ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jun 2019
Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite Ọgọst 5 ruo Septemba 1, 2019
‘Nọrọnụ na Nche Ka A Ghara Inwe Onye Ga-eburu Unu Dị Ka Anụ Oriri Ya’
Setan bụ aka ochie n’iduhie ndị mmadụ. Olee otú o si agbalị ime ka anyị hapụ Jehova?
Na-akụghasị Echiche Na-ezighị Ezi nke Na-emegide Ihe Ọmụma Chineke
Ihe mere anyị n’oge gara, ebe a zụlitere anyị na otú anyị gụruru akwụkwọ na-emetụta otú anyị si eche echiche. Olee otú anyị ga-esi akwụsị àgwà ọjọọ ndị “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi anyị?
Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-echegbu Onwe Gị
Ichegbu onwe anyị ruo ogologo oge nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ma anyị tụlee otú Jehova si nyere ndị ohu ya n’oge ochie aka ịkwụsị ichegbu onwe ha.
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Kwụsị Ịna-echegbu Onwe Ha
Lọt, Job na Neomi ji obi ha niile fee Jehova, ma o nwekwara mgbe nsogbu ndị siri ike bịaara ha. Olee ihe nwere ike ịmụta n’ihe ndị mere ha?
Otú Anyị Ga-esi Zere Otu Ọnyà Setan
Setan ejirila ile ndị gba ọtọ mata ọtụtụ ndị na-efe Chineke n’ọnyà. Olee otú anyị ga-esi ezere àgwà ọjọọ a?
A Hụla Ihe E Dere n’Otu Akwụkwọ Mpịakọta Ochie
N’afọ 1970, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwupụtara otu akwụkwọ mpịakọta gbara ọkụ n’En-gidaị dị n’Izrel. Ma, ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ e ji ahụ ihe e dere ede mere ka e nwee ike ịhụ ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. Gịnị ka ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ahụ mere ka a chọpụta?