Ihe Ị Ga-eme ma Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-ele Ndị Gba Ọtọ
-
“Ọ dị m ka onye di ya kwara iko ugboro ugboro.”
-
“Ọ dị m ka onye a kparịrị akparị, onye na-enweghị uru ọ bara, onye na-amaghị mma.”
-
“O nweghị onye m ga-agwali gbasara ya. M tara ahụhụ n’enweghị onye kasiri m obi.”
-
“Ọ dị m ka Jehova anaghị eche gbasara m.”
Ihe ndị a e kwuru n’elu ebe a na-egosi otú obi na-adị nwaanyị ma di ya na-ele ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na ọ na-ele ya kemgbe na nzuzo ruo ihe dị ka ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ, nwunye ya nwere ike iche na ya agaghịzi atụkwasịli ya obi. Otu nwaanyị sịrị, “M chere, sị: ‘Ọ dị m ka amaghịzi m onye di m a bụ. Ònye ma ihe ndị ọzọ ọ na-ezochiri m?’”
A kwadebere isiokwu a maka nwaanyị di ya na-ele ndị gba ọtọ. a N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike ịkasi ya obi, mee ka obi sie ya ike na Jehova ga-akwado ya, nyekwara ya aka ka obi ruo ya ala, ya na Jehova aka dịkwa ná mma. b
GỊNỊ KA ONYE NKE AKA YA DỊ ỌCHA NWERE IKE IME?
Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị gị ga-ekpebiri di gị ihe niile ọ ga-eme, ma, e nwere ihe ndị ị ga-eme ka ọ ghara ịna-ewute gị nnukwu, obi erutụkwuo gị ala. Legodị ụfọdụ n’ime ha.
Atala onwe gị ụta. Nwaanyị nwere ike ịna-eche na ihe mere di ya ji ele ndị gba ọtọ bụ na o nwere ihe yanwa mejọrọ. Alice chere na ọ ga-abụrịrị na ya amaghị mma nke mere na ihe ya anaghị amasị di ya. O chere, sị: ‘Gịnị mere o ji aka di m mma ịna-ele ụmụ nwaanyị ọzọ anya kama ịna-ele mụnwa?’ Ụfọdụ ndị nwunye na-ata onwe ha ụta maka otú obi dị ha ma ọ bụ ihe ha mere. Ha na-eche na ọ na-eme ka ihe ka njọ. Danielle c sịrị: “M bịara lewe onwe m anya ka ajọ nwaanyị, onye iwe ọkụ ya na-eme ka ya na di ya ghara ịdị ná mma.”
Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ọ dị ụmụ nwaanyị ndị a, mata na Jehova anaghị ata gị ụta maka ihe di gị mere. Jems 1:14 sịrị: “Ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.” (Rom 14:12; Fil. 2:12) Kama ịna-ata gị ụta, Jehova ji gị kpọrọ ihe n’ihi na ị na-erubere ya isi.—2 Ihe 16:9.
Nwaanyị nwere ike ịna-eche na ihe mere di ya ji ele ndị gba ọtọ bụ na ya amaghị mma. Ma, ọ bụghị eziokwu. Ndị ọkachamara n’ihe gbasara ile ndị gba ọtọ kwuru na ile ndị gba ọtọ na-eme ka agụụ mmekọahụ na-agbazi mmadụ ara nke na o nweghị nwaanyị ọ bụla ga-egboli ya agụụ ahụ.
Echegbuzila onwe gị. Catherine sịrị na naanị ihe ọ na-eche gbasara ya bụ ihe ahụ di ya na-ele. Frances sịrị: “M na-echegbuwe onwe m mgbe ọ bụla m na-amaghị ebe di m nọ. Ọ na-eme ka obi ghara iru m ala n’ụbọchị ahụ niile.” Ụfọdụ ụmụ nwaanyị ekwuokwala otú ihere si eme ha ma ha na ụmụnna ndị ọzọ ma gbasara nsogbu di ha nwere nọrọ. Ụfọdụ kwukwara na ọ na-adị ha ka ọ̀ bụ naanị ha nọ n’ihi na ha chere na e nweghị onye na-aghọta otú ihe si dịrị ha.
Iche otú ahụ adịghị njọ. Ma, ịnọ na-eche gbasara ya mgbe niile ga-eme ka ị na-echegbukwu onwe gị. Kama ime otú ahụ, gbalịa na-eche banyere adịm ná mma gị na Jehova. Ime otú ahụ ga-eme ka i nwee ike idi nsogbu ahụ.—Ọma 62:2; Efe. 6:10.
O nwere ike ịbara gị uru ma ị gụọ ma tụgharịa uche n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ nwaanyị nọ na-echegbu onwe ha, ha ekpee ekpere ka Jehova nyere ha aka, ya akasie ha obi. Ọ bụghị mgbe niile ka Jehova mere ka nsogbu ha kwụsị. Ma, o mere ka obi ruo ha ala. Dị ka ihe atụ, “obi jọrọ Hana ezigbo njọ” maka otú ihe si dịrị ya. Ma, mgbe “ọ rịọtere Jehova arịrịọ aka,” obi ruru ya ala, ọ bụ eziokwu na ọ mabeghị ma nsogbu ya ahụ ọ̀ ga-akwụsị n’ọdịnihu.—1 Sam. 1:10, 12, 18; 2 Kọr. 1:3, 4.
