnọọ garagara. M na-arụ ọrụ ma na-akwọ ụgbọala. M na-egwu egwuregwu ndị dị ka bọl ụkwụ na squash. Ugbu a, anazighị m esi n’oche nkwagharị ebili.

Hiroki: M nwere nsogbu ikwu okwu. Nke a na-agwụ m ike ma na-eme ka m ghara ịchọ ịgwa ndị mmadụ okwu. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka m kụọ mmadụ aka n’amaghị ama. Mgbe nke a mere, anadịghị m enwe ike ịsị “ndo,” n’ihi nsogbu ikwu okwu m.

Teta!: Olee ihe nyeerela gị aka idi ọrịa gị?

Danielle: M na-agbalị iche banyere ihe ọma ndị meere m ná ndụ. Ezinụlọ m na-akwado m, m nwere ọtụtụ ezi ndị enyi n’ọgbakọ, nke kasịkwa nke bụ na Jehova Chineke na-akwado m. M na-agbalịkwa ịgụ ihe ọhụrụ ọ bụla e bipụtara banyere otú onye nwere ọrịa shuga ga-esi na-enyere onwe ya aka. M na-eme ihe m kwesịrị ime banyere ọrịa m ma na-eme ike m niile iji lekọta onwe m anya.

Natalie: Ekpere na-enye m ike. M na-agbalị igbo mkpa m otu otu. Iji ọrụ n’aka na-enyere m aka ịghara ichewe banyere ihe ndị na-enweghị isi. M nwekwara ezigbo nne na nna ndị m nwere ike ịkọrọ otú obi dị m.

Timothy: M na-eme ihe metụtara ofufe Chineke kwa ụbọchị, a sịgodị na ọ bụ obere oge ka m ji eme ya. Dị ka ihe atụ, m na-eji ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị amalite ụbọchị ọ bụla. Ịmụ Baịbụl n’onwe m na ikpe ekpere na-adị m ezigbo mkpa, karịsịa mgbe obi na-adịghị m mma.

Hiroki: M na-agbalị ịghara ichegbuwe onwe m banyere ihe ndị ọ na-adịghị ihe m nwere ike ime banyere ha. Ime otú ahụ bụ igbu oge. Ma, m na-eme ihe niile m nwere ike ime iji meziwanye mmekọrịta mụ na Chineke, ọnọdụ m anaghịkwa eme ka m hapụ ịmụ Baịbụl. Mgbe ụra na-ekweghị atụ m, m na-ewere ya dị ka oge m ga-eji kpee ekpere.—Gụọ Ndị Rom 12:12.

Teta!: Olee otú ndị ọzọ sirila gbaa gị ume?

Hiroki: Ndị okenye na-aja m mma mgbe niile maka obere ihe ndị m na-emeli. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị mụ na ha nọ n’ọgbakọ na-akpọrọkwa m mgbe ha na-aga nletaghachi ma ọ bụ iduzi ọmụmụ Baịbụl.—Gụọ Ndị Rom 12:10.

Danielle: Ọ dị m ka ihe na-akasị emetụ m n’ahụ́ bụ mgbe ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị mụ na ha nọ n’ọgbakọ ji obi ha niile jaa m mma. Ọ na-eme ka m mara na e ji m kpọrọ ihe, ọ na-agbakwa m ume ịnọgide na-edi nsogbu m.

Timothy: E nwere otu nwanna nwaanyị merela agadi nke na-agba nnọọ mbọ ịhụ na mụ na ya kwurịtara okwu mgbe ọ bụla a gara ọmụmụ ihe. Ndị okenye na ndị nwunye ha agbaakwala m ume ma tụọrọ m aro ndị nyeere m aka. Otu okenye nke dị afọ iri asatọ na anọ enyerela m aka inwe ihe mgbaru ọsọ ndị m ga-enwe ike iru. Otu ohu na-eje ozi kpọrọ m ka m soro ya jee ozi ọma, o mekwara ndokwa ka anyị rụọ ebe ugwu na-adịghị bụ́ ebe ọ ga-adịrị m mfe iji oche nkwagharị m gaa.—Gụọ Abụ Ọma 55:22.

