Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka

Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka

“M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—HIB. 13:5.

ABỤ NKE 55 Unu Atụla Ha Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ga-akasi anyị obi ma ọ dị anyị ka ànyị nọ naanị anyị ma ọ bụkwanụ ma nsogbu zuo anyị ahụ́? (Abụ Ọma 118:5-7)

È NWETỤLA mgbe ọ dị gị ka ị̀ nọ naanị gị, ya adịkwa gị ka e nweghị onye ga-enyere gị aka ná nsogbu ndị na-abịara gị? E nweela ọtụtụ ndị ọ dị otú ahụ, ma ndị na-efe Jehova. (1 Eze 19:14) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emetụla gị, cheta nkwa Jehova kwere. Ọ sịrị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” N’ihi ya, anyị nwere ike iji obi ike sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.” (Hib. 13:5, 6) Ọ bụ ụmụnna ndị nọ na Judia ka Pọl onyeozi gwara okwu ndị a n’ihe dị ka n’afọ 61. Ihe a ọ gwara ha na-echetara anyị ihe e kwuru n’Abụ Ọma 118:5-7.—Gụọ ya.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a, n’ihi gịnịkwa?

2 Dị ka ọbụ abụ ahụ, Pọl si n’ihe ndị mere ya mata na Jehova bụ Onye na-enyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị afọ abụọ tupu Pọl edegara ndị Hibru akwụkwọ ozi, Jehova napụtara ya mgbe oké ifufe fere n’oge ọ nọ n’ụgbọ mmiri na-eme njem. (Ọrụ 27:4, 15, 20) Tupu Pọl emee njem ahụ nakwa n’oge ọ na-eme njem ahụ, Jehova si n’ọtụtụ ụzọ nyere ya aka. Anyị ga-atụle atọ n’ime ha. Jehova ji Jizọs na ndị mmụọ ozi, ndị ọchịchị, na ụmụnna ya nyere ya aka. Ịtụle ihe ndị a mere ná ndụ Pọl ga-eme ka anyị tụkwasikwuo Chineke obi na ọ ga-aza anyị mgbe ọ bụla anyị kpọrọ ya ka o nyere anyị aka.

JIZỌS NA NDỊ MMỤỌ OZI NA-ENYERE ANYỊ AKA

3. Olee ihe o nwere ike ịbụ na Pọl nọ na-eche, n’ihi gịnịkwa?

3 Enyemaka dị Pọl mkpa. N’ihe dị ka n’afọ 56, ìgwè mmadụ si n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kpụpụta Pọl onyeozi n’èzí ka ha gbuo ya. N’echi ya, mgbe a kpọpụtara Pọl na Sanhedrin, ọ fọrọ obere ka ndị iro ya dọrie ya. (Ọrụ 21:30-32; 22:30; 23:6-10) N’oge ahụ, ọ ga-abụ na Pọl chere sị, ‘Ruo ole mgbe ka m ga na-edi mmegbu ndị a?’

4. Olee otú Jehova si jiri Jizọs nyere Pọl aka?

4 Olee otú e si nyeere Pọl aka? N’abalị ụbọchi e jidere Pọl, Onyenwe anyị Jizọs guzoro n’akụkụ ya, sị: “Nwee obi ike! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe banyere m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom.” (Ọrụ 23:11) Agbamume a bịara nnọọ n’oge ya. Jizọs jara Pọl mma maka otú o si gbaa àmà na Jeruselem. O kwere Pọl nkwa na ọ ga-eru Rom n’enweghị nsogbu ọ bụla, nakwa na ọ ga-agbakwuru ya àmà n’ebe ahụ. Mgbe Pọl nụchara ihe a Jizọs kwuru, ọ ga-abụ na ọ dị ya otú ahụ ọ na-adị nwatakịrị nna ya ku n’aka ya.

