Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mma Ikpegara “Ndị Senti” Ekpere?

Ọ̀ Dị Mma Ikpegara “Ndị Senti” Ekpere?

Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Mma Ikpegara “Ndị Senti” Ekpere?

Marie na Theresa weere na ha bụ “ezigbo ndị Katọlik.” Ha abụọ kweere ná “ndị senti.” Marie kweere na ya kpegara ndị senti ekpere, ha ga-enyere ya aka. Theresa na-ekpegara “senti” a sị na ọ bụ ya na-echebe obodo ha ekpere mgbe niile. Ọ na-ekpegakwara “senti” nke a na-akpọ Theresa ekpere.

ỌTỤTỤ nde ndị bi n’ụwa na-ekpegara “ndị senti” ekpere ka ha nyere ha aka, otú ahụ Marie na Theresa si ekpegara ha. Dị ka otu akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia si kwuo, ‘ndị senti na-arịọchitere ụmụ mmadụ arịrịọ, ọ dịkwa mma ikpegara ha ekpere ma si n’aka ha nweta ngọzi n’aka Chineke.’

Ma, olee otú Chineke si ele okwu a anya? Ọ̀ dị mma ikpegara “ndị senti” ekpere ka ha rịọchitere anyị arịrịọ n’aka Chineke? Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru.

Ànyị Kwesịrị Ikpegara “Ndị Senti” Ekpere?

Na Baịbụl ụfọdụ, otú e si sụgharịa okwu Grik ahụ bụ́ “senti” bụ “onye nsọ.” Ma o nweghị ebe Baịbụl kwuru na e nwere onye na-efe Chineke nke kpegaara “senti” ọ bụla ekpere. Gịnị mere na e nweghị? Akwụkwọ ahụ anyị kpọrọ aha na mbụ kwuru na ọ bụ na “narị afọ nke atọ ka ndị mmadụ matara na ikpegara ndị senti ekpere dị mkpa ma baa uru.” Nke ahụ bụkwa ihe dị ka narị afọ abụọ ka Kraịst nwụchara. N’ihi ya, ọ bụghị Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya ndị so dee Baịbụl kụziiri ndị mmadụ ka ha na-ekpegara ndị senti ekpere. Gịnị mere na ha akụzighị ya?

Baịbụl kwuru ugboro ugboro na ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere, nakwa na anyị ga-ekpe ya n’aha Jizọs Kraịst. Jizọs sịrị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.” (Jọn 14:6, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ihe a doro anya e kwuru ebe a kwekọrọ n’ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:9-13. Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ gwara ha, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. . . . ” (Matiu 6:9) O doro anya na Nna anyị nke eluigwe bụ naanị onye anyị kwesịrị ikpegara ekpere. Ihe mere e ji kwuo ka a na-ekpegara naanị Chineke ekpere bụ n’ihi otu ihe dị mkpa Baịbụl kwuru.

Ekpere Bụ Otu Ụzọ E Si Efe Chineke

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ‘ekpere bụ iji nkwanye ùgwù gwa Chineke, ndị bụ́ chi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ a na-efe ofufe, okwu. . . . Ekpere bụ otu ụzọ dị mkpa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpe niile dị n’ụwa si efe ofufe.’ Jụọ onwe gị sị, ‘Ọ̀ dị mma igbu ikpere n’ala kpegara onye ọzọ na-abụghị Onye kere anyị na Onye nyere anyị ndụ ekpere?’ (Abụ Ọma 36:9) Jizọs kwuru, sị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Baịbụl kwukwara na Onye kere anyị chọrọ ka anyị fee ya ofufe “a na-ekewaghị ekewa.”—Diuterọnọmi 4:24; 6:15.

Legodị ihe Jọn onyeozi bụ́ onye soro ụzọ Kraịst mere. Mgbe otu mmụọ ozi gosiri ya ọhụụ ndị tụrụ ya n’anya, bụ́ nke e dere n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe, ọ ‘dara n’ala n’ụkwụ mmụọ ozi nke nọ na-egosi ya ihe ndị a ka o fee ya ofufe.’ Gịnị ka mmụọ ozi ahụ mere? Ọ sịrị, “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị . . . Fee Chineke.” (Mkpughe 22:8, 9) N’ebe a kwa, Baịbụl gosiri na ọ bụ naanị Jehova Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere.

Iji kwadokwuo ihe a a na-ekwu, ọ bụ naanị Chineke ka a kpọrọ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ebe ọ bụkwa ya bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ bụ naanị ya nwere ikike, amamihe na ike ọ ga-eji meere anyị ihe ọ bụla ziri ezi anyị rịọrọ ya n’ekpere. (Job 33:4) Jizọs Kraịst n’onwe ya kwudịrị na e nwere ihe ndị na-adịghị yanwa bụ́ Jizọs n’aka ime. (Matiu 20:23; 24:36) N’agbanyeghị nke ahụ, e nyere Jizọs Kraịst nnukwu ọrụ, otu n’ime ya bụ ka ọ na-arịọchitere ụmụ mmadụ arịrịọ.

Onye Na-arịọchitere Anyị Arịrịọ nke Nwere Obi Ebere

Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “O nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.” (Ndị Hibru 7:25) Ihe ebe a na-ekwu bụ na Jizọs bụ onye na-eji obi ebere arịọchitere ndị niile “na-abịaru Chineke nso site na ya” arịrịọ. Nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ikpegara Jizọs ekpere ka yanwa bugaziere ya Chineke. Kama, ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị isi n’aha Jizọs kpegara Chineke ekpere iji gosi na anyị ghọtara na ọ bụ ya ka Chineke nyere ikike ịrịọchitere anyị arịrịọ. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jizọs ruru eru ịrịọchitere anyị arịrịọ?

Otu ihe bụ na Jizọs ebitụla ndụ n’ụwa dị ka mmadụ, nke ahụ emeekwala ka ọ ghọta nnọọ ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. (Jọn 11:32-35) Ihe ọzọkwa bụ na ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa, kpọlite ndị nwụrụ anwụ ma kụziere ndị niile bịakwutere ya Okwu Chineke iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya. (Matiu 15:29, 30; Luk 9:11-17) Ọ gbaghadịịrị ndị mmehie mmehie ha. (Luk 5:24) Nke a na-eme ka obi sie anyị ike na anyị mee mmehie, “anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.”—1 Jọn 2:1.

Anyị kwesịrị ịgbalị inwe ụdị ịhụnanya na obi ebere Jizọs nwere. N’agbanyeghị na e nyeghị anyị ikike ịrịọchitere ndị ọzọ arịrịọ, anyị nwere ike ikpe ekpere maka ndị ọzọ. N’eziokwu, ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ kwesịrị ime ka anyị kpee ekpere maka ha. Jems dere, sị: “Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere. Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.”—Jems 5:16.

Marie na Theresa mụtara eziokwu ndị a anyị kọwara ebe a mgbe ha mụrụ Baịbụl. Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ka ị mụọkwa Baịbụl. Dị nnọọ ka Jizọs kwuru, “ndị na-efe [Chineke] ofufe ga-efe ya ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.”—Jọn 4:24.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Ònye ka Jizọs kwuru na ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere?—Matiu 6:9.

● Olee ọrụ Jizọs na-arụ?—Ndị Hibru 7:25.

● Ànyị kwesịrị ikpe ekpere maka ndị ọzọ?—Jems 5:16.