Ahụ́ Ike
Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike. Ma, ihe ndị o kwuru na-enyere mmadụ aka inwe ezigbo ahụ́ ike. Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo ahụ́ ike.
NA-ELEKỌTA ONWE GỊ NKE ỌMA
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.”—Ndị Efesọs 5:29.
IHE Ọ PỤTARA: Amaokwu Baịbụl a na-agba anyị ume ka anyị na-elekọta ahụ́ anyị nke ọma. Otu nchọpụta e mere gosiri na ihe na-akpata ọtụtụ ọrịa ndị mmadụ na-arịa bụ otú ha si ebi ndụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ana-elekọta onwe ya nke ọma, ọ ga-eme ka o nwee ezigbo ahụ́ ike.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Nri. Na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, na-aṅụkwa mmiri nke ọma.
-
Na-emega Ahụ́. Mmega ahụ́ ga-eme ka ahụ́ na-adị gị mma n’agbanyeghị afọ ole ị dị. Ọ sọgodị ya ya bụrụ na i nwere nkwarụ ma ọ bụ na ị na-arịa ọrịa, ọ ka ga-abara gị uru. Ndị ezinụlọ gị, ndị enyi gị, ma ọ bụkwanụ ndị na-ahụ banyere ahụ́ ike nwere ike ịgwa gị ka ị na-emega ahụ́. Ma, ọ bụ gịnwa ga-agba mbọ na-eme ya.
-
Na-ehi Ụra Nke Ọma. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ehi ụra nke ọma, o nwere ike ịda ọrịa. Ọtụtụ ndị anaghị ehi ụra nke ọma n’ihi ihe ndị ha kpebiri iji oge ha na-eme. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ana-ehi ụra nke ọma, ọ ga na-enwe ezigbo ahụ́ ike.
ZERE ÀGWÀ NDỊ NA-ADỊGHỊ MMA
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1.
IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na anyị ezere iji ihe ndị dị ka ụtaba ma ọ bụ sịga na-emebi ahụ́ anyị,
anyị ga-enwe ezigbo ahụ́ ike. A ma ihe ndị a ama na ha na-akpata ọrịa na ọnwụ.IHE I NWERE IKE IME: Họrọ ụbọchị ị ga-akwụsị ịṅụ sịga ma dee ya na kalenda gị. Ọ fọ ntakịrị ka ụbọchị ahụ ruo, tụfuo sịga niile i nwere, ihe ndị i ji etinye ha na ihe ndị ọzọ metụtara ya. Zere ịga n’ebe ndị na-aṅụ sịga na-anọ. Gwa ndị enyi gị ị tụkwasịrị obi banyere mkpebi gị.
IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
ZERE IHE GA-EMERỤ GỊ NA NDỊ ỌZỌ AHỤ́.
“Ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ ọhụrụ, rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị, ka i wee ghara ime ka ikpe ọbara ma ụlọ gị n’ihi na mmadụ nwere ike isi na ya dapụ.”—DIUTERỌNỌMI 22:8.
NA-ACHỊKWA IWE GỊ.
“Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ jupụtara ná nghọta, ma onye na-adịghị enwe ndidi na-ebuli nzuzu elu.”—ILU 14:29.
ZERE IRIBIGA NRI ÓKÈ.
“Anọla . . . n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè.”—ILU 23:20.