Gakwuru ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere gị aka. Ha nwere ike ịdị ka “ebe mmadụ na-agbaba ka o zere ifufe nakwa ebe mmadụ na-agbaba ka o zere nnukwu mmiri ozuzo.” (Aịza. 32:2) Ha nwedịrị ike ịgwa gị nwanna nwaanyị i nwere ike ịgakwuru kọọrọ ya nsogbu gị, ya akasiekwa gị obi.—Ilu 17:17.
Ị̀ GA-ENYELIRI YA AKA?
Ị̀ ga-enyeliri di gị aka ka ọ kwụsị ile ndị gba ọtọ? I nwere ike inyere ya aka. Baịbụl kwuru na “abụọ dị mma karịa otu” ma e nwee nsogbu ma ọ bụ onye iro a chọrọ imeri. (Ekli. 4:9-12) Ndị ọkachamara chọpụtara na ọ bụrụ na di na nwunye ana-agbakọ aka ọnụ ka di ahụ kwụsị ile ndị gba ọtọ, ọ ga-akwụsịli ya, ọ ga-emekwa ka nwunye ya tụkwasịwakwa ya obi.
N’eziokwu, di gị kpebisie ike na ọ ga-akwụsị ile ndị gba ọtọ, na-agbasikwa mbọ ike ịkwụsị ya, ọ ga-akwụsịli ya. Ò kpeela ekpere rịọ Jehova ka o nye ya ike ịkwụsị ya, gakwurukwa ndị okenye ka ha nyere ya aka? (2 Kọr. 4:7; Jems 5:14, 15) Ò kpebiela ihe ndị ọ ga-eme iji zere ọnwụnwa? Dị ka ihe atụ, ò kpebiela ihe ndị ọ ga-eji ekwentị ma ọ bụ kọmputa na-eme na ihe ndị ọ na-agaghị eji ya na-eme, kpebiekwa izere ihe ndị nwere ike itinye ya n’ọnwụnwa? (Ilu 27:12) Ọ̀ na-ekwe ka i nyere ya aka, na-agwakwa gị eziokwu niile? Ọ bụrụ na ọ na-eme ihe ndị a, ị ga-enyeliri ya aka.
Olee otú i nwere ike isi nyere ya aka? Legodị ihe atụ a. E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Felicia. Ile ndị gba ọtọ riri di ya bụ́ Ethan ahụ́ kemgbe ọ bụ nwata. Felicia mere ka ọ dịrị di ya mfe ịgwa ya mgbe ọ bụla ọ gụrụ ya agụụ ile ndị gba ọtọ. Ethan sịrị: “M na-agwa nwunye m eziokwu n’ezoghị ọnụ. Ọ na-ewetu obi enyere m aka ka anyị kpebie ihe ndị m na-agaghị eme. Ọ na-ajụkwa m otú m si eme mgbe niile. Ọ na-enyekwara m aka ka m ghara ịna-aga n’Ịntanet mgbe niile.” O doro anya na ndị gba ọtọ ahụ Ethan na-ele na-ewute Felicia. Felicia sịrị: “Ma, iwe ọ na-ewe m na otú o si agbawa m obi enyereghị ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ. Mgbe anyị lebachara nsogbu ya anya, ọ dị njikere inyere m aka ka m kwụsị iwe m na-ewe.”
Ụdị mkparịta ụka a ga-enyere nwoke aka ka ọ kwụsị ile ndị gba ọtọ, meekwa ka nwunye ya tụkwasịwakwa ya obi. Ọ bụrụ na di adị njikere ịgwa nwunye ya ihe ndị na-agụ ya agụụ, ebe ọ na-aga, nakwa ihe ọ na-eme, ọ ga-adịrị nwunye ya mfe ịtụkwasị ya obi n’ihi na o nweghị ihe ọ na-ezoro ya.
Ì kwetara na ị ga-enyeliri di gị aka otú ahụ? Ọ bụrụ na i kwetara, gị na ya gbalịa gụkọọ isiokwu a ọnụ ma kwurịta ya. Ihe ọ ga-ebu n’obi na-agụ ya bụ na ọ chọrọ ịkwụsị ile ndị gba ọtọ. Ọ chọkwara ka o mee ihe ndị ga-eme ka ị tụkwasịwakwa ya obi. Kama ịna-ewe iwe na ị chọrọ ka gị na ya kwurịta nsogbu ahụ, o kwesịrị ịgbalị ghọta otú obi dị gị gbasara nsogbu ahụ. Mkpa gị ga-abụ inyere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ nakwa ịhapụ ya ka o mewe ihe ga-eme ka ị tụkwasịwakwa ya obi. Unu abụọ kwesịrị ịmata ihe na-eme ka mmadụ chọwa ile ndị gba ọtọ nakwa otú onye ahụ nwere ike isi kwụsị ya. d
Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na gị na di gị ga-ebido sewe okwu ma ọ bụrụ na unu ekwurịtawa ihe a, lee Ekli. 7:8; 1 Kọr. 13:4.
