Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Olee Mgbe Anyị Ga-enwe Mgbakọ Ọzọ?”

“Olee Mgbe Anyị Ga-enwe Mgbakọ Ọzọ?”

E NWERE ihe mere ná ngwụcha ọnwa iri na otu n’afọ 1932 n’obodo Meksiko. Naanị otu izu tupu mgbe ahụ, e tinyere ọkụ ndị na-agwa ndị bu ụgbọala mgbe ha ga-akwụsịtụ na mgbe ha ga-agawa n’obodo a na-ekwo ekwo nke ndị bi na ya karịrị otu nde mmadụ. Ma, ọkụ ahụ e tinyere bụzi akụkọ ochie. Ihe ndị nta akụkọ obodo ahụ na-ekwuzi bụ ihe ndị mere n’izu na-eso ya. Ha ji kamera nọrọ n’ụgbọ okporo ígwè na-eche ka Nwanna Joseph F. Rutherford, bụ́ onye ọbịa pụrụ iche rute. Ọ bụ ya bụ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ. Ụmụnna ndị bi n’obodo ahụ nọkwa na-eche ka ha nabata Nwanna Rutherford, bụ́ onye bịara iso ha nwee mgbakọ abalị atọ ha ga-enwe.

Akwụkwọ bụ́ The Golden Age kwuru, sị: “O doro anya na a ga-edetu mgbakọ a n’akụkọ ihe mere eme dị ka ihe dị mkpa ná mbọ a na-agba izisa ozi ọma na Meksiko.” Ma, gịnị mere mgbakọ a ji dị mkpa ebe ọ bụ na ọ bụ naanị otu narị mmadụ na iri ise bịara ya?

Tupu mgbakọ ahụ, ndị mụtara eziokwu Baịbụl ebubeghị ibu na Meksiko. Kemgbe afọ 1919, a na-enwe mgbakọ, ma mgbe afọ ole na ole gafere, ọgbakọ e nwere ebughịzi ibu. Mgbe e nwere alaka ụlọ ọrụ na Meksiko n’afọ 1929, o yiri ka ihe ọ̀ ga-aka mma. Ma, e nwere nsogbu ndị dapụtaranụ. Mgbe nzukọ Jehova gwara ndị kọpọtụa, bụ́ ihe a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ n’oge ahụ, ka ha ghara ịna-atụ mgbere ahịa ma ha nọrọ ozi ọma. Otu onye kọpọtụa were iwe hapụ ọgbakọ mepee chọọchị nke ya. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka a gbanwere onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ na Meksiko n’ihi ihe ọjọọ o mere. Ụmụnna ndị ọzọ nọ na Meksiko kwesịrị ka a gbaa ha ume.

Mgbe Nwanna Rutherford bịara, ọ gbara ụmụnna ji obi ha niile na-efe Jehova ume. Okwu abụọ o kwuru ná mgbakọ ahụ tọrọ ndị mmadụ ụtọ, ha egerekwa okwu ise o kwuru na redio. Nke a bụ nke mbụ ụmụnna ji redio zie ozi ọma n’obodo Meksiko niile. Mgbe e mechara mgbakọ ahụ, a họpụtara onye ga na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ ma na-ahazi ọrụ. Jehova nyeere ụmụnna aka, ha ejirizie ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma.

Mgbakọ e nwere n’isi obodo Meksiko n’afọ 1941

N’afọ 1933, e mere mgbakọ abụọ na Meksiko. E mere otu na Veracruz, mee nke ọzọ n’isi obodo Meksiko. Ụmụnna kwusasiri ozi ọma ike, ya abaakwa ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1931, e nwere ndị nkwusa iri asatọ na abụọ. N’afọ 1941, ndị nkwusa e nwere karịrị ndị nkwusa e nweburu okpukpu iri. Ihe dị ka otu puku mmadụ bịara n’isi obodo Meksiko maka mgbakọ e nwere n’afọ ahụ.

“MKPỌSA A KPỌSARA N’OKPORO ÁMÁ”

N’afọ 1943, Ndịàmà Jehova malitere ịkpọsa maka mgbakọ a ga-enwe n’obodo iri na abụọ na Meksiko nke isiokwu ya bụ, “Mba Nweere Onwe Ya.” * Otú ha si mee ya bụ iyiri obodobo akwụkwọ abụọ e dere ihe na ya. Ha dụkọtara obodobo akwụkwọ abụọ ahụ, konye ha n’ubu ha. Otu anọrọ n’ihu nke ọzọ anọrọ n’azụ. Ndịàmà Jehova esila otú a kpọsaa maka mgbakọ ha kemgbe afọ 1936.

