Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú Jeruselem e kwuru okwu ya n’Aịzaya 60:1 si “bilie,” na-emekwa ka “ìhè nwuo”?
Aịzaya 60:1 sịrị: “Jeruselem, bilie, mee ka ìhè nwuo, n’ihi na i nweela ìhè. Ebube Jehova na-enwu ka ìhè n’ahụ́ gị.” Obodo ahụ bụ́ Jeruselem, ma ọ bụ Zayọn, bụ isi obodo Juda n’oge ahụ. (Aịza. 60:14; 62:1, 2) Ọ na-anọchi anya mba Izrel niile. N’ihi ya, ihe Aịzaya kwuru mere ka e nwee ajụjụ abụọ a ga-aza. Nke mbụ: Olee mgbe Jeruselem ‘biliri’ mee ka ìhè nwuo, oleekwa otú o si mee ya? Nke abụọ: Ihe Aịzaya kwuru ọ̀ na-emezu n’oge anyị a karịa otú o si mezuo n’oge ochie?
Olee mgbe Jeruselem ‘biliri’ nakwa mgbe o mere ka ìhè nwuo, oleekwa otú o si mee ya? Jeruselem na ụlọ nsọ ya bụ ebe e bibiri ebibi mgbe a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn ruo afọ iri asaa. Ma mgbe ndị Midia na ndị Peshia meriri Babịlọn, ndị Izrel bi n’ebe niile Babịlọn na-achị nweziri ike ịlaghachi n’obodo ha, malitekwa ife Jehova otú ọ chọrọ. (Ezra 1:1-4) Malite n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị si n’ebo iri na abụọ nke Izrel ka na-erubere Jehova isi laghachiri n’obodo ha. (Aịza. 60:4) Ha malitere ịchụrụ Jehova àjà, ime ememme ndị a na-emere ya, na ịrụghachi ụlọ nsọ ya. (Ezra 3:1-4, 7-11; 6:16-22) Ebube Jehova malitekwara inwu ka ìhè na Jeruselem, ya bụ, n’ahụ́ ndị Chineke. Ha ghọziiri mba ndị na-amaghị Jehova ìhè.
Ma, ọ ka bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị Aịzaya buru n’amụma mezuru n’oge ahụ. Ọ bụghị ndị Izrel niile rubeere Jehova isi. (Nehe. 13:27; Mal. 1:6-8; 2:13, 14; Mat. 15:7-9) Ha mechadịrị jụ Jizọs Kraịst bụ́ Mezaya. (Mat. 27:1, 2) N’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya nke ugboro abụọ ya.
Jehova buru amụma na ihe a ga-eme. (Dan. 9:24-27) O doro anya na ọ bụghị nzube ya ka ọ bụrụ Jeruselem e nwere n’ụwa ga-emezu ihe niile e buru n’amụma gbasara ife ya otú ọ chọrọ n’Aịzaya isi 60.
Ihe Aịzaya kwuru ọ̀ na-emezu n’oge a karịa ka o mezuru n’oge ochie? Ee. Mana, ọ na-emezu n’isi “Jeruselem nke dị n’elu.” Pọl onyeozi dere gbasara ya, sị: ‘Ọ bụ ya bụ nne anyị.’ (Gal. 4:26) Jeruselem nke dị n’elu bụ nzukọ Jehova nke dị n’eluigwe. Ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi na-erubere ya isi. Ndị so n’ụmụ ya bụ Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ka Pọl. Ọ bụ ha bụ “mba dị nsọ,” ya bụ, “Izrel nke Chineke.”—1 Pita 2:9; Gal. 6:16.
Olee otú Jeruselem nke dị n’elu si “bilie,” ‘na-emekwa ka ìhè nwuo’? Ọ na-eji ụmụ ya bụ́ ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa eme ya. Legodị otú ihe ndị mere ha si yie ihe e buru amụma ya n’Aịzaya isi 60.
Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ‘ibili’ n’ihi na e nwere ike ịsị na ha nọ n’ọchịchịrị mgbe ọtụtụ Ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ malitere ịkụzi ihe na-abụghị eziokwu mgbe ndịozi Kraịst nwụchara. (Mat. 13:37-43) N’oge ahụ, Babịlọn Ukwu, bụ́ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, dọọrọ ha n’agha. Ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ enwereghị onwe ha ruo “ọgwụgwụ oge a” nke malitere n’afọ 1914. (Mat. 13:39, 40) N’oge na-adịghị anya, n’afọ 1919, ha nweere onwe ha bido ịgbasikwu mbọ ike n’ozi ọma Alaeze Chineke nke mere ka ndị mmadụ na-ahụ ìhè. a Kemgbe ahụ, ndị si ná mba niile na-abịa n’ebe ìhè ahụ na-enwu, ma ndị nke fọrọ n’Izrel nke Chineke, ya bụ, “ndị eze” e kwuru okwu ha n’Aịzaya 60:3.—Mkpu. 5:9, 10.
N’ọdịnihu, Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-eme ka ìhè si n’aka Jehova nwukwuo. Olee otú ha ga-esi eme ya? Ọ bụrụ na ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa anwụọ, ha ga-eso na “Jeruselem Ọhụrụ,” ma ọ bụ ndị nwunye Kraịst dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ga-eso Jizọs ghọọ ndị eze na ndị nchụàjà.—Mkpu. 14:1; 21:1, 2, 24; 22:3-5.
Jeruselem Ọhụrụ ga-eme ihe dị ezigbo mkpa ka e nwee ike imezu amụma e buru n’Aịzaya 60:1. (I nwere ike ịtụle Aịzaya 60:1, 3, 5, 11, 19, 20 na Mkpughe 21:2, 9-11, 22-26.) Otú ahụ Jeruselem oge ochie bụ isi obodo ọchịchị ndị Izrel oge ochie, Jeruselem Ọhụrụ na Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke. Olee otú Jeruselem Ọhụrụ si si “n’eluigwe, ebe Chineke nọ” gbadata? Ọ bụ ime ihe ndị ga-abara ndị nọ n’ụwa uru. Ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n’ụwa niile “ga-eji ìhè ya na-eje ije.” Ha agaghịzi na-eme mmehie ma ọ bụkwanụ na-anwụ anwụ. (Mkpu. 21:3, 4, 24) Uru ọ ga-aba bụ ime “ka ihe niile dị ọhụrụ” otú ahụ Aịzaya na ndị amụma ndị ọzọ buru n’amụma. (Ọrụ 3:21) Ime ka ihe niile dị ọhụrụ ahụ malitere mgbe Kraịst ghọrọ Eze. Ọ ga-akụrụkwa ọnụ mgbe Kraịst ga-achịcha otu puku afọ.
a Ezikiel 37:1-14 na Mkpughe 11:7-12 kwukwara gbasara otú e si maliteghachi ife Chineke n’afọ 1919. Ezikiel buru amụma na Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ga-amalitekwa ife Chineke otú ọ chọrọ ma ọ bụrụ na ọtụtụ afọ agafee a dọọrọ ha n’agha. Amụma e buru ná Mkpughe kwuru gbasara ụmụnna ole na ole bụ́ ndị e tere mmanụ na-eduzi ọgbakọ Chineke a tụrụ mkpọrọ ruo oge ụfọdụ, ndị ga-amaliteghachi ịrụwa ọrụ ha. N’afọ 1919, a họpụtara ha ka ha bụrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.—Mat. 24:45; gụọkwa akwụkwọ bụ́ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe, peeji nke 118.