Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Nsogbu Na-adịghị Ị̀ Ga-achọ Ibi na Ya?

Ụwa Nsogbu Na-adịghị Ị̀ Ga-achọ Ibi na Ya?

Ụwa Nsogbu Na-adịghị Ị̀ Ga-achọ Ibi na Ya?

● Isiokwu ndị dị ná mbido magazin a kwuru ihe ndị mmadụ n’ụwa niile na-atụsi anya ya ike. Ọ na-agụsi ha agụụ ike ibi n’ụwa nke nsogbu na-adịghị. Ì chere na a ga-enwe mgbe nsogbu na-agaghị adị n’ụwa a?

Ndịàmà Jehova, ndị bipụtara magazin a, kweere na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu. Baịbụl bụ naanị akwụkwọ kọọrọ anyị otú nsogbu anyị si malite. O kwukwara otú ihe ga-esi gbanwee n’ọdịnihu, nke ga-eme ka ihe dị mma n’ụwa, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị chere na o nwekataghị ka ihe dị mma.

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru gbasara otú ihe ga-esi dị mma n’ụwa? Akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ga-enyere gị aka. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ha ebipụtala ya na narị asụsụ abụọ na iri anọ na anọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetaranụ m akwụkwọ a e sere n’ebe a.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.