ma ị̀ ga-agwa otu okenye unu abụọ tụkwasịrị obi ka ọ nọrọ ya mgbe unu ga-ekwurịta ya. Burukwa n’obi na ọ bụrụgodị na gị na di gị ana-agba mbọ ka ọ kwụsị ile ndị gba ọtọ, o nwere ike iwetụ oge tupu gị atụkwasịwakwa ya obi. Ike agwụla gị. Gbalịa na-achọpụta obere ihe ndị ọ na-eme iji gosi na ọ na-agba mbọ ịgbanwe. Nwee olileanya na ka oge na-aga, ọ bụrụ na unu abụọ ana-enwere ibe unu ndidi, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-adịkwa ná mma.—Ọ BỤRỤKWANỤ NA Ọ KWỤSỊGHỊ YA?
Ọ bụrụ na di gị elee ndị gba ọtọ ọzọ mgbe ọ kwụsịtụrụla ile ya, ọ̀ pụtara na o nweghị nchegharị ma ọ bụ na ọ gaghị akwụsịli ya? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. O nwere ike ịna-agbasi mbọ ike ná ndụ ya niile ka ọ ghara ile ya, karịchaa ma ọ bụrụ na o riela ya ahụ́. O nwedịrị ike ile ya ọzọ mgbe ọtụtụ afọ gara ọ na-elebeghị ya. Ihe ga-enyere ya aka ka ọ ghara ile ya ọzọ bụ ịkpacharakwu anya. O nwere ike ịna-agbakwu mbọ na-eme ihe ndị ahụ ga-eme ka ọ ghara ile ya ọzọ ọ bụrụgodị na o yie ka ọ̀ kwụsịla ya. (Ilu 28:14; Mat. 5:29; 1 Kọr. 10:12) O kwesịrị ịgba mbọ na-eme ‘ka otú o si eche echiche dị ọhụrụ,’ na-agbalịkwa ịmụta ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’ Ihe ndị so n’ihe ọjọọ ahụ bụ ile ndị gba ọtọ nakwa àgwà ndị ọzọ na-adịghị ọcha, dị ka mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ. (Efe. 4:23; Ọma 97:10; Rom 12:9) Ọ̀ dị njikere ime ihe ndị a niile? Ọ bụrụ na ọ dị, ọ ga-emecha kwụsị àgwà ahụ kpamkpam. e
Ma, ọ bụrụkwanụ na di gị achọtụdịghị ịgba mbọ ka ọ kwụsị nsogbu ahụ? O doro anya na iwe nwere ike ịna-ewe gị, ya adịkwa gị ka ọ̀ gharịpụla gị. Hapụrụ Jehova okwu ahụ. Ọ ga-eme ka obi ruo gị ala. (1 Pita 5:7) Na-agbalịsi ike ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ ihe, ịna-ekpe ekpere, na ịna-echebara ihe ndị ị mụtara echiche. Ka ị na-eme otú ahụ, obi sie gị ike na ọ na-abịarukwa gịnwa nso. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 57:15, ‘ya na ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi nọ.’ Ọ na-eme ka ha nwewekwa ọṅụ. Na-agbasi mbọ ike ịbụ ezigbo Onye Kraịst. Na-agakwuru ndị okenye ka ha na-enyere gị aka. Nweekwa olileanya na n’ọdịnihu, di gị nwere ike ịgbanwe obi ya.—Rom 2:4; 2 Pita 3:9.
a N’isiokwu a, anyị ga-ekwu na ọ bụ di na-ele ndị gba ọtọ. Ma, ọtụtụ ihe e kwuru na ya ga-enyekwara di aka ma ọ bụrụ na nwunye ya na-ele ndị gba ọtọ.
b Akwụkwọ Nsọ ekwughị na mmadụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm n’ihi na o lere ndị gba ọtọ.—Mat. 19:9.
c Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
d Ihe ndị nwere ike inye aka dị na jw.org nakwa n’akwụkwọ anyị. Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ile Ndị Gba Ọtọ Nwere Ike Ime Ka Di na Nwunye Tisaa,” nke gbara na jw.org; “I Nwere Ike Imeri Ọnwụnwa,” nke dị n’Ụlọ Nche Eprel 1, 2014, peeji nke 10 ruo na nke 12; nakwa “Mmadụ Ikiri Ndị Gba Ọtọ Ò Nwere Ihe O Mere?” nke dị n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2013, peeji nke 3 ruo na nke 7.
e Ebe ọ bụ na ile ndị gba ọtọ nwere ike iri mmadụ ezigbo ahụ́, ụfọdụ di na nwunye ekpebiela ịgakwuru dọkịta ga-enyere onye ahụ aka ịkwụsị àgwà ahụ ma ndị okenye nyechaara ya aka.