Ebe ụmụnna konyere obodobo akwụkwọ e dere ihe na ya, na-akpọsa mgbakọ a ga-enwe n’isi obodo Meksiko, n’afọ 1944

Iji obodobo akwụkwọ ahụ e dere ihe na ya kpọsaa mgbakọ ahụ gara nke ọma na Meksiko. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ akụkọ bụ́ La Nación ji dee banyere ụmụnna bịara mgbakọ ahụ, sị: “N’ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, a gwara ha ka ha kpọkwuo ndị mmadụ òkù ka ha bịa. N’echi ya, ndị bịaranụ karịrị akarị nke na ebe a nọ mee mgbakọ ahụ abaghịzi ndị mmadụ.” Obi adịghị Chọọchị Katọlik mma maka ihe a. N’ihi ya, ha megidewere Ndịàmà Jehova. Ma, ụjọ atụghị ụmụnna anyị, ha akwụsịghịkwa ịkpọsa maka mgbakọ ahụ. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ndị obodo ahụ niile hụrụ ha . . . ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị kocha ‘obodobo akwụkwọ ndị ahụ e dere ihe na ha.’” Isiokwu ahụ gosiri foto ụmụnna ndị nọ n’okporo ámá na-akpọsa mgbakọ ahụ n’isi obodo Meksiko. Ihe e dere n’okpuru foto ahụ bụ: “Mkpọsa a kpọsara n’okporo ámá.”

“ÀKWÀ NDỊ KA ALA SIMENTỊ MMA”

N’afọ ahụ niile, ọtụtụ ụmụnna hapụrụ ihe niile ha na-eme ka ha nwee ike gaa mgbakọ ole na ole ndị e nwere na Meksiko. Ọtụtụ ndị si n’ime ime obodo, bụ́ ebe ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ ụgbọala na-anaghị erute. Otu ọgbakọ dere, sị: “Ọ bụ naanị eriri telegram dị nso n’obodo anyị.” N’ihi ya, ihe ndị bịara mgbakọ ahụ mere bụ ịgba ịnyịnya ibu ma ọ bụ iji ụkwụ gaa ije ọtụtụ ụbọchị ka ha nwee ike inweta ụgbọ okporo ígwè ga-ebuga ha ebe a na-enwe mgbakọ ahụ.

Ọtụtụ ụmụnna ndị ahụ dara ogbenye, naanị ego ha nwere bụ nke ha ji gbaa ụgbọ rute n’ebe ahụ a na-eme mgbakọ. Mgbe ha rutere, ọtụtụ n’ime ha nọ n’ụlọ ụmụnna ndị bi n’obodo ahụ. Ụmụnna ndị a nabatara ha nke ọma. Ndị ọzọ ehie n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwere mgbe ihe dị ka ụmụnna iri itoolu hiri n’alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo ahụ. Ihe ha ji mere àkwà bụ katọn akwụkwọ juru n’ime ya. Akwụkwọ Mgbaafọ ahụ kwuru na obi dị ụmụnna ndị ahụ ụtọ n’ihi na “àkwà ndị ahụ ka ala simentị mma.”

Ụmụnna ndị ahụ nwere ezigbo obi ụtọ ha na ụmụnna ha izukọta. Mbọ ha gbara ịbịa mgbakọ ahụ efughị ọhịa. Taa, ihe fọrọ obere ka o ruo otu nde ụmụnna nọ na Meksiko ka na-enwe ụdị obi ụtọ ahụ. * Akwụkwọ Mgbaafọ nke afọ 1949 kwuru na ahụhụ ụmụnna ndị ahụ tara ịga mgbakọ ahụ emeghị ka ha daa mbà. Ha gachaa mgbakọ ọ bụla lọta, ha “anaghị akọcha akụkọ ya akọcha.” Ajụjụ ụmụnna ndị ahụ na-ajụkarị bụ, “Olee mgbe anyị ga-enwe mgbakọ ọzọ?”​—⁠Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie n’Ebe Ndịda Kọntinent Nọt Amerịka.

^ para. 9 Ihe Akwụkwọ Mgbaafọ 1944 nke Bekee kwuru gosiri na mgbakọ a mere ka a matakwuo Ndịàmà Jehova na Meksiko.

^ para. 14 N’afọ 2016, ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na Meksiko dị 2,262,646.