N’oge e nwere oké ifufe na ebili mmiri, otu mmụọ ozi mere ka obi sie Pọl ike na e nweghị onye nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ga-anwụ na njem ahụ dị ize ndụ ha na-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú Jehova si jiri mmụọ ozi nyere Pọl aka? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

5 Olee nsogbu ndị ọzọ bịaara Pọl? Ihe dị ka afọ abụọ ihe ndị ahụ mechara na Jeruselem, Pọl nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Ịtali. Ebili mmiri malitere ime. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ na ndị ọzọ nọ n’ụgbọ mmiri ahụ chere na ha ga-anwụ. Ma ụjọ atụghị Pọl. N’ihi gịnị? Ọ gwara ndị nọ n’ụgbọ ahụ, sị: “N’abalị a, otu mmụọ ozi nke Chineke, bụ́ onye m bụ nke ya na onye m na-ejere ozi dị nsọ, guzoro m nso, sị m, ‘Atụla egwu, Pọl. Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza, lee! Chineke ewerewo amara zọpụta ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a n’ihi gị.’” Jehova mere ka otu mmụọ ozi gwaghachi Pọl ihe ahụ Jizọs gwara ya. N’ikpeazụ, Pọl ruru Rom otú ahụ Jehova gwara ya.—Ọrụ 27:20-25; 28:16.

6. Olee nkwa Jizọs kwere anyị nke na-emesi anyị obi ike, n’ihi gịnịkwa?

6 Olee otú e si enyere anyị aka? Jizọs ga-enyere anyị aka otú ahụ o nyeere Pọl aka. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwere ndị niile ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Ihe a Jizọs kwuru na-agba anyị ume. N’ihi gịnị? N’ihi na e nwere mgbe ụfọdụ nsogbu na-abịara anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ anyị, ọ bụghị naanị ụbọchị ole na ole ka anyị na-eru uju ya. Anyị nwedịrị ike iru uju ọnwụ onye ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị na nká na-alụ. E nwekwara ndị nsogbu nke ha bụ ịda mbà n’obi. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị na-edi ya n’ihi na anyị ma na Jizọs nọnyeere anyị “ụbọchị niile,” ma ụbọchị ndị nke ihe kacha siere anyị ike ná ndụ.—Mat. 11:28-30.

Ndị mmụọ ozi na-akwado anyị ma na-eduzi anyị mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 14:6, olee otú Jehova si enyere anyị aka taa?

7 Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka. (Hib. 1:7, 14) Dị ka ihe atụ, ndị mmụọ ozi na-akwado anyị ma na-eduzi anyị ka anyị na-ekwusara ndị si ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile” “ozi ọma nke a nke alaeze.”—Mat. 24: 13, 14; gụọ Mkpughe 14:6.

NDỊ NỌ N’ỌCHỊCHỊ NA-ENYERE ANYỊ AKA

8. Olee otú Jehova si jiri otu ọchịagha nyere Pọl aka?

8 Olee otú e si nyere Pọl aka? N’afọ 56, Jizọs mesiri Pọl obi ike na ọ ga-eru Rom. Ma ụfọdụ ndị Juu nọ na Jeruselem gbara izu ichechi Pọl n’ụzọ ma gbuo ya. Mgbe ọchịagha Rom aha ya bụ Klọdiọs Laịsias matara banyere atụmatụ a, o nyeere Pọl aka. Klọdiọs mere ngwa ngwa nye ndị agha ya iwu ka ha duru Pọl duga Sesaria. Ha si ụzọ dị otu narị kilomita na ise malite na Jeruselem ruo Sesaria. Mgbe ha rutere Sesaria, Gọvanọ Filiks nyere iwu ka a na-eche Pọl nche “n’ebe obibi ndị ọchịchị dị n’obí Herọd.” Ndị Juu ahụ chọburu igbu Pọl enweghịzi ihe ha ga-emeli ya n’ebe a ọ nọ ugbu a.—Ọrụ 23:12-35.

