Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere

Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere

Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere

▪ Mgbe ụlọ akwụkwọ Mọgan, bụ́ otu nwatakịrị dị afọ asaa, na-achọ ịga ezumike, a gwara ndị klas ha ka ha gụọ akụkọ banyere ememme Krismas. Mọgan gwara onye nkụzi ha na Baịbụl akwadoghị ememme ahụ. Onye nkụzi ha gwaziri ya ka ọ gụọ akụkọ ọzọ akọnuche ya ga-ekwe ya gụọ.

Ka e mechara, ụlọ akwụkwọ ha mere ememme e ji enye ụmụaka ndị mere nke ọma onyinye, a kpọkwara ndị ezinụlọ Mọgan n’ememme ahụ. Mgbe ha bịara ememme ahụ, o juru Mọgan anya mgbe e nyere ya onyinye n’ihi na o ji obi ike gbachitere ihe o kweere. Mgbe a jụrụ ya otú o si mụta inwe obi ike, o kwuru na ya na ndị ezinụlọ ya na-amụ akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ebe e si nweta ihe a kọwara n’akwụkwọ ahụ bụ n’akụkọ ndụ Jizọs Kraịst na n’ihe ndị ọ kụziri.

Akwụkwọ a, nke dị peeji 256 ma nwee ihe osise ndị mara mma, ga-enyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka ịkparịta ụka. N’ime ya, e nwere isiokwu ndị dị ka “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha,” “Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?,” na “Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị.”

Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ e sere n’ebe a. Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.