Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Mbụ Niile . . . Agaghị Abatakwa n’Obi”

“Ihe Mbụ Niile . . . Agaghị Abatakwa n’Obi”

“Ihe Mbụ Niile . . . Agaghị Abatakwa n’Obi”

O nwere ihe dị ịtụnanya Chineke kwuru na ya ga-eme n’ọdịnihu. Ọ sịrị:

“Lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—AỊZAYA 65:17.

Gịnị bụ ihe mbụ niile ahụ na-agaghị abata n’obi? Ihe ndị e kwuru n’Aịzaya isi iri isii na ise gosiri na ọ bụ ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, nhụjuanya, na ihe ndị ọzọ na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ taa. Olee ihe ga-eme ka ha ghara ịbatakwa ụmụ mmadụ n’obi? Amaokwu Baịbụl ahụ sị na ọ bụ maka na a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”

Malite n’ọnwa Septemba afọ a, Ndịàmà Jehova na Naịjirịa ga-enwe Mgbakọ Distrikti nke isiokwu ya bụ “Chebe Obi Gị!” Ná mgbakọ ahụ, a ga-akọwa ihe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ pụtara n’isiokwu bụ́ “Ihe Mbụ Niile . . . Agaghị Abatakwa n’Obi.”

Gbalịa gaa mgbakọ ahụ. A ga-enwe ya n’ọtụtụ ebe na Naịjirịa. Ị chọọ ịma ebe dị gị nso ị ga-aga ya, jụọ Onyeàmà Jehova ọ bụla bi n’ebe i bi ma ọ bụkwanụ gị edetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi. Ị gaakwa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.mr1310.com, ị ga-ahụ ebe niile a ga-enwe mgbakọ ahụ n’ụwa niile.