9. Olee otú Gọvanọ Festọs si nyere Pọl aka?

9 Mgbe afọ abụọ gachara, Pọl ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ na Sesaria. Ọ bụghịzi Gọvanọ Filiks na-achị ugbu a, kama, ọ bụzi Gọvanọ Festọs. Ndị Juu rịọrọ Festọs ka ọ kpọta Pọl Jeruselem ka e kpee ya ikpe. Ma Festọs jụrụ ime otú ahụ. Ọ ga-abụ na ọ ma na ndị Juu na-akpa nkata ichechi Pọl “ka ha wee gbuo ya n’okporo ụzọ.”—Ọrụ 24:27–25:5.

10. Gịnị ka Gọvanọ Festọs mere mgbe Pọl rịọrọ ka Siza kpee ya ikpe?

10 E mechara nọrọ na Sesaria kpee Pọl ikpe. Ebe ọ bụ na Festọs chọrọ “inweta ihu ọma ndị Juu,” ọ jụrụ Pọl, sị: “Ị̀ chọrọ ịga Jeruselem ka a nọrọ ebe ahụ kpee gị ikpe ihe ndị a n’ihu m?” Pọl ma na e nwere ike igbu ya na Jeruselem. Ọ makwa ihe o nwere ike ime iji chebe ndụ ya ka o nwee ike ruo Rom ma jee ozi ya n’ebe ahụ. Pọl sịrị: “Ana m akpọku Siza!” Mgbe Festọs na ndị ndụmọdụ ya gbachara izu, ọ gwara Pọl, sị: “Ọ bụ Siza ka ị kpọkuru; ọ bụ Siza ka ị ga-agakwuru.” Mkpebi a Festọs mere iziga Pọl Rom mere ka ndị iro Pọl ghara ịkpara ya aka. N’oge na-adịghị anya, Pọl ga-erute Rom, ebe ndị Juu ahụ na-achọ igbu ya na-agaghị agali gaa gbuo ya.—Ọrụ 25:6-12.

11. Olee ihe na-agba ume Aịzaya kwuru ọ ga-abụ na Pọl nọ na-atụgharị n’uche?

11 Ka Pọl nọ na-echere ka e jiri ụgbọ mmiri buru ya gawa Ịtali, ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche banyere ịdọ aka ná ntị mmụọ nsọ Jehova mere ka Aịzaya onye amụma dọọ ndị niile na-emegide Jehova. Aịzaya sịrị: “Meenụ atụmatụ, a ga-akụghasị ya! Kwuonụ ihe ọ bụla, ọ gaghịkwa enwe isi, n’ihi na Chineke nọnyeere anyị!” (Aịza. 8:10) Pọl ma na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ ga-abụkwa na ihe a nyeere ya aka idi ọnwụnwa ndị ga-abịara ya n’ọdịnihu.

Jehova nwere ike iji ndị nọ n’ọchịchị chebe ndị ohu ya dị ka o mere n’oge ochie (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú Juliọs si meso Pọl ihe? Oleekwa ihe ọ ga-abụ na Pọl chọpụtara?

12 N’afọ 58, e ji ụgbọ mmiri buru Pọl gawa Ịtali. Ebe ọ bụ na Pọl bụ onye mkpọrọ, a gwara onye agha Rom bụ́ Juliọs ka ọ na-eche ya nche. Si n’oge ahụ gawa, Juliọs nwere ikike ime ka ihe siere Pọl ike ma ọ bụ ime ka ihe dịtụrụ ya mfe. Olee nke ọ ga-eme? N’echi ya, mgbe ha rutere n’ebe mbụ ụgbọ ha ga-akwụsịtụ, Juliọs ji obiọma mesoo Pọl ihe. Ọ hapụkwara ya ka ọ gaa leta ndị enyi ya. Mgbe e mechara, Juliọs zọrọ Pọl ndụ. Olee otú o si mee ya? Ndị agha ndị ọzọ chọrọ igbu ndị mkpọrọ niile nọ n’ụgbọ mmiri ahụ. Ma Juliọs gbochiri ha ime otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ịkpọpụta Pọl n’enweghị ihe mere ya. Ọ ga-abụ na Pọl chọpụtara na Jehova si n’aka onye agha ahụ na-enyere ya aka ma na-echebe ya.—Ọrụ 27:1-3, 42-44.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 13