Natalie: Ozugbo m banyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị na-eji ihu ọchị ekele m. Ndị nke merela agadi na-enwe ihe ndị na-agba ume ha ga-agwa m mgbe niile n’agbanyeghị na ha nwere nsogbu nke ha.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:16, 17.

Teta!: Olee ihe na-enyere gị aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ?

Hiroki: Ebe m bụ Onyeàmà Jehova, mụ na ndị nwere olileanya magburu onwe ya na-akpakọ. Ịghọta ụdị nzukọ m nọ na ya na-eme m obi ụtọ.—Gụọ 2 Ihe E Mere 15:7.

Danielle: M na-eche banyere ihe ùgwù m nwere ịghọta nzube Chineke. E nwere ndị ahụ́ gbasiri ike, ma ndụ ha ejughị ha afọ otú nke m si ju m.—Gụọ Ilu 15:15.

Natalie: Ọ na-adị m mkpa ka mụ na ndị na-enwe obi ụtọ na-anọ mgbe niile. Ọ na-agbakwa m ume ịgụ ahụmahụ nke ndị ọzọ na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị nsogbu ndị nke ha. Mgbe ọ bụla m gakwara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ana m ama na a ga-agba m ume ma chetara m na ọ bụ ihe ùgwù ịbụ Onyeàmà Jehova.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

Timothy: Ndị Kọrịnt nke Mbụ 10:13 kwuru na Jehova agaghị ekwe ka a nwaa anyị ọnwụnwa anyị na-agaghị edili. M na-agwa onwe m na ọ bụrụ na Onye kere m tụkwasịrị m obi na m ga-edili ọnwụnwa a, ònye ka m bụ ịgbaghawa ya?

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Hiroki na Timothy anaghị esi n’oche nkwagharị ebili. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ yiri nke ha, olee otú ihe ndị ha kwuru nwere ike isi nyere gị aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ?

▪ Danielle kwuru na “ebe ọ bụ na ọrịa shuga abụghị ọrịa a na-ahụ anya, ụfọdụ ndị amaghị na ọ bụghị obere ọrịa.” Gịnwa, ị̀ na-arịa ọrịa ‘a na-anaghị ahụ anya’ dị ka Danielle? Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe ị ga-amụta n’ihe ndị Danielle kwuru?

▪ Natalie kwuru na nsogbu kasị ukwuu ya nwere bụ ihe ndị mmadụ na-eme ma ha hụ ya. Olee otú i nwere ike isi mee ka ahụ́ ruo onye dị ka Natalie ala? Ọ bụrụ na i nwere ọrịa ma ọ bụ nkwarụ nke na-eme ka i nwee ụdị echiche ahụ Natalie nwere, olee otú i nwere ike isi nọgide na-enwe obi ụtọ dị ka ya?

▪ Dee aha ndị ị maara nwere nkwarụ ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala n’okpuru ebe a.

․․․․․

▪ Olee ihe i nwere ike ime iji nyere onye nke ọ bụla n’ime ha aka?

․․․․․

[Igbe dị na peeji nke 17]

Nkasi Obi Sitere na Baịbụl

Jizọs nwere ezi ọmịiko n’ahụ́ ndị na-arịa ọrịa.—Mak 1:41.

Jizọs gosiri otú a ga-esi gwọọ ndị ọrịa n’Alaeze Chineke site ‘n’ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.’—Matiu 4:23.

N’ụwa ọhụrụ Chineke, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa,’” ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.—Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:1-4.

‘A ga-emedị ka ọnwụ ghara ịdị irè.’—1 Ndị Kọrịnt 15:25, 26.

[Foto dị na peeji nke 16]

Hiroki, onye dị afọ 23 nke bi na Japan

[Foto dị na peeji nke 16]

Natalie, onye dị afọ 20 nke bi na South Africa

[Foto dị na peeji nke 16]

Timothy, onye dị afọ 20 nke bi na Britain

[Foto dị na peeji nke 16]

Danielle, onye dị afọ 24 nke bi n’Australia