13. Gịnị ka Jehova nwere ike iji ndị nọ n’ọchịchị mee?

13 Olee otú e si enyere anyị aka? Ọ bụrụ na ọ bụ uche Jehova, o nwere ike iji ike mmụọ nsọ ya mee ka ndị nọ n’ọchịchị mee ihe ọ chọrọ. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova. Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.” (Ilu 21:1) Gịnị ka ilu a pụtara? Ndị mmadụ nwere ike igwu ọwa mmiri iji chee mmiri ihu ebe ha chọrọ. Otú ahụkwa ka Jehova nwere ike iji mmụọ ya gbanwee echiche ndị ọchịchị ka ha nwee ike ime ihe bụ́ nzube ya. Jehova mee ụdị ihe a, ọ na-eme ka ndị ọchịchị mee mkpebi ga-abara ndị ya uru.—Tụlee Ezra 7:21, 25, 26.

14. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 12:5, olee ndị anyị nwere ike ikpe ekpere maka ha?

14 Gịnị ka anyị nwere ike ime? Anyị nwere ike ikpe ekpere “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu” mgbe ha chọrọ ime mkpebi ga-emetụta ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụ ozi anyị. (1 Tim. 2:1, 2; Nehe. 1:11) Anyị na-ekpesi ekpere ike maka ụmụnna anyị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 12:5; Hib. 13:3) Anyị nwekwara ike ikpe ekpere maka ndị na-eche ụmụnna anyị nche n’ụlọ mkpọrọ. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o metụ ndị nche ahụ aka n’obi ka ha mee ka Juliọs ma jiri obiọma mesoo ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ ihe.

ỤMỤNNA ANYỊ NA-ENYERE ANYỊ AKA

15-16. Olee otú Jehova si jiri Arịstakọs na Luk nyere Pọl aka?

15 Olee otú e si nyere Pọl aka? Mgbe Pọl nọ n’ụzọ na-aga Rom, Jehova si n’aka ụmụnna ya nyere ya aka ọtụtụ ugboro. Ka anyị lee oge ụfọdụ ha nyeere ya aka.

16 Ezigbo ndị enyi Pọl abụọ aha ha bụ Arịstakọs na Luk kpebiri iso Pọl gaa Rom. * Ha ji obi ha niile tinye ndụ ha n’ihe ize ndụ ka ha na Pọl nọrọ n’agbanyeghị na Jizọs ekweghị hanwa nkwa na ha ga-adị ndụ ruo Rom. Ọ bụ mgbe ha nọ n’ụgbọ mmiri na-eme njem ahụ gaara ata isi ha ka ha matara na ha agaghị anwụ. N’ihi ya, mgbe Arịstakọs na Luk banyere ụgbọ mmiri na Sesaria, ọ ga-abụrịrị na Pọl si n’ala ala obi ya kpee ekpere, kelee Jehova maka otú o si jiri ụmụnna ya abụọ a nwere obi ike nyere ya aka.—Ọrụ 27:1, 2, 20-25.

17. Olee otú Jehova si jiri ụmụnna Pọl nyere ya aka?

17 Ka Pọl nọ n’ụzọ na-aga Rom, ụmụnna ya nyeere ya aka ọtụtụ ugboro. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ kwụsịtụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Saịdọn, Juliọs hapụrụ ya ka ọ gakwuru ndị enyi ya ka ha wee lekọta ya. Mgbe Pọl rutekwara obodo Putiolaị, ya na ndị ya na ha so hụrụ ụmụnna n’ebe ahụ. Ụmụnna ndị ahụ rịọsikwara ha arịrịọ ike ka ha na ha nọrọ ruo ụbọchị asaa. Ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ahụ lekọtara Pọl na ndị ya na ha so. Ọ ga-abụkwa na Pọl kọọrọ ha ihe ndị gbara ha ume, obi atọọkwa ha ụtọ. (Tụlee Ọrụ Ndịozi 15:2, 3.) Mgbe Pọl na ụmụnna ndị ahụ nọchara, ya na ndị ya na ha so gawakwara Rom ha nọ na-aga.—Ọrụ Ndịozi 27:3; 28:13, 14.

Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka dị ka o meere Pọl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị mere Pọl ji kelee Chineke ma nwee obi ike?

18 Ka Pọl nọ na-aga Rom, ọ ga-abụ na o chetara akwụkwọ ozi o degaara ụmụnna ya nọ n’obodo ahụ afọ atọ gara aga. Ọ gwara ha, sị: ‘Ọ gụsiwo m agụụ ike ruo afọ ụfọdụ irute n’ebe unu nọ.’ (Rom 15:23) Ma, o nweghị mgbe ọ tụrụ anya na ọ ga-abịakwute ha dị ka onye mkpọrọ. Ma, o nwere ezigbo obi ụtọ mgbe ọ hụrụ ka ụmụnna ndị Rom nọ n’okporo ụzọ na-eche ya ka ọ bịarute. “Ozugbo Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma nwee obi ike.” (Ọrụ 28:15) Ị̀ hụrụ na Pọl kelere Chineke n’ihi na ọ hụrụ ụmụnna ya? N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Pọl chọpụtara na Jehova ji ụmụnna ya na-enyere ya aka.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 19

19. Dị ka e kwuru na 1 Pita 4:10, olee otú Jehova nwere ike isi jiri anyị nyere ndị nọ ná mkpa aka?

19 Gịnị ka anyị nwere ike ime? N’ọgbakọ unu, è nwere ụmụnna na-ata ahụhụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ? O nwekwara ike ịbụ na e nwere onye nwụnahụrụ ha. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere nwanna anyị chọrọ enyemaka, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ikwu ma ọ bụ ime ihe ga-agba ya ume. Ihe anyị kwuru ma ọ bụ mee nwere ike ịgba nwanna anyị ahụ ezigbo ume. (Gụọ 1 Pita 4:10.) * Anyị nyere ha aka, o nwere ike ime ka obi siekwa ha ike ọzọ ná nkwa ahụ Jehova kwere, nke bụ́: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Ihe a ọ́ gaghị eme ka obi tọọ gị ụtọ?

20. Gịnị mere anyị nwere ike iji jiri obi ike kwuo, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka”?

20 E nwere nsogbu ndị yiri oké ifufe ndị na-abịara anyị ná ndụ taa dị ka ha bịaara Pọl na ndị ya na ha so na-eme njem. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike n’ihi na anyị ma na Jehova nọnyeere anyị. Ọ na-eji Jizọs na ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka. Ọ bụrụkwa na ọ bụ uche ya, ọ na-eji ndị nọ n’ọchịchị enyere anyị aka. Ọtụtụ n’ime anyị achọpụtakwala na Jehova na-eji mmụọ nsọ ya emetụ ụmụnna anyị aka n’obi, ha agbatara ụmụnna ibe ha ọsọ enyemaka. N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo ka Pọl, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.”—Hib. 13:6.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ atọ Jehova si nyere Pọl onyeozi aka imeri nsogbu ndị bịaara ya. Ịtụle otú Jehova si nyere ndị ya aka n’oge ochie ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka taa ná nsogbu ndị na-abịara anyị ná ndụ.

^ par. 16 O nweela mgbe Arịstakọs na Luk so Pọl mee njem n’oge gara aga. Ụmụnna a a tụkwasịrị obi nọnyekwaara Pọl n’oge a tụrụ ya mkpọrọ na Rom.—Ọrụ 16:10-12; 20:4; Kọl. 4